Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses and Aaron, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
2 "When someone has a swelling, rash, or bright spot on their skin that turns into a skin disease, he must be brought to Aaron the priest or one of his priest sons. “Mgbe mmadụ hụrụ etuto, maọbụ ọnya, maọbụ ntụpọ na-eko eko nʼakpụkpọ anụ ahụ ya nke dị ka ihe ọrịa ekpenta na-eweta, a ga-eduru onye ahụ bịa nʼihu Erọn onye nchụaja maọbụ ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị nchụaja.
3 The priest examines the mark on the skin. If the hair in it has turned white and it looks deeper than the skin, it is a contaminating skin disease; the priest examines him and declares him unclean. Onye nchụaja ga-eleru ọrịa ahụ dị ya nʼahụ anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ ebidola ịcha ọcha, ọ bụrụkwa na ebe ahụ mibara ime, ọ bụ ọrịa ekpenta. Mgbe onye nchụaja leruchara ya anya, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ bụ onye rụrụ arụ.
4 But if the bright spot on his skin is white, not deeper than the skin, and its hair hasn't turned white, the priest must isolate the person seven days. Ọ bụrụkwanụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ dị ọcha, ma na ebe ahụ emighị emi karịa akụkụ ahụ ya ndị ọzọ, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ebe ọ ga-anọ naanị ya abalị asaa.
5 On the seventh day the priest examines him; if the mark hasn't changed or spread on the skin, he isolates him seven more days. Mgbe ụbọchị asaa gasịrị, onye nchụaja ga-ele ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọnya ahụ alabeghị, na ọ nwekwaghị mgbanwe ọbụla, a ga-edebekwa ya abalị asaa ọzọ.
6 On the seventh day the priest examines him again. If the sore faded and didn't spread on the skin, he declares him clean—just a rash. He washes his clothes and is clean. Mgbe abalị asaa nke a gafekwara, onye nchụaja ga-elekwa ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dịtụla ya mma, na ọnya ahụ agbasaghị nʼanụ ahụ ya, onye nchụaja ga-asị na ọ dị ọcha, nʼihi na ọ bụ naanị ọnya efu. Onye ahụ ga-asakwa uwe ya mmiri, mgbe ahụ dị ọcha.
7 But if the rash spreads on his skin after showing himself to the priest for cleansing, he must show himself to the priest again. Ma ọ bụrụ na ọnya ahụ agbasaa nʼahụ ya mgbe o gosicharala onye nchụaja onwe ya maka nsacha ịdị ọcha, ọ ga-alaghachikwa azụ ga hụ onye nchụaja ahụ ọzọ.
8 The priest examines him: if the rash has spread on the skin, he declares him unclean—it is a skin disease. Onye nchụaja ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ na-agbasa, ọ ga-agụ onye ahụ dịka onye rụrụ arụ, ọ bụ ọrịa na-efe efe.
9 "When a defiling skin disease appears on someone, he is to be brought to the priest. “Mgbe ọbụla mmadụ nwere ihe dị ka ọrịa na-efe efe nʼahụ ya, a ghaghị ịkpọtara ya onye nchụaja.
10 The priest examines him: if a white swelling on the skin has turned the hair white, with raw flesh in it. Onye nchụaja ga-ele anya nʼakụkụ anụ ahụ ya zara aza ịchọpụta ma ọ dị ọcha, ma ajị dị gburugburu ebe ahụ ọ na-acha ọcha, na ịhụkwa ma ọ nwere ọnya dị gburugburu ebe ahụ.
11 It is a chronic skin disease; the priest will pronounce him unclean. He must not isolate him, since he is unclean. Ọ bụrụ na onye nchụaja ahụ ihe ndị a, ọ bụ ọrịa ekpenta nʼezie. Ọ ga-agụkwa onye ahụ dịka onye rụrụ arụ. A gaghị edebekwa ya ile ya ahụ, nʼihi na ọ bụrụlarị onye rụrụ arụ.
12 "But if the disease breaks out and covers all his skin, head to foot, wherever the priest looks, “Ọ bụrụ na onye nchụaja elee onye ahụ anya hụ na ọrịa ọcha ahụ enupụtala nʼakụkụ ahụ ya niile, site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya,
13 the priest examines him; if the disease covers his whole body, he pronounces him clean—since it's all turned white, he is clean. onye nchụaja a ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na ọrịa ahụ enupụtala nʼahụ ya niile, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ dị ọcha, ebe ọ bụ na ọrịa ahụ enupụtala mee ka anụ ahụ ya chawa ọcha.
14 But on the day raw flesh appears on him, he is to be unclean. Ma ọ bụrụ na e nwere akụkụ ahụ ya ọnya ọ hụrụ pụtara, ọ ga-agụ ya dịka onye na-adịghị ọcha.
