Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After this there was a feast of the Jews, and Jesus went up to Jerusalem. Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem.
2 By the Sheep Gate in Jerusalem is a pool with five covered porches, called Bethesda in Aramaic. Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise.
3 In these lay a multitude of the sick—blind, lame, and paralyzed. Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị.
4 Not in this edition Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya.
5 One man was there who had been sick for thirty-eight years. Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ.
6 Seeing him lying there and knowing he had already been there a long time, Jesus asked, "Do you want to be healed?" Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?”
7 The sick man answered him, "Sir, I have no one to put me in the pool once the water stirs—while I'm on my way, someone else gets in first." Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.”
8 Jesus said to him, "Get up, take up your mat, and walk." Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.”
9 At once the man became well, picked up his mat, and walked. That day was the Sabbath. Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike.
10 So the Jews told the healed man, "It's the Sabbath—you're not allowed to carry your mat." Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.”
11 He answered them, "The man who healed me told me, 'Take up your mat and walk.'" Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’ ”
12 They asked him, "Who is the man who told you, 'Take it up and walk'?" Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?”
13 But the healed man didn't know who it was, since Jesus had slipped away into the crowd there. Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ.
14 Later Jesus found him in the temple and said, "You are healed now. Stop sinning, or something worse may happen to you." Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.”
15 The man went away and told the Jews that it was Jesus who had made him well. Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya.
16 And so the Jews began persecuting Jesus, because he was doing these things on the Sabbath. Ya mere, nʼihi na Jisọs na-eme ihe ndị a nʼụbọchị izuike, ndị Juu malitere isogbu ya.
17 But Jesus answered them, "My Father is working until now, and I too am working." Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.”
18 So the Jews sought even more to kill him: he not only broke the Sabbath but called our Father his own Father, making himself equal to him. Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.
19 So Jesus said to them, "Truly, truly, I tell you: the Son can do nothing on his own, but only what he sees the Father doing. Whatever the Father does, the Son does the same. Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa.
20 "For the Father loves the Son and shows him everything he does; he will show him greater works than these, so you will be amazed. Nʼihi na Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya nʼanya ma na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Nʼezie ọ ga-agbagwoju unu anya nʼihi na ọ ga-egosi ya ihe karịrị ndị a.
21 For as the Father raises the dead and gives life, so the Son too gives life to anyone he wants. Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla ọ masịrị ya ndụ.
22 For the Father judges no one, but has entrusted all judgment to the Son, Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara.
23 so everyone honors the Son as they honor the Father; whoever doesn't honor the Son doesn't honor the Father who sent him. Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.
24 Truly, truly, I tell you: whoever hears my word and believes the one who sent me has eternal life and won't face judgment—they have passed from death to life. “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ.
25 Truly, truly, I tell you, an hour comes, and is now here, when the dead will hear the voice of the Son of our Father, and those hearing will live. Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ.
26 For as the Father has life in himself, he gave the Son to also have life in himself. Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya.
27 And he has given him authority to execute judgment, because he is the Son of Man. O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ.
28 Don't be astonished at this—an hour is coming when everyone in the tombs will hear his voice, “Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya
29 and come out—those who did good, to the resurrection of life; those who did evil, to the resurrection of judgment. ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe.
30 By myself I can do nothing. I judge as I hear; my judgment is fair, because I seek not my own will but the will of the One who sent me. Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.
31 "If I testify about myself, my testimony is not valid. “Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu.
32 There is another who testifies about me, and I know his testimony about me is true. Enwere m onye ọzọ na-agbara m ama, amatakwara m na ama ya banyere m bụ eziokwu.
33 You sent messengers to John, and he has testified to the truth. “Unu zigaara Jọn ndị ozi, ọ gbakwaala ama maka eziokwu ahụ.
34 Not that I accept human testimony, but I say these things so that you may be saved. Ọ bụghị na m na-anabata ama nke mmadụ, kama a na m ekwu ya ka enwe ike ịzọpụta unu.
35 John was a burning, shining lamp, and you were willing to rejoice briefly in his light. Ọ bụ oriọna nke na-enwu na-amụkekwa, unu họrọkwara ịṅụrị ọṅụ nʼìhè ya nʼoge nta.
36 But I have testimony greater than John's: the works my Father gave me to finish—the very works I'm doing—testify that my Father sent me. “Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m.
37 And my Father who sent me has himself testified about me. You've never heard his voice or seen his form, Ya bụ Nna ahụ zitere m na-agbakwa ama nʼonwe ya banyere m. Unu anụbeghị olu maọbụ hụ ụdịdị ya.
38 and you don't have his word remaining in you, since you don't believe the one he sent. Okwu ya anọkwaghị nʼime unu nʼihi na unu ekweghị nʼonye o zitere.
39 You search the Scriptures, thinking they hold eternal life—yet they themselves testify about me, Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m.
40 yet you refuse to come to me so that you may have life. Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ.
41 I do not accept glory from people, “Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ.
42 but I know you—that you do not have the love of our Father within you. Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu.
43 I have come in my Father's name, and you don't receive me; if another comes in his own name, you'll receive him. Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya.
44 How can you believe, when you accept glory from one another and don't seek the glory from the only God? Olee otu unu ga-esi kwere ebe unu na-anara otuto site nʼaka ibe unu, ma unu adịghị achọ otuto nke si nʼaka onye naanị ya bụ Chineke?
45 Don't think I will accuse you before my Father. Moses, in whom you've hoped, accuses you. “Unu echela na m ga-ebo unu ebubo nʼihu Nna ahụ. Onye ga-ebo unu ebubo bụ Mosis, bụ onye unu tụkwasịrị obi na ya.
46 For if you believed Moses, you would believe me, because he wrote about me. Ọ bụrụ na unu kwenyeere Mosis, unu gakwara ekwere na m, nʼihi na o dere banyere m.
47 But if you do not believe his writings, how will you believe my words?" Ma ebe unu na-ekweghị nʼihe o dere, olee otu unu ga-esi kwere nʼihe m kwuru?”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]