1After this, Jesus crossed the Sea of Galilee, also called the Sea of Tiberias.OICBMgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas).
2A large crowd followed him, because they saw the signs he performed on the sick.OICBOke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa.
3Jesus went up on the mountainside and sat down there with his disciples.OICBJisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya.
4Now the Passover, the feast of the Jews, was near.OICBNʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso.
5Looking up, Jesus saw a large crowd approaching and asked Philip, "Where can we buy bread for these people to eat?"OICBMgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”
6He said this to test Philip, for he himself already knew what he was going to do.OICBỌ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme.
7Philip answered him, "200 days' wages of bread isn't enough for each of them to get a little."OICBFilip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.”
8One of his disciples, Andrew, Simon Peter's brother, said to him,OICBOnye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara,
9"A boy here has five barley loaves and two fish—but what's that for so many?"OICB“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?”
10Jesus said, "Have the people sit down." Much grass grew there, so about 5,000 men sat down.OICBJisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.
11Jesus then took the loaves, gave thanks, and distributed them to those seated; likewise with the fish, as much as they wanted.OICBYa mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.
12When they were full, he told his disciples, "Gather the leftover pieces, so nothing is lost."OICBMgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.”
13So they gathered the fragments left over from the five barley loaves after the people ate, filling twelve baskets.OICBYa mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.
14So when the people saw the sign he did, they said, "This really is the Prophet coming into the world!"OICBMgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”
15Knowing they meant to come and seize him to make him king, Jesus withdrew again to the mountain alone.OICBMgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.
16When evening came, his disciples went down to the sea,OICBMgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,
17got in a boat and headed across the sea to Capernaum. It was already dark, and Jesus had not yet reached them.OICBebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.
18A strong wind was blowing, and the sea grew rough.OICBEbili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.
19After rowing three or four miles, they saw Jesus walking on the water, approaching the boat, and were afraid.OICBHa akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha.
20But he said to them, "It is I; do not be afraid."OICBMa ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”
21So they were glad to take him into the boat, and instantly it reached the shore they were heading toward.OICBMgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.
22The next day, the crowd remaining on the far shore saw that only one boat had been there, that Jesus had not boarded it with his disciples, but that his disciples had gone off alone.OICBNʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ.
23Other boats came from Tiberias near the place where they ate bread after the Lord gave thanks.OICBMgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya.
24So when the crowd saw Jesus and his disciples weren't there, they got in boats and went to Capernaum to look for Jesus.OICBMa mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs.
25Finding him across the sea, they asked, "Rabbi, when did you get here?"OICBMgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?”
26Jesus answered them, "Truly, truly, I tell you: you seek me not because you saw signs, but because you ate the loaves and were filled.OICBJisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.
27Don't work for food that spoils, but for food that lasts to eternal life, which the Son of Man will give you. For on him our Father has set his seal."OICBUnu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”
28Then they said to him, "What must we do to be doing the works of our Father?"OICBMgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”
29Jesus answered them, "This is our Father's work: that you believe in the one he sent."OICBJisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”
30So they asked him, "What sign will you give, so we may see and believe you? What work will you do?OICBYa mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ?
31Our ancestors ate manna in the wilderness, as it is written: 'He gave them bread from heaven to eat.'"OICBNna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’”
32Jesus told them, "Truly, truly, I tell you: Moses didn't give you the bread from heaven—my Father gives you the true bread from heaven.OICBJisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe.
33For the bread of our Father is he who comes down from heaven and gives the world life."OICBNʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”
34So they said to him, "Lord, give us this bread always."OICBHa sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”
35Jesus told them, "I am the bread of life. Whoever comes to me will never hunger; whoever believes in me will never thirst.OICBJisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
36But as I told you, you have seen me and still do not believe.OICBMa agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
37All the Father gives me will come to me, and the one who comes to me I will never drive away.OICBOnye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.
38For I came down from heaven not to do my own will, but the will of him who sent me.OICBNʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m.
39This is the will of him who sent me: that I lose none of all he has given me, but raise them up on the last day.OICBNke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.
40For this is the will of my Father: that everyone who looks to the Son and believes in him should have eternal life, and I will raise them up on the last day."OICBNke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”
41So the Jews grumbled about him because he said, "I am the bread that came down from heaven."OICBNʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.”
42They said, "Isn't this Jesus, Joseph's son, whose father and mother we know? How can he now say, 'I have come down from heaven'?"OICBHa sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?”
43Jesus answered them, "Stop grumbling among yourselves.OICBJisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu.
44"No one can come to me unless the Father who sent me draws him, and I will raise him on the last day.OICBO nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.
45It is written in the Prophets: 'And they will all be taught by our Father.' Everyone who has heard and learned from the Father comes to me.OICBE dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’ Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.
46Not that anyone has seen the Father except the one from him; he has seen the Father.OICBO nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ.
47Truly, truly, I tell you, whoever believes has eternal life.OICBNʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi.
48I am the bread of life.OICBAbụ m achịcha nke ndụ.
49Your ancestors ate the manna in the wilderness, yet they died.OICBNna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ.
50This is the bread that comes down from heaven, so anyone may eat it and not die.OICBMa nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ.
51I am the living bread come down from heaven. Whoever eats this bread will live forever. The bread I will give is my flesh, for the life of the world."OICBAbụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.”
52Then the Jews argued sharply among themselves, "How can this man give us his flesh to eat?"OICBMgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?”
53Jesus told them, "Truly, truly, I tell you, unless you eat the flesh of the Son of Man and drink his blood, you have no life in yourselves.OICBJisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu.
54Whoever feeds on my flesh and drinks my blood has eternal life, and I will raise him on the last day.OICBOnye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ.
55For my flesh is true food, and my blood is true drink.OICBNʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ.
56Whoever feeds on my flesh and drinks my blood remains in me, and I in him.OICBOnye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya.
57As the living Father sent me and I live because of the Father, so whoever feeds on me will live because of me.OICBDị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.
58This is the bread that came down from heaven. It is not like the bread your ancestors ate and still died. Whoever feeds on this bread will live forever."OICBNke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
59He said these things while teaching in the synagogue at Capernaum.OICBO kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
60On hearing it, many of his disciples said, "This is a hard teaching. Who can accept it?"OICBMgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?”
61Aware that his disciples were grumbling about this, Jesus said to them, "Does this offend you?OICBEbe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu?
62"Then what if you see the Son of Man ascending to where he was before?OICBGịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ.
63The Spirit gives life; the flesh helps nothing. The words I have spoken to you are spirit and life.OICBỌ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.
64But some of you don't believe." For Jesus knew from the start who didn't believe, and who would betray him.OICBMa nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye.
65And he said, "This is why I told you: no one can come to me unless the Father enables him."OICBỌ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.”
66From this time many of his disciples turned back and no longer walked with him.OICBNʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.
67So Jesus asked the Twelve, "Do you want to leave too?"OICBJisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?”
68Simon Peter answered him, "Lord, to whom should we go? You have the words of eternal life.OICBSaimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
69We have believed and known you are the Holy One of our Father."OICBAnyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”
70Jesus answered them, "Have I not chosen you, the Twelve? Yet one of you is a devil."OICBJisọs zara ha, “Ọ bụghị m họpụtara unu mmadụ iri na abụọ? Ma otu onye nʼime unu bụ ekwensu!”
71He meant Judas, son of Simon Iscariot, one of the Twelve, who was about to betray him.OICBỌ na-ekwu banyere Judas nwa Saimọn Iskarịọt, onye nʼagbanyeghị na ọ bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ, bụ onye ga-arara ya nye.