Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 14 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father said to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
2 "This is the law for someone with a skin disease on the day of his cleansing: he must be brought to the priest. “Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja.
3 The priest is to go outside the camp and examine him; if his skin disease has healed, Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala,
4 the priest must order two live clean birds, cedar wood, scarlet yarn, and hyssop taken for the one being cleansed. onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha.
5 The priest is to command that one bird be slaughtered over a clay pot of fresh water. Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja.
6 He must take the live bird, the cedar wood, the scarlet yarn, and the hyssop, and dip them with the live bird in the blood of the bird slaughtered over the fresh water. Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ.
7 He sprinkles the blood seven times on the one being cleansed of the skin disease, pronounces him clean, then releases the live bird over the open field. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa.
8 "The one being cleansed must wash his clothes, shave off all his hair, and bathe in water—then he is clean. Afterward he may enter the camp, but stay outside his tent seven days. “Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee.
9 On the seventh day he must shave off all his hair—head, beard, eyebrows—shaving off all his hair. Then he must wash his clothes and bathe his body in water, and he is clean. Nʼụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụchapụ ntutu isi ya, na afụọnụ ya, na ikuanya ya, na ajị ndị ọzọ dị ya nʼahụ. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya niile. Mgbe ahụ, a ga-agụ ya nʼonye dị ọcha.
10 "On the eighth day he must take two male lambs without defect, a year-old ewe lamb without defect, three quarts fine flour mixed with oil for a grain offering, and a cup of oil. “Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ.
11 The cleansing priest is to present the one being cleansed, with these offerings, before our Father at the tent of meeting's entrance. Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
12 "The priest takes one male lamb and offers it as a guilt offering, with the oil, waving them as a wave offering before our Father. “Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
13 He must slaughter the lamb where the sin offering and burnt offering are slaughtered, in the holy place—since the guilt offering, like the sin offering, belongs to the priest; it is most holy. Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
14 The priest is to take some blood of the guilt offering and put it on the right earlobe of the one being cleansed, on his right thumb, and on his right big toe. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya.
15 The priest is to take some of the oil and pour it into his own left palm. Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
16 He must dip his right finger in the oil in his left palm and sprinkle some with his finger seven times before our Father. ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
17 With the oil remaining on his palm, the priest puts some on the right earlobe of the one being made clean, on his right thumb, and his right big toe, over the blood of the guilt offering. Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee.
18 The priest is to put the oil left in his palm on the head of the one made clean, making atonement for him before our Father. Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị.
19 The priest is to offer the sin offering and atone for the one made clean from his impurity; afterward he slaughters the burnt offering. “Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ,
20 The priest will offer the burnt and grain offerings on the altar, atone for him, and he will be clean. were ya na onyinye mkpụrụ ọka chụọrọ onye ahụ aja, maka ikpuchiri ya mmehie ya. Mgbe ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dị ọcha.
21 "But if he is poor and lacks the means, he is to take one male lamb as a guilt offering, to be waved for atonement for him, with about two quarts of fine flour mixed with oil, for a grain offering, and about a cup of oil, “Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye onye na-enweghị ike iweta ihe ndị a, ha aghaghị iwere otu nwa ebule dịka aja ikpe ọmụma nke a ga-efufe nʼihi aja ikpuchi mmehie ha, Ọ ga-ewetakwa iko ọka a kwọrọ nke ọma asaa maọbụ ihe ọtụtụ efaa a gwara mmanụ oliv dịka aja mkpụrụ ọka, ya na otu iko mmanụ.
22 and two turtledoves or two young pigeons—whichever he can afford, one as a sin offering, the other as a burnt offering. Ọ ga-ewetakwa nduru abụọ maọbụ kpalakwukwu abụọ, nke ọbụla o nwere ike iweta. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
23 "On the eighth day he must bring them for his cleansing to the priest, to the entrance of the tent of meeting, before our Father. “Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu Onyenwe anyị, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha.
