Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 As Jesus passed by, he saw a man who had been blind from birth. Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya.
2 His disciples asked him, "Rabbi, who sinned, this man or his parents, that he was born blind?" Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?”
3 "Neither this man nor his parents sinned,' Jesus answered, 'but this happened so the works of our Father might be revealed in him. Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya.
4 We must do the works of the one who sent me while it is day; night comes, when no one can work. Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ.
5 As long as I am in the world, I am the light of the world.'" Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.”
6 Saying this, he spat on the ground, made mud from the saliva, and smeared it on the man's eyes. Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya.
7 He told him, "Go, wash in the pool of Siloam" (meaning Sent). So the man went, washed, and returned able to see. Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.
8 Neighbors and those who'd seen him begging before said, "Isn't this the one who used to sit and beg?" Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?”
9 Some said, "That's him." Others said, "No, he just looks like him." He kept saying, "I'm the one." Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.”
10 So they asked him, "Then how were your eyes opened?" Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?”
11 He replied, "The man called Jesus made mud, smeared it on my eyes, and told me, 'Go to Siloam and wash.' So I went, washed, and could see." Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.”
12 They said to him, "Where is he?" He said, "I do not know." Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.”
13 They brought the man who had been blind to the Pharisees. Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii.
14 Now it was a Sabbath day when Jesus made the mud and opened his eyes. Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya.
15 So the Pharisees also asked him again how he had gained sight. He told them, "He put mud on my eyes, and I washed, and I see." Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
16 Some Pharisees said, "This man isn't from God—he doesn't keep the Sabbath." Others said, "How can a sinful man do such signs?" So they were divided among them. Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.
17 Again they asked the blind man, "What do you say about him, since he opened your eyes?" He said, "He is a prophet." Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”
18 The Jews did not believe he had been blind and gained sight, until they summoned the parents of the man who had gained sight. Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya.
19 They asked them, "Is this your son you say was born blind? How then does he now see?" Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?”
20 His parents answered, "We know that this is our son and that he was born blind. Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya.
21 But how he now sees, we don't know; or who opened his eyes, we don't know. Ask him—he's an adult; he'll speak for himself." Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.”
22 His parents said this, fearing the Jews, since the Jews had already agreed that if anyone confessed Jesus as the Christ, he would be expelled from the synagogue. Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha.
23 That was why his parents said, "He is of age; ask him." Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”
24 So they called the once-blind man again and said, "Give God the glory. We know this man is a sinner." Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”
25 He replied, "Whether he's a sinner, I don't know. I know one thing: I was blind, now I see." Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
26 They said to him, "What did he do to you? How did he open your eyes?" Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
27 He answered them, "I already told you, and you didn't listen. Why do you want to hear it again? Do you also want to become his disciples?" Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?”
28 And they reviled him, saying, "You are his disciple, but we are disciples of Moses. Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis.
29 We know God spoke to Moses, but we don't know where this man is from." Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”
30 The man answered them, "Here's the amazing thing: you don't know where he's from, yet he opened my eyes. Nwoke ahụ zaghachiri sị ha, “Ma otu ọ dị, nke a bụ ihe ịtụnanya! Unu amaghị ebe o sịrị bịa ma o meghere anya m.
31 We know God doesn't listen to sinners, but if anyone reveres God and does his will, God listens to him. Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.
32 Never since the world began has anyone heard of someone opening the eyes of a person born blind. Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì.
33 If this man were not from God, he could do nothing." Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”
34 They answered him, "You were born entirely in sin, yet you teach us?" and threw him out. Ha zara sị ya, “Gị onye a mụrụ nʼime mmehie, ị na-achọ ikuziri anyị ihe?” Ha chụpụrụ ya nʼezi.
35 Jesus heard they had thrown him out, and finding him, said, "Do you believe in the Son of Man?" Jisọs nụrụ na ha achụpụla ya nʼezi, ma mgbe ọ chọtara ya, ọ sịrị ya, “I kweere na Nwa nke Mmadụ?”
36 He answered, "And who is he, sir, so I can believe in him?" Ọ zara sị, “Onyenwe m, ọ bụ onye? Gwa m ka m nwe ike ikwere na ya.”
37 Jesus said to him, "You have seen him, and it is he who is speaking with you." Jisọs sịrị ya, “Ị hụla ya ugbu a; onye gị na ya na-ekwurịta okwu bụ onye ahụ.”
38 He said, "Lord, I believe," and he worshiped him. Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.
39 Jesus said, "I came into this world for judgment, so those who don't see may see, and those who see may become blind." Jisọs sịrị, “Ọ bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.”
40 Some Pharisees with him heard this and said, "Are we blind too?" Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị ya, “Anyị onwe anyị, anyị bụkwa ndị kpuru ìsì?”
41 Jesus told them, "If you were blind, you would have no sin; but since you say, 'We see,' your sin remains." Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]