Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 11 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 A man named Lazarus was sick, from Bethany, the village of Mary and her sister Martha. Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị.
2 Mary—whose brother Lazarus was sick—anointed the Lord with fragrant oil and dried his feet with her hair. Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa.
3 So the sisters sent word to him, saying, "Lord, the one you love is sick." Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, “Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa.”
4 Hearing this, Jesus said, "This sickness won't end in death, but is for the glory of our Father, so the Son of our Father may be glorified through it." Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.”
5 Now Jesus loved Martha and her sister and Lazarus. Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya.
6 So when he heard Lazarus was sick, he stayed two more days where he was. Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ.
7 Then after this he said to the disciples, "Let us go back to Judea." Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa.”
8 The disciples said to him, "Rabbi, the Jews just now tried to stone you, and you're going back there?" Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”
9 Jesus answered, "Aren't there twelve hours in the day? Anyone who walks by day won't stumble - he sees the light of this world. Jisọs zara, “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ.
10 But if anyone walks at night, he stumbles, because the light is not in him." Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha.”
11 After this, he told them, "Our friend Lazarus has fallen asleep, but I'm going to wake him." Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.”
12 So the disciples said to him, "Lord, if he has fallen asleep, he will get better." Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-adị mma.”
13 Now Jesus had been speaking about his death, but they thought he meant natural sleep. Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu.
14 So then Jesus told them plainly, "Lazarus has died, Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, “Lazarọs anwụọla.
15 I'm glad for your sake I wasn't there, so you'll believe. But let's go to him." Ma nʼihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nʼebe ahụ, ka unu nwe ike kwere. Ma bịanụ ka anyị gakwuru ya.”
16 So Thomas, called the Twin, told the other disciples, "Let's go too, and die with him." Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, “Ka anyị gakwanụ ka anyị soro ya nwụọ.”
17 So when Jesus arrived, he found that Lazarus had already been in the tomb four days. Mgbe Jisọs rutere, ọ chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nʼili ụbọchị anọ.
18 Bethany was near Jerusalem, about two miles away, Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ.
19 and many of the Jews had come to Martha and Mary to console them about their brother. Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke.
20 When Martha heard Jesus was coming, she went to meet him; Mary stayed sitting in the house. Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ.
21 Martha said to Jesus, "Lord, if you had been here, my brother would not have died. Mata sịrị Jisọs, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.
22 But even now I know that whatever you ask of our Father, he will give you." Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.”
23 Jesus said to her, "Your brother will rise again." Jisọs sịrị ya, “Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ.”
24 Martha said to him, "I know he'll rise again in the resurrection on the last day." Mata sịrị ya, “Amara m na ọ ga-ebili ọzọ nʼụbọchị mbilite nʼọnwụ nʼoge ikpeazụ.”
25 Jesus told her, "I am the resurrection and the life. Whoever believes in me will live, even though he dies, Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.
26 and everyone who lives and believes in me will never die. Do you believe this?" Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?”
27 She said to him, "Yes, Lord; I believe you are the Christ, the Son of our Father, the one coming into the world." Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe m, ekwere m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke, onye ga-abịa nʼụwa.”
28 After saying this, she went and called her sister Mary privately: "The Teacher is here—he's calling for you." Mgbe o kwuchara nke a, ọ gara kpọọ nwanne ya nwanyị bụ Meri, jiri nwayọọ sị ya, “Onye ozizi abịala, ọ na-akpọ gị.”
29 When Mary heard this, she rose quickly and went to him. Mgbe ọ nụrụ nke a, ọ biliri ọsịịsọ ga zute ya.
30 Jesus had not yet entered the village; he was still where Martha met him. Ruo mgbe a, Jisọs abịarutebeghị nʼobodo nta ahụ, ma ọ ka nọ nʼebe ahụ Mata zutere ya.
31 The Jews with her in the house, comforting her, saw Mary rise quickly and leave; they followed, thinking she was going to the tomb to weep there. Ndị Juu nọ nʼụlọ na-akasị Meri obi hụrụ ya ka ọ pụrụ ngwangwa. Ha sochiri ya nʼazụ nʼihi na ha chere na ọ na-aga nʼili ibe akwa nʼebe ahụ.
32 Mary came to Jesus, saw him, fell at his feet, and said, "Lord, if you had been here, my brother would not have died." Mgbe Meri rutere nʼebe Jisọs nọ, ọ dara nʼụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.”
