Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "When anyone brings a grain offering to our Father, the offering must be fine flour. Pour oil on it, put frankincense on it, “ ‘Mgbe onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye mkpụrụ ọka, onyinye ya ga-abụ nke ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma. Ha ga-awụkwasị ya mmanụ oliv, tinyekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya,
2 and bring it to Aaron's sons, the priests. The priest will take a handful of its fine flour and oil, with all its frankincense, and burn the memorial portion on the altar—a fire offering, a pleasing aroma to our Father. ọ ga-ebutere ya ụmụ Erọn ndị nchụaja. Onye nchụaja ga-ekpoju ụtụ ọka na mmanụ ahụ nʼaka, tinyekwara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile ahụ, kpọọ ihe ndị a ọkụ dịka oke ncheta nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ ga-abụkwa onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
3 The rest of the grain offering belongs to Aaron and his sons—most holy, from the fire offerings to our Father. Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
4 "When you bring a grain offering baked in an oven: fine flour, either loaves without yeast mixed with oil, or wafers without yeast spread with oil. “ ‘Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha eghere nʼite e ji eghe ihe, ọ ga-abụ nke e ji ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma mee. Ọ ga-abụ ogbe achịcha agwara mmanụ oliv nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, maọbụ achịcha mbadamba e tere mmanụ nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
5 If your offering is a grain offering on a griddle, it must be fine flour mixed with oil, without yeast. Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha e ghere eghe, achịcha ahụ aghaghị ịbụ nke e mere site nʼezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, nke a gwakọtara mmanụ, nke na-enweghị ihe na-eko achịcha nʼime ya.
6 Break it into pieces and pour oil on it; it is a grain offering. Nyawasịa ya, wụkwasị ya mmanụ nʼelu, ọ bụkwa onyinye mkpụrụ ọka.
7 If your offering is grain cooked in a pan, make it with fine flour and oil. Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka gị bụ ihe e siri nʼite, ọ ghaghị ịbụ ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, e tinyetụrụ mmanụ oliv.
8 Bring the grain offering made from these to our Father; present it to the priest, who brings it to the altar. Ị ga-ebute onyinye mkpụrụ ọka ahụ bunye ya onye nchụaja. Ọ ga-eche ya nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja.
9 The priest takes the grain offering's memorial portion and burns it on the altar—a fire offering, a pleasing aroma to our Father. Onye nchụaja ga-ekporo ụfọdụ nʼaka dịka oke ncheta nʼime onyinye ọka ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka aja e surere nʼọkụ, nke isisi ya na-atọ Onyenwe anyị ezi ụtọ.
10 What remains of the grain offering belongs to Aaron and his sons—most holy, from the fire offerings to our Father. Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
11 "No grain offering you bring to our Father may contain yeast, for you must not burn any yeast or honey as a fire offering to our Father. “ ‘Unu etinyela ihe na-eko ọka ọbụla nʼonyinye mkpụrụ ọka unu na-enye Onyenwe anyị, nʼihi na unu ekwesighị ịkpọ ihe na-eko achịcha maọbụ mmanụ aṅụ ọkụ nʼonyinye nsure ọkụ unu na-enye Onyenwe anyị.
12 You may bring them to our Father as a firstfruits offering, but do not offer them on the altar as a pleasing aroma. Unu nwere ike nye Onyenwe anyị achịcha e ji ihe na-eko achịcha na mmanụ aṅụ mee nʼoge onyinye owuwe ihe ubi, ma a gaghị eme otu a nʼoge onyinye ọchụchụ aja nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ.
13 Salt every grain offering. Don't leave out your Father's covenant salt; add salt to all your offerings. Unu aghaghị itinye nnu nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile.
14 "If you bring a firstfruits grain offering to our Father, offer new grain roasted in fire, crushed kernels, as your firstfruits offering. “ ‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara Onyenwe anyị bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ.
15 Put oil on it and lay frankincense on it; it is a grain offering. Tinye ya mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ. Ọ ga-abụ onyinye ọka.
16 The priest burns the memorial portion—some of the crushed grain and oil—with all its frankincense, as a fire offering to our Father." Onye nchụaja ga-ewere oke ncheta nʼime ọka ahụ a sụrụ asụ, nke a gwara mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ, dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]