15 The priest sees the raw flesh and pronounces him unclean; the raw flesh is unclean—a skin disease. Onye nchụaja ga-enyocha ọnya ahụ. Kwupụta na onye ahụ rụrụ arụ. Ọnya ahụ rụrụ arụ nʼihi na ọrịa ekpenta ka ọ bụ.
16 But if the raw flesh changes and turns white, he is to come to the priest. Ọ bụrụ nʼọnya ahụ agbanwe na-acha ọcha, ha ga-agakwuru onye nchụaja.
17 The priest examines him; if the mark has turned white, he declares him clean—he is clean. Onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ọnya niile ahụ na-acha ezi ọcha, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye na-enweghị ntụpọ. Ndị dị ọcha ka ha ga-abụ.
18 "When someone has a boil on their skin and it heals, “Ọ bụrụ na etuto toro mmadụ nʼahụ alaa,
19 if a white swelling or reddish-white bright spot forms on the boil, show it to the priest. ma akpụkpọ anụ ahụ ya anọgide na-acha ọcha, maọbụ na-acha ọbara ọbara, a ga-ejekwuru onye nchụaja ka o lee ya anya nʼahụ.
20 The priest examines it; if it looks lower than the skin and the hair has turned white, he pronounces him unclean—a skin disease has broken out in the boil. Ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na e nwere ọrịa dị nʼokpuru akpụkpọ ahụ ya, chọpụtakwa na ajị ya na-acha ọcha, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye rụrụ arụ, nʼihi na ekpenta esitela nʼetuto ahụ pụta.
21 But if the priest sees no white hair in it, it is not below the skin, and has faded, he is to isolate him seven days. Ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ajị ọcha adịghị nʼakpụkpọ ahụ ya, chọpụtakwa na ọnya ahụ abanyeghị nʼime, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.
22 If it spreads further on the skin, the priest declares him unclean; it is diseased. Nʼime ụbọchị asaa ahụ, ọ bụrụ na ọnya ahụ abaa ụba karịa ka ọ dị na mbụ, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ ka ọ bụ.
23 But if the bright spot stays put, hasn't spread, it's the scar of the boil, and the priest must pronounce him clean. Ma ọ bụrụ na ọ baghị ụba karịa, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha, nʼihi na ihe a bụ etuto lara ala.
24 "Or when skin has a fire burn, and the burn's raw flesh becomes a reddish-white or white bright spot, “Ọ bụrụ na ọkụ agbaa mmadụ, mee ka ọnya pụta ya nʼahụ: ọ bụrụ na ọnya ahụ ebido na-acha ọbara ọbara, maọbụ na-acha ezigbo ọcha,
25 the priest examines it: if hair in the bright spot turned white and it looks deeper than the skin, it is a skin disease broken out in the burn—he declares him unclean; it is a skin disease. onye nchụaja ga-elezi onye dị otu a anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ọnya ahụ dị na-acha ọcha, maọbụ na ọnya ahụ mibara ime karịa, ọ ghọọla ekpenta nke si nʼọnya ahụ nupụta. Onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa ekpenta.
26 If the priest examines it and finds no white hair in the bright spot, and it's no deeper than the skin but faded, he is to isolate him seven days. Ma ọ bụrụ na onye nchụaja elee ya hụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ adịghị ọcha, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ala karịa akpụkpọ ahụ, na ọ na-aṅacha, mgbe ahụ onye nchụaja ga-edebe onye ahụ iche ụbọchị asaa.
27 On day seven the priest examines him. If it spread on the skin, the priest pronounces him unclean—a defiling skin disease. Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi onye ahụ anya nke ọma. Ọ bụrụ na ọ chọpụtara na ọnya ahụ na-abasaa nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja ga-agụ onye ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọrịa na-emerụ emerụ ka ọ bụ.
28 But if the bright spot stays in place, hasn't spread on the skin, and has faded, it's the burn's swelling; the priest is to declare him clean—it is only the burn's scar. Ma ọ bụrụ na ọ gbanweghị, bụrụkwa na ọ basaghị nʼakpụkpọ ahụ ma ọ na-aṅacha, ọ bụ ihe ọzịza sitere nʼọkụ rere onye ahụ, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye dị ọcha, nʼihi na ọ bụ apa ọnya lara ala.
29 "When a man or a woman has a mark on the head or in the beard, “Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla enwee ọnya nʼisi, maọbụ na nti ya,
30 the priest examines the mark; if deeper than the skin, with thin yellow hair, he pronounces them unclean—an itch, a skin disease of the head or beard. onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ dị ala karịa akpụkpọ ahụ ya, ọ bụrụkwa na ajị dị na ya na-acha odo odo dị irighiri, onye nchụaja ga-agụ ha dịka ndị na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ nke dị nʼisi maọbụ nʼagba.