33 When Jesus saw her weeping, and the Jews who came with her also weeping, he groaned in spirit and was troubled. Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-ebe akwa ya na ndị Juu ahụ so ya ka ha na-ebekwa akwa, o metụrụ ya nʼime mmụọ ya. O nwere ọmịiko dị ukwuu.
34 And he said, "Where have you laid him?" They said to him, "Lord, come and see." Ọ sịrị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.”
35 Jesus wept. Jisọs ebee akwa.
36 So the Jews said, "See how he loved him!" Mgbe ahụ ndị Juu na-asị, “Lee ka o si hụ ya nʼanya.”
37 But some of them said, "Could this man who opened the blind man's eyes not have kept him from dying?" Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nwoke a meghere anya onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka nwoke a hapụ ịnwụ?”
38 So Jesus, again deeply moved in himself, came to the tomb—a cave with a stone against it. Ọzọkwa, Jisọs sụrụ ude nʼime onwe ya nke ukwuu, bịarute nʼili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba e jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya.
39 Jesus said, "Take away the stone." Martha, the dead man's sister, said to him, "Lord, he must smell by now—he's been dead four days." Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
40 Jesus said to her, "Didn't I tell you: if you believe you'll see our Father's glory?" Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?”
41 So they removed the stone. Jesus looked up and said, "Father, I thank you that you heard me. Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m.
42 I knew you always hear me, but I said this for the crowd standing here, so they may believe you sent me." Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.”
43 When he had said this, he cried out with a loud voice, "Lazarus, come out!" Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!”
44 The dead man came out, feet and hands bound with strips of linen, and his face wrapped in cloth. Jesus said to them, "Untie him; let him go." Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”
45 So many of the Jews who came to Mary and saw what Jesus did believed in him. Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya.
46 But some of them went to the Pharisees and told them what Jesus had done. Ma ụfọdụ nʼime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe o mere.
47 So the chief priests and Pharisees convened the council and said, "What are we doing? For this man performs many signs. Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama.
48 If we leave him alone, everyone will believe in him, and the Romans will come and take away both our place and our nation." Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nʼihu, mmadụ niile ga-ekwere na ya. Ndị Rom ga-abịakwa, kwatuo ụlọnsọ ukwu ma napụ anyị obodo anyị.”
49 But one of them, Caiaphas, high priest that year, told them, "You know nothing at all. Ma otu onye nʼime ha bụ Kaịfas, onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe ọbụla.
50 Don't you see it's better for you that one man die for the people than the whole nation perish?" Ọ bụ na unu amaghị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile, karịa nʼobodo anyị niile ga-ala nʼiyi.”
51 He didn't say this on his own; as high priest that year, he prophesied Jesus would die for the nation, Dị ka onyeisi nchụaja nke afọ ahụ, o kwughị nke a site nʼechiche ya, kama o buru amụma na Jisọs ga-anwụ nʼihi mba ndị Juu.
52 not only for the nation, but also to gather into one the scattered children of our Father. Ọ bụghị nʼihi mba ahụ naanị, kama, ka ọ kpọkọta ụmụ Chineke ndị gbasara nʼebe niile.
53 So from that day on they plotted to put him to death. Ya mere, site nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi gbuo ya.
54 So Jesus no longer moved about openly among the Jews, but withdrew to a town called Ephraim near the wilderness, and stayed there with his disciples. Ya mere, Jisọs kwụsịrị ịgagharị ebe ndị Juu ga-ahụ ya. O siri nʼebe ahụ pụọ gaa nʼakụkụ ọzara nʼotu obodo nta a na-akpọ Ifrem. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ nʼebe ahụ.
55 The Jews' Passover was near, and many went up from the country to Jerusalem before it to purify themselves. Mmemme Ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nʼakụkụ ala ndị Juu niile bịa Jerusalem. Ha bịara tutu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha.
56 So they looked for Jesus, asking each other as they stood in the temple, "What do you think? Surely he won't come to the feast?" Ha na-achọ Jisọs na-ajụrịta onwe ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, “Gịnị ka unu chere? Ọ bụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?”
57 The chief priests and Pharisees had ordered that anyone who knew his whereabouts must report it, so they could arrest him. Ma nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọbụla hụrụ ya bịa gwa ha ka ha gaa jide ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]