Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 But Jesus went to the Mount of Olives. Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv.
2 At dawn he came again to the temple; all the people came to him, and he sat down and taught them. Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe.
3 The scribes and Pharisees brought a woman caught in adultery and stood her in the middle. Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile.
4 They said to him, "Teacher, this woman was caught in the act of adultery. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko.
5 Now in the Law, Moses commanded us to stone such women. So what do you say? Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”
6 They said this to test him, seeking grounds to accuse him. But Jesus bent down and wrote on the ground with his finger." Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala.
7 When they kept questioning him, he stood up and said to them, "Whichever of you has no sin, cast the first stone at her." Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.”
8 And once more he bent down and wrote on the ground. Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala.
9 Hearing this, they left one by one, starting with the oldest, until Jesus was left alone with the woman standing there. Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya.
10 Jesus stood up and said to her, "Woman, where are they? Has no one condemned you?" Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?”
11 She said, "No one, Lord." Jesus said, "I don't condemn you either. Go, and from now on, don't sin anymore." Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.”
12 Jesus spoke to them again: "I am the world's light. Whoever follows me will never walk in darkness but will have the light of life." Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
13 So the Pharisees said to him, "You are bearing witness about yourself; your testimony is not true." Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.”
14 Jesus replied, "Even if I testify about myself, my testimony is true, because I know where I came from and where I'm going; but you don't know where I come from or where I'm going. Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga.
15 You judge according to the flesh; I judge no one. Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe.
16 Even if I judge, my judgment is true, since I do not judge alone, but I and the Father who sent me. Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.
17 In your Law it is written that the testimony of two people is true. E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’
18 I testify about myself, and the Father who sent me testifies about me." Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”
19 They asked, "Where is your Father?" Jesus answered, "You know neither me nor my Father. If you knew me, you would know my Father also." Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”
20 He said this while teaching in the temple, in the treasury; no one seized him—his hour had not yet come. Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị.
21 So he told them again, "I am going away. You will look for me and die in your sin. Where I am going, you cannot come." Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.”
22 So the Jews said, "Will he kill himself, since he says, "You can't come where I'm going"?" Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?”
23 He said to them, "You're from below; I'm from above. You're of this world; I'm not of this world. Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a.
24 I told you that you'll die in your sins; if you don't believe I AM, you'll die in your sins." A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.”
25 So they said to him, "Just who are you?" Jesus said to them, "Exactly what I've said from the start. Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ.
26 I have much to say and judge about you, but the One who sent me is true; what I heard from him, I tell the world." E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.”
27 They did not understand that he had been speaking to them about the Father. Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya.
28 So Jesus told them, "When you lift up the Son of Man, then you'll know that I AM, and that I do nothing on my own, but say these things as the Father taught me. Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a.
29 The one who sent me is with me; he hasn't left me alone, because I always do what pleases him." Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.”
30 As he was saying these things, many believed in him. Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
31 Jesus then told the Jews who had believed him, "If you remain in my word, you are truly my disciples, Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m.
32 and you will know the truth, and the truth will set you free." Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”
33 They answered him, "We are Abraham's descendants, never enslaved to anyone. How can you say, 'You will become free'?" Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?”
34 Jesus answered them, "Truly, truly, I tell you: everyone who keeps sinning is sin's slave. Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.
35 The slave does not remain in the house forever; the son remains forever. Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi.
36 So if the Son sets you free, you will be free indeed. Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu.
37 I know you are Abraham's descendants; yet you seek to kill me because my word has no space in you. Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu.
38 I speak what I've seen with my Father, and you do what you heard from your father." Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.”
39 They answered, "Abraham is our father." Jesus said, "If you were Abraham's children, you'd do the works Abraham did, Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ.
40 but now you want to kill me—a man who told you the truth I heard from my Father. Abraham didn't do this. Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a.
41 You do your father's works." They said to him, "We weren't born of sexual sin. We have one Father—God himself." Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.”
42 Jesus said to them, "If God were your Father, you'd love me, for I came from God and am here. I didn't come on my own—he sent me. Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m.
43 Why don't you understand my speech? Because you cannot bear to hear my word. Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m.
44 You belong to your father, the devil, and want to carry out his desires. He was a murderer from the beginning, not standing in truth, since no truth is in him. When he lies, he speaks from his own nature, since he's a liar and the lie's father. Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha.
45 But because I tell the truth, you do not believe me. Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m.
46 Who among you convicts me of sin? If I speak truth, why don't you believe me? O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m?
47 Whoever is from our Father hears his words; you don't hear because you're not from our Father." Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.”
48 The Jews replied, "Aren't we right in saying that you are a Samaritan and have a demon?" Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?”
49 Jesus answered, "I do not have a demon, but I honor my Father, and you dishonor me. Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m.
50 But I'm not seeking my own glory; our Father seeks it, and he judges. Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe.
51 Truly, truly, I say to you, if anyone keeps my word, he will never see death." Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.”
52 The Jews said to him, "Now we know you have a demon. Abraham died, as did the prophets, yet you say, 'Whoever keeps my word will never taste death.' Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi.
53 Are you greater than our father Abraham, who died? The prophets died too! Who do you claim to be?" Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?”
54 Jesus answered, "If I glorify myself, my glory is nothing. It is my Father who glorifies me, of whom you say, 'He is our God.' Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m.
55 You don't know him, but I know him. If I said I didn't know him, I'd be a liar like you. But I know him and keep his word. Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya.
56 Your father Abraham rejoiced that he would see my day. He saw it and was glad." Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.”
57 So the Jews said to him, "You're not yet fifty years old, and you've seen Abraham?" Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?”
58 Jesus said to them, "Truly, truly, I say to you, before Abraham was, I AM." Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.”
59 So they grabbed stones to throw at him, but Jesus hid himself and slipped out of the temple. Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]