31 But if the priest examines the itch mark and it looks no deeper than the skin and has no black hair in it, the priest is to isolate the person for seven days. Ma ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, maọbụ na ajị dị nʼebe ahụ adịghị eji ojii, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.
32 On the seventh day the priest examines the mark: if the itch hasn't spread, has no yellow hair, and looks no deeper than the skin. Nʼụbọchị nke asaa onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ abasaghị karịa, ọ bụrụ na o nweghị ajị na-acha edo edo, ọ bụrụkwa na o mibaghị emiba,
33 The man is to shave, but not the sore area; the priest isolates him another seven days. ọ ga-akpụchapụ ajị niile dị nʼakụkụ ebe ahụ ọnya mere ya, ma ọ gaghị akpụchapụ ajị dị nʼọnya ahụ nʼonwe ya. Onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.
34 On the seventh day the priest examines the itch. If it hasn't spread on the skin and looks no deeper than the skin, the priest declares him clean. He washes his clothes and is clean. Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ basaghị karịa, maọbụ mibanye nʼime karịa anụ ahụ, a ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha. Ọ ga-apụ sachaa uwe ya, bụrụ onye dị ọcha.
35 But if the itch spreads further on the skin after his cleansing, Ma ọ bụrụ na mgbe a gụchara ya nʼonye dị ọcha ọnya ahụ emesịa basaa nʼahụ ya.
36 the priest examines him; if the itch spread on the skin, the priest need not look for yellow hair—the man is unclean. Onye nchụaja ga-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ agbasaala nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja a gaghị achọwa ajị na-acha edo edo. Onye ahụ rụrụ arụ.
37 But if the priest sees it unchanged, with black hair grown in it, it's healed; he's clean—the priest pronounces him clean. Ma ọ bụrụ nʼuche onye nchụaja na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, ọ bụrụkwa na ajị ojii epupụtala nʼebe ahụ, ọnya ahụ alaala. Onye dị ọcha ka mmadụ ahụ bụ. Onye nchụaja ga-ekwupụta na ọ dị ọcha.
38 "When a man or a woman has white bright spots on their skin, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nwere ntụpọ ọcha nʼanụ ahụ ya,
39 the priest examines them; if the bright spots on their skin are dull white, it is a harmless rash that has broken out on the skin; he is clean. onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ adịghị achazi ezi ọcha, ọ bụ ọkọ nupụtara onye ahụ nʼahụ. Onye ahụ dị ọcha.
40 "When a man loses the hair on his head, he is bald, but he is clean. “Mgbe ajị na-adịghịkwa nwoke nʼisi, ọ bụ isi nkwọcha, onye ahụ dị ọcha.
41 If hair falls from the front of his head, his forehead is bald, but he is clean. Otu aka ahụ, ọ bụrụ na isi ya esite nʼegedege ihu ya kwọchasịa, ọ bụghị ekpenta, onye dị ọcha ka ọ bụ.
42 But if a reddish-white sore is on his bald head or forehead, it is a skin disease breaking out on his bald head or forehead. Kama ọ bụrụ na onye ahụ enwee etuto nʼisi ya maọbụ nʼegedege ihu ya nke na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, o nwere ike bụrụ ọrịa ekpenta na-enupụta ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu.
43 The priest examines him; if a reddish-white swelling is on his bald head or forehead, like skin disease on the body's skin. Nʼihi ya, onye nchụaja ga-elezi ya anya. Ọ bụrụ na etuto ahụ toro ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, ọ ga-abụ na ọ ghọọla ọrịa ekpenta.
44 A man with a skin disease is unclean; the priest must declare him unclean, his mark on his head. Onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye ekpenta. Ọ bụkwa onye rụrụ arụ, nʼihi ọnya ahụ dị ya nʼisi.
45 "Anyone with the skin disease must wear torn clothes, let their hair hang loose, cover their upper lip, and cry, 'Unclean, unclean!' “Onye ọbụla a chọpụtara na ọ bụ onye ekpenta ga-eyi uwe dọkara adọka, hapụ agịrị isi ya ka ọ dịka nke onye ara. Ọ ga-ekpuchi elu egbugbere ọnụ ya, na-eti mkpu na-asị, ‘Onye rụrụ arụ ka m bụ. Onye rụrụ arụ ka m bụ!’
46 While the mark remains, they are unclean—unclean; they must live alone, outside the camp. Ụbọchị niile nke ọ nọ nʼọrịa ahụ, ọ gaghị ebi nʼime obodo nʼetiti ụmụ mmadụ nʼihi na onye rụrụ arụ ka ọ bụ.
