Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "Truly, truly, I tell you: whoever doesn't enter the sheepfold through the gate, but climbs in another way, is a thief and a robber. “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe.
2 But the one who enters by the gate is the shepherd of the sheep. Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ.
3 The gatekeeper opens for him, and the sheep hear his voice. He calls his own sheep by name and leads them out. Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ.
4 After bringing all his own out, he goes ahead of them, and the sheep follow him because they know his voice. Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya.
5 They will never follow a stranger—they'll run from him, since they don't know the voice of strangers." Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.”
6 Jesus told them this figure of speech, but they didn't grasp what he meant. Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha.
7 So Jesus said again, "Truly, truly, I tell you, I am the gate for the sheep. Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ.
8 "All who came before me are thieves and robbers, but the sheep did not listen to them. Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị.
9 I am the gate; whoever enters through me will be saved, going in and out, finding pasture. Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
10 The thief comes only to steal, kill, and destroy. I came so they may have life, and have it in abundance. Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.
11 "I am the good shepherd. The good shepherd lays down his life for the sheep. “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.
12 The hired hand, not a shepherd, doesn't own the sheep. Seeing the wolf coming, he leaves the sheep and flees—the wolf snatches and scatters them. Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha.
13 The man runs away because he is a hired hand and cares nothing for the sheep. Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ.
14 "I am the good shepherd. I know my own and my own know me, “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m.
15 as the Father knows me and I know the Father, and I lay down my life for the sheep. Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ.
16 I have other sheep not of this fold; I must lead them too, and they will hear my voice. They will become one flock, one shepherd. Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
17 This is why the Father loves me: I lay down my life only to take it up again. Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ.
18 No one takes it from me, but I lay it down on my own. I have authority to lay it down, and authority to take it up again. This charge I received from my Father." O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.”
19 These words brought division among the Jews once again. Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a.
20 Many of them said, "He is demon-possessed and out of his mind. Why listen to him?" Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?”
21 But others said, "These aren't a demon-possessed man's words. Can a demon open blind eyes?" Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?”
22 Then came the Feast of Dedication at Jerusalem. It was winter, Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi,
23 and Jesus was walking in the temple, in Solomon's Colonnade. ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba Solomọn.
24 The Jews surrounded him and said, "How long will you hold us in suspense? If you are the Christ, tell us plainly." Ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-edebe anyị nʼọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst ahụ, gwaghee anyị ọnụ.”
25 Jesus answered, "I told you, and you don't believe. The works I do in my Father's name testify about me, Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m.
26 but you do not believe, because you are not my sheep. Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m.
27 My sheep listen to my voice; I know them, and they follow me. Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.
28 I give them eternal life, and they will never perish, and no one will snatch them from my hand. Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m.
29 My Father, who gave them to me, is greater than all; no one can snatch them out of the Father's hand. Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m.
30 I and the Father are one." Mụ na nna m bụ otu.”
31 Again the Jews picked up stones to stone him. Ndị Juu tụtụlitekwara nkume ọzọ ịtụ ya.
32 Jesus replied, "I have shown you many good works from the Father. For which of these are you going to stone me?" Ma Jisọs zara ha, “E zila m unu ọtụtụ ọrụ ọma nke sitere nʼaka Nna m, olee nke unu na-achọ ịtụ m nkume nʼihi ya?”
33 "We're stoning you not for good work," they said, "but for blasphemy, because you, a mere man, claim to be God." Ndị Juu zara ya, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nʼihi ọrụ ọma ndị a, kama nʼihi nkwulu na nʼihi na gị bụ mmadụ efu, ma ị na-eme onwe gị Chineke.”
34 Jesus answered them, "Is it not written in your Law: 'I have said you are gods'? Jisọs zara ha, “Edeghị ya nʼiwu unu, sị, ‘Mụ onwe m sịrị na unu bụ chi’?
35 If he called them 'gods,' to whom the word of my Father came—and Scripture cannot be broken, Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị ahụ nabatara okwu Chineke ‘chi,’ apụghịkwa imebi ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.
36 what about the one the Father set apart and sent into the world? Why accuse me of blasphemy for saying, 'I am the Son of our Father'? Unu na-ekwu na onye ahụ Chineke doro nsọ ma zitekwa ya nʼime ụwa na-ekwulu Chineke nʼihi na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke?’
37 "If I am not doing the works of my Father, then do not believe me. Unu ekwenyela na m, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọrụ Nna m ka m na-arụ.
38 But if I do them, even if you won't believe me, believe the works, so you'll know and keep knowing the Father is in me, and I in the Father." Ma ọ bụrụ na m na-arụ ya, a sịkwarị na unu ekweghị na m, kwerenụ nʼọrụ ndị a, ka unu nwee ike mata ma ghọtakwa na Nna ahụ nọ nʼime m, mụ onwe m nọkwa nʼime Nna ahụ.”
39 Again they tried to seize him, but he escaped their grasp. Ọzọkwa, ha gbalịrị ijide ya ma ọ siri nʼaka ha pụọ.
40 Jesus then went back across the Jordan, to the place where John had first been baptizing, and stayed there. Mgbe ahụ ọ laghachiri azụ nʼofe osimiri Jọdan, bụ ebe Jọn nọrọ na mbụ mee baptizim, ebe ahụ ka ọ nọdụrụ.
41 Many came to him, saying, "John performed no sign, but all John said about this man was true." Ọtụtụ ndị mmadụ bịakwutere ya. Ha na-asị, “Jọn arụghị ọrụ ihe ịrịbama ọbụla, ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu.”
42 And in that place many believed in him. Ọtụtụ mmadụ kwenyekwara na ya nʼebe ahụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]