Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
2 "Tell the Israelites: when a woman conceives and bears a son, she is unclean seven days—unclean as during her monthly period. “Nye ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha, ‘Mgbe nwanyị tụụrụ ime mesịa mụọ nwa nwoke, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa, dịka o si adị mgbe ọ nọ nʼadịghị ọcha nke nsọ ya nʼoge a kara aka.
3 And on the eighth day the flesh of his foreskin will be circumcised. Nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ya, a ga-ebi nwa nwoke ahụ ugwu.
4 For thirty-three days she remains in the blood of her purification. She must not touch anything holy or enter the sanctuary until her days of purification are complete. Nʼime iri abalị atọ na atọ site nʼụbọchị nwanyị ahụ mụsịrị nwa ahụ, ọ ga-anọkwa na-adịghị ọcha nke ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe dị nsọ aka, maọbụ banye nʼime ebe nsọ, ruo mgbe ụbọchị ime ya ka ọ dị ọcha gasịrị.
5 If she bears a daughter, she is unclean two weeks, as during her period, then continues sixty-six days in the blood of her purification. Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ọ ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe ọ nọ na nsọ ya. Ọ ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka ọ dị ọcha.
6 "When her days of purification for a son or daughter are complete, she must bring the priest at the tent of meeting's entrance a year-old lamb as a burnt offering, and a young pigeon or turtledove as a sin offering. “ ‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie.
7 He will offer it before our Father and atone for her; she'll be clean from her blood flow. This is the law for the woman who gives birth, to a son or daughter. Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya. “ ‘Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị.
8 "If she can't afford a lamb, she may take two turtledoves or two young pigeons—one for a burnt offering, one for a sin offering. The priest will atone for her, and she will be clean." Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]