Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father called to Moses and spoke to him from the tent of meeting, saying: Onyenwe anyị sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị,
2 "Speak to the Israelites and say to them: When any of you brings me an offering, bring your offering of livestock from the herd or the flock. “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ.
3 "If his offering is a burnt offering from the herd, he is to offer a male without defect, offering it at the entrance of the tent of meeting, to be accepted before me. “ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata.
4 He is to lay his hand on the burnt offering's head, and it will be accepted for him, to atone for him. Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya.
5 He is to kill the young bull before me, and Aaron's sons the priests are to bring the blood and splash it around the altar at the entrance of the tent of meeting. Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ.
6 Then he is to skin the burnt offering and cut it into its pieces. Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị.
7 Aaron's sons the priests will lay a fire on the altar and arrange wood on it. Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya.
8 Aaron's sons, the priests, arrange the pieces, head, and fat on the wood over the fire on the altar. Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ.
9 He is to wash its inner organs and legs with water; the priest burns it all on the altar—a burnt offering, a food offering, a pleasing aroma to me. Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
10 "If his burnt offering is from the flock—sheep or goats—he must bring a male without defect. “ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ọ ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ.
11 He is to slaughter it on the altar's north side before me; Aaron's sons the priests are to splash its blood around the altar. Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu Onyenwe anyị nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
12 He is to cut it into pieces—head and fat—and the priest is to arrange them on the wood, on the fire, on the altar. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja.
13 He must wash the inner organs and legs with water; the priest offers it all, burns it on the altar—a burnt offering, a food offering, a pleasing aroma to me. Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
14 "If his burnt offering to me is a bird, he must bring turtledoves or young pigeons as his offering. “ ‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu.
15 The priest brings it to the altar, wrings off its head, burns it there; its blood drains against the altar's side. Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja.
16 He removes its crop with its contents, throwing it beside the altar eastward, at the ash heap. Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ.
17 He is to tear it open by the wings, not fully apart; the priest will burn it on the altar's wood over the fire—a burnt offering, a food offering, a pleasing aroma to me." Ọ ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma ọ gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]