24 The priest takes the guilt-offering lamb and the log of oil, waving them as a wave offering before our Father. Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
25 He must slaughter the guilt offering's lamb, take some of its blood, and put it on the right ear lobe, right thumb, and right big toe of the one being cleansed. Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
26 The priest is to pour some of the oil into his own left palm, Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
27 and with his right finger sprinkle some oil from his left palm seven times before our Father. ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
28 The priest puts oil from his palm on the right earlobe of the one being made clean, his right thumb, and right big toe, over the place of the guilt offering's blood. Ọ ga-etekwa ụfọdụ mmanụ ahụ dị nʼaka ya nʼebe ndị ahụ o tere ọbara ikpe ọmụma ahụ, nke bụ nʼọnụ ntị onye ahụ nke a na-eme ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
29 The priest is to put the rest of the oil from his palm on the head of the one being cleansed, to atone for him before our Father. Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
30 Then he is to offer one of the turtledoves or young pigeons, whichever he can afford. Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja.
31 Whichever he can afford—one as a sin offering, the other as a burnt offering, with the grain offering. The priest will make atonement before our Father for the one made clean. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ, ha na aja mkpụrụ ọka. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, bụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha.”
32 "This is the law for one with a skin disease who cannot afford the offerings for his cleansing." Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha.
33 Our Father said to Moses and Aaron: Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
34 "When you enter the land of Canaan, which I give you as a possession, and I put a spreading mildew in a house in the land you possess, “Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe,
35 the owner must come tell the priest: 'Something like a disease has appeared in my house.' onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’
36 The priest must order the house emptied before he enters to examine the disease, so nothing in it is declared unclean; then he may enter to examine the house. Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ.
37 He examines the disease, and if it is in the house's walls—greenish or reddish depressions that appear deeper than the surface. Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya,
38 The priest must leave the house through its doorway and shut it up seven days. onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa.
39 On the seventh day the priest returns to examine it. If the disease has spread on the house walls, Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ,
40 he must order the diseased stones torn out and thrown outside the city, to an unclean place. onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
41 He must scrape the house's inside all around, and dump the scraped-off plaster outside the city in an unclean place. Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
42 Other stones are to replace the old ones, and new plaster is to cover the house. A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.
43 "If the infection returns in the house after the stones are torn out, the house scraped, and plastered, “Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya,
44 the priest must enter and examine; if the disease has spread in the house, it is a destructive mildew in the house—it is unclean. onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe.
45 He must tear down the house—stones, timbers, and all its plaster—and haul it outside the city to an unclean place. Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
46 Anyone who enters the house while it is closed is unclean until evening. “Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi.
47 Whoever lies or eats in the house must wash his clothes. Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.
48 "If the priest comes, examines it, and the disease has not spread in the house after it was plastered, he is to declare it clean—the disease is healed. “Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala.
49 To cleanse the house he is to take two birds, with cedar wood, scarlet yarn, and hyssop, Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.
50 and he is to slaughter one of the birds into a clay pot over fresh water. Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja.
51 He must take the cedar wood, hyssop, scarlet yarn, and the live bird, dip them in the slaughtered bird's blood and the fresh water, and sprinkle the house seven times. Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa.
52 Then he must purify the house with the bird's blood, fresh water, the live bird, cedar wood, hyssop, and scarlet yarn. Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha.
53 He is to release the live bird outside the city into the open field, make atonement for the house, and it will be clean." Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.”
54 This is the law for any skin disease, for an itch, Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ,
55 for mildew in a garment or a house, na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ,
56 and for a swelling, a scab, or a bright spot, maọbụ etuto, maọbụ ntụpọ, maọbụ ọnya.
57 to teach when something is unclean and when clean. This is the law of skin disease and mildew. Iwu ndị a ga-enye aka ịmata ihe rụrụ arụ maọbụ ihe na-adịghị ọcha. Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta na ọrịa na-efe efe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]