Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Six days before Passover, Jesus came to Bethany, where Lazarus, whom Jesus raised from death, lived. Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie.
2 There they gave him a dinner; Martha served, and Lazarus was one of those at the table with him. Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ.
3 Mary took about a pint of pure nard perfume, expensive, and anointed Jesus' feet, then wiped his feet with her hair. The house filled with the fragrance of the perfume. Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.
4 But Judas Iscariot, one of his disciples, the one who was about to betray him, said, Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru,
5 "Why was this perfume not sold for about a year's wages and given to the poor?" “Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?”
6 He said this not because he cared about the poor, but because he was a thief who kept the money box, taking what was put in it. O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego.
7 So Jesus said, "Leave her alone. She has kept this for the day of my burial. Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m.
8 You will always have the poor among you, but you will not always have me." Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”
9 A large crowd of Jews learned Jesus was there and came, not only for him but to see Lazarus, whom he had raised from the dead. Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie.
10 So the chief priests planned to kill Lazarus as well, Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs.
11 because on account of him many of the Jews were going over and believing in Jesus. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.
12 The next day, the large crowd that came for the feast heard Jesus was coming to Jerusalem. Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem.
13 They took palm branches and went out to meet him, shouting, "Hosanna! Blessed is he who comes in the name of our Father—the King of Israel!" Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!”
14 Jesus found a young donkey and rode on it, just as it is written: Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya,
15 "Do not be afraid, daughter of Zion; look, your king is coming, seated on a donkey's colt." “Atụla egwu, gị ada Zayọn! Lee, eze gị ka ọ na-abịa. Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”
16 His disciples didn't understand these things at first; but when Jesus was glorified, they remembered these things were written about him, and that they had done these things to him. Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a.
17 The crowd that was with him when he called Lazarus from the tomb and raised him from the dead kept testifying. Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya.
18 The crowd went to meet him because they heard he had done this sign. Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ.
19 So the Pharisees said to each other, "See, you're accomplishing nothing—the whole world has gone after him." Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.”
20 Now there were some Greeks among those who went up to worship at the feast. Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ.
21 These came to Philip, from Bethsaida in Galilee, and asked him, "Sir, we want to see Jesus." Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.”
22 Philip went and told Andrew; then Andrew and Philip went and told Jesus. Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.
23 Jesus replied to them, "The hour has come for the Son of Man to be glorified. Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto.
24 Truly, truly, I tell you, unless a wheat grain falls to the ground and dies, it stays alone; but if it dies, it bears much fruit. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ.
25 Whoever loves his life loses it; whoever hates his life in this world keeps it for eternal life. Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi.
26 Whoever serves me must follow me, so my servant will be where I am. Whoever serves me, my Father will honor him." Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ.
27 "Now my soul is troubled. What should I say—'Father, save me from this hour'? But this is why I came to this hour. Father, glorify your name." “Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a.
28 Then a voice came from heaven: "I have glorified it, and I will glorify it again." Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.”
29 The crowd standing there heard it and said it thundered; others said an angel spoke to him. Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”
30 Jesus said, "This voice came for your sake, not mine. Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu.
31 Now is the judgment of this world; now the ruler of this world will be cast out. Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a.
32 And I, when I am lifted up from the earth, will draw all people to myself." Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.”
33 He said this to show by what kind of death he was going to die. O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ.
34 The crowd replied, "We've heard from the Law that the Christ stays forever. How can you say the Son of Man must be lifted up? Who is this Son of Man?" Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?”
35 So Jesus said, "The light is with you a little while longer. Walk while you have light, so darkness doesn't overtake you. Whoever walks in darkness doesn't know where he's going. Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.
36 While you have light, believe in the light, so you become children of light." Having said this, Jesus left and hid from them. Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya.
37 Though he had performed so many signs in their presence, they still would not believe in him, Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya.
38 so that the word of Isaiah the prophet would be fulfilled, which he spoke: "Father, who has believed our message? And to whom has the arm of our Father been revealed?" Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?”
39 This is why they could not believe, for Isaiah said again: Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị,
40 "He has blinded their eyes and hardened their heart, so that they would not see with their eyes, nor understand with their heart, nor turn—and I would heal them." “O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.”
41 Isaiah said these things because he saw Jesus' glory and spoke about him. Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.
42 Still, many even of the rulers believed in him, but they didn't admit it because of the Pharisees, so they wouldn't be expelled from the synagogue, Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere.
43 for they loved the glory that comes from people more than the glory that comes from our Father. Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.
44 Jesus cried out, "Whoever believes in me does not believe in me only, but in the one who sent me. Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.
45 And whoever sees me sees the one who sent me. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m.
46 I came into the world as light, so no one who believes in me stays in the darkness. Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.
47 If anyone hears my words and doesn't keep them, I don't judge him—I didn't come to judge the world, but to save the world. “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.
48 Whoever rejects me and doesn't accept my words already has a judge: my spoken word will judge him on the last day. Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ.
49 I have not spoken on my own; but the Father who sent me himself commanded me what to say and how to speak. Okwu ndị a esiteghị nʼaka m. Ha sitere nʼaka Nna ahụ onye zitere m ma nyekwa m iwu ihe m ga-ekwu na otu m ga esi kwuo ya.
50 I know his commandment is eternal life, so I say only what the Father told me to say." Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]