47 "When a garment has a mark of mildew in it, whether a wool or a linen garment, “Ọ bụrụ na a hụrụ ntụpọ yiri ntụpọ ọrịa na-efe efe nʼuwe ajị anụ maọbụ nʼuwe ogho ọcha,
48 in fabric of linen or wool, woven or knitted, or in leather or anything of leather, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ọbụla, maọbụ nʼihe ọbụla e ji akpụkpọ ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, uwe a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ mee.
49 if a mark on garment, leather, warp, or weft, or any leather article, is greenish or reddish, it is mildew and must be shown to the priest. Ọ bụrụkwa na ntụpọ dị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, maọbụ nke a kpara akpa, maọbụ nke atụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ọbụla na-acha ahịhịa ndụ maọbụ uhie uhie, o nwere ike ịbụ ọrịa na-efe efe. A ga-ewegara onye nchụaja uwe ahụ ka o lezie ya anya.
50 The priest is to examine the mark and isolate the affected article for seven days. Onye nchụaja ga-ele ya anya, were ya debe ya iche ụbọchị asaa.
51 On the seventh day he examines the mark. If it has spread in the garment, warp or weft, or in leather or anything made of leather, it is destructive mildew—unclean. Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-ele ya anya ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaa nʼuwe ahụ maọbụ nʼihe ahụ a kpara akpa, maọbụ nʼihe ahụ a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ahụ, nʼime ụbọchị asaa ndị a, nʼagbanyeghị ihe e ji ha eme, ọ bụ ọrịa ọjọọ na-efe efe. Ihe ahụ bụ ihe rụrụ arụ.
52 Burn the garment—warp or weft, wool or linen—or any leather article with the mark, for it is a destructive mildew; burn it in the fire. A ga-akpọ uwe ahụ, maọbụ akwa ajị anụ ahụ, maọbụ akwa ajị anụ a kpara akpa, maọbụ akwa ogho ọcha ahụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla ọkụ, nʼihi na ọrịa na-efe efe dị nʼime ya, nʼihi na ọrịa na-eweta mbibi ka ọ bụ. A ghakwaghị iji ọkụ rechapụ ya.
53 "But if the priest examines it and the sore hasn't spread in the garment, or warp, or weft, or any leather article, “Ma ọ bụrụ na onye nchụaja ahụ ele hụ na ntụpọ ahụ agbasaghị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ akwa a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ahụ ọbụla.
54 the priest will order the marked article washed, and isolate it another seven days. Ọ ga-enye iwu ka a saa ihe ndị ahụ niile mmiri, wezugakwa ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ.
55 After the affected fabric is washed, the priest examines it. If the mark's look hasn't changed, though it hasn't spread, it is unclean. Burn it in the fire—it is a corroding spot, inside or outside. Mgbe a sachara ihe ahụ mmiri, onye nchụaja ga-ele ya anya ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbanwebeghị, ọ bụrụ na ọ na-achakwa dịka o si acha na mbụ, mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, ọ bụ ezie na ọ gbasaghị, ọ bụ ihe rụrụ arụ. A ga-akpọ ya ọkụ, ma ntụpọ ahụ ọ dị nʼihu uwe ahụ maọbụ nʼazụ ya.
56 If the priest sees the mark has faded after washing, he must tear it from the garment, leather, or woven or knitted material. Ma ọ bụrụ na onye nchụaja elee ya anya hụ na ụcha ntụpọ dị nʼihe ahụ adịghị ukwuu nʼihi nsacha a sachara ya na mmiri, ọ ga-achakapụ akụkụ uwe ahụ, maọbụ akwa ahụ a kpara akpa maọbụ nke a tụrụ atụ.
57 If it reappears in the garment, woven or knitted, or any leather, it's spreading; burn what has the mark in fire. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ emesịa pụta ọzọ nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, o gosiri na ọ na-agbasa agbasa. Ihe ọbụla nwere ntụpọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.
58 But if the mark leaves the garment, warp, weft, or leather item you washed, wash it again—it is clean. Uwe maọbụ ihe a kpara akpa, maọbụ ihe a tụrụ atụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla a sara mmiri nke ntụpọ dị na ya pụrụ, a ga-asa ya mmiri ọzọ. Ọ ga-abụkwa ihe dị ọcha.”
59 "This is the law for a mildew mark on a wool or linen garment, warp or weft, or any leather item—to pronounce it clean or unclean." Ndị a bụ usoro iwu metụtara ntụpọ dịka ntụpọ ọrịa na-efe efe nke dị nʼuwe ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, maọbụ nʼihe a kpara akpa maọbụ nʼihe a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ. Iwu ndị a ga-enye aka ịchọpụta ma ha rụrụ arụ, maọbụ na ha dị ọcha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]