Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After this, Jesus traveled around Galilee, not wanting to go into Judea because Jewish leaders there were looking for a chance to kill him. Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya.
2 But the Jewish Festival of Booths was near. Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso,
3 His brothers told him, "Leave here and go to Judea, so your disciples can also see the works you do. ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ.
4 No one seeking public attention hides what he does. If you're doing these things, show yourself to the world." Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
5 For not even his brothers believed in him. Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.
6 So Jesus told them, "My time has not yet come, but for you any time is right. Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile.
7 "The world cannot hate you, but it hates me, because I testify that its works are evil. Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ.
8 You yourselves go up to the festival; I'm not going up to this festival, since my time hasn't yet fully come." Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.”
9 After saying this, he stayed in Galilee. Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili.
10 After his brothers went up to the festival, he too went up—not openly, but secretly. Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo.
11 So the Jewish leaders were looking for him at the festival and asking, "Where is he?" Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?”
12 Much murmuring about him spread among the crowds: some said, "He's good," others, "No, he misleads the crowd." E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.”
13 Yet no one spoke about him openly, for fear of the Jewish leaders. Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
14 About the middle of the festival, Jesus went up into the temple and began to teach. Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe.
15 The Jewish leaders were amazed and asked, "How does this man know so much without training?" Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?”
16 Jesus answered them, "My teaching isn't mine—it's from the one who sent me. Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m.
17 Whoever wants to do our Father's will knows if my teaching is from my Father or I speak on my own. Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke.
18 Whoever speaks on his own seeks his own glory, but whoever seeks the sender's glory is true, with no falsehood in him. Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya.
19 Didn't Moses give you the law? Yet none of you obeys the law. Why are you trying to kill me?" Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?”
20 The crowd answered, "You have a demon! Who is trying to kill you?" Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”
21 Jesus replied, "I did one work, and you are all amazed. Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya.
22 "Moses gave you circumcision—not from Moses, but the patriarchs—and you circumcise a man on the Sabbath. Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu.
23 If a man is circumcised on the Sabbath so the law of Moses isn't broken, why are you angry at me for making a whole man well on the Sabbath? Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike?
24 Stop judging by appearances, and judge with right judgment." Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”
25 Then some Jerusalemites said, "Isn't this the man they want to kill? Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu?
26 Yet he speaks openly, and they say nothing to him. Can the rulers truly know this is the Christ? Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst?
27 But we know this man's origin. When the Christ comes, no one will know his origin." Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”
28 Then Jesus, teaching in the temple, cried out: "You know me, and know where I'm from. Yet I didn't come on my own—the one who sent me is true, and you don't know him. Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya.
29 I know him, because I am from him, and he sent me." Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.”
30 So they tried to grab him, but no one touched him, because his hour had not yet come. Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.
31 But many in the crowd believed in him, asking, "When the Christ comes, will he do more signs than this man did?" Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”
32 The Pharisees heard the crowd murmuring these things about him, so the chief priests and Pharisees sent temple guards to seize him. Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.
33 So Jesus said, "I'm with you a little while longer, and then I go to the one who sent me. Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m.
34 You will search for me and not find me; you cannot come where I am." Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”
35 So the Jewish leaders asked each other, "Where does he intend to go that we won't find him? Does he intend to go to our people dispersed among the Greeks and teach the Greeks? Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe?
36 What does he mean: 'You will look for me, but you will not find me,' and 'Where I am, you cannot come'?" Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”
37 On the last, great day of the festival, Jesus stood and called out, "Whoever is thirsty, let him come to me and drink. Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri.
38 Whoever believes in me, as Scripture said, rivers of living water will flow from his heart." Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.”
39 He said this about the Holy Spirit, whom believers in him were to receive; the Spirit had not yet been given, since Jesus had not yet been glorified. O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto.
40 When they heard these words, some of the crowd said, "This really is the Prophet." Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.”
41 Others said, "This is the Christ." But others asked, "How can the Christ come from Galilee? Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta?
42 Doesn't Scripture say the Christ comes from David's line and from Bethlehem, David's village?" Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?”
43 So the crowd was divided over him. Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya.
44 Some of them wanted to seize him, but no one laid a hand on him. Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.
45 So the temple guards returned to the chief priests and Pharisees, who asked, "Why didn't you bring him?" Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?”
46 The guards answered, "No one ever spoke the way this man does." Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.”
47 "Have you also been deceived?" the Pharisees answered. Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu?
48 "Has any of the rulers or of the Pharisees believed in him? Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi?
49 But this crowd, who knows nothing of the law—they are under a curse." E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
50 Nicodemus, who had gone to Jesus earlier and was one of their own number, asked them, Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha,
51 "Does our law condemn a man without first hearing him and finding out what he does?" “Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?”
52 They replied, "Are you from Galilee too? Search, and see: no prophet arises from Galilee." Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.”
53 Then they all went home. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]