Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lamentations 5 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

1Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị;leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.

2E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka,werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.

3Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna.Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.

4Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ.Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.

5Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ,ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.

6Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼakanʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.

7Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla.Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.

8Ndị bụ ohu na-achị anyị.Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.

9Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri,nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.

10Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.

11Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn,ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.

12Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu;a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.

13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri,ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.

14Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama,ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.

15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị;ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.

16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ.Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.

17Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba,nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.

18Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.

19Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

20Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?

21Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,

22ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpamna-eweso anyị iwe nke ukwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]