Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So when Jesus knew the Pharisees heard he was making and baptizing more disciples than John. Ugbu a, Jisọs matara na ndị Farisii anụla na ọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya na-emekwa baptizim karịa Jọn.
2 (though Jesus himself was not baptizing, but his disciples were), Ma ọ bụkwaghị Jisọs na onwe ya na-eme baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim.
3 he left Judea and went back to Galilee. Ọ hapụrụ Judịa laghachi azụ na Galili.
4 And he had to pass through Samaria. Ma ọ ga-esite nʼetiti Sameria gafee.
5 So he came to a town of Samaria called Sychar, near the field Jacob gave his son Joseph. Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke.
6 Jacob's well was there. Jesus, tired from the trip, sat down at the well—about noon. Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie.
7 A woman of Samaria came to draw water. Jesus said to her, "Give me a drink." Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.”
8 (For his disciples had gone into the town to buy food.). (Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.)
9 The Samaritan woman said, "You're a Jew; why ask me, a Samaritan woman, for a drink?" (Jews don't associate with Samaritans.). Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.)
10 Jesus answered her, "If you knew our Father's gift, and who asks you, 'Give me a drink,' you'd have asked him, and he'd have given you living water." Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.”
11 The woman said to him, "Sir, you have nothing to draw with, and the well is deep. Where then do you get this living water? Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a.
12 Are you greater than our father Jacob, who gave us the well, drank from it himself, with his sons and livestock?" Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?”
13 Jesus said to her, "Everyone who drinks of this water will be thirsty again, Jisọs zara sị, “Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ.
14 but whoever drinks the water I give him will never thirst again; that water will become in him a spring of water welling up to eternal life." Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.”
15 The woman said to him, "Sir, give me this water, so I won't get thirsty or come here to draw water." Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.”
16 Jesus said to her, "Go, call your husband, and come back here." Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.”
17 The woman answered, "I have no husband." Jesus told her, "You're right to say you have no husband. Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.” Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di.
18 For you've had five husbands, and the man you have now isn't your husband. You've spoken the truth." I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.”
19 The woman said to him, "Sir, I see that you are a prophet. Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma.
20 Our fathers worshiped on this mountain, but you say Jerusalem is where people must worship." Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.”
21 Jesus told her, "Woman, believe me: an hour is coming when you'll worship the Father neither on this mountain nor in Jerusalem. Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem.
22 You worship what you don't know; we worship what we know—salvation comes from the Jews. Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu.
23 But a time is coming, and now is, when true worshipers worship the Father in spirit and truth—for the Father seeks such worshipers. Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.
24 The Father is spirit, and those who worship him must worship in spirit and truth." Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
25 The woman said to him, "I know Messiah—the one called Christ—is coming. When he comes, he will tell us everything." Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.”
26 Jesus said to her, "I am he—the one speaking to you." Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.”
27 Just then his disciples returned, amazed he was talking with a woman. Yet no one said, "What do you want?" or, "Why talk with her?" Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?”
28 So the woman left her water jar and went back to town and said to the people, Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ,
29 "Come, see a man who told me everything I ever did. Could this be the Christ?" “Bịanụ lee otu nwoke onye gwara m ihe niile m merela. Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst ahụ?”
30 They left the town and were coming to him. Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya.
31 Meanwhile the disciples were urging him, "Rabbi, eat." Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.”
32 But he said to them, "I have food to eat that you know nothing about." Ma ọ sịrị ha, “Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.”
33 So the disciples said to one another, "Has anyone brought him something to eat?" Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?”
34 Jesus said to them, "My food is doing the will of the one who sent me and finishing his work. Jisọs sịrị ha, “Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya.
35 Don't you say, 'Four months more, then harvest comes'? Look, I tell you: raise your eyes, see the fields—white for harvest. Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ.
36 Already the harvester earns wages, gathering fruit for eternal life, so that planter and harvester may rejoice together. Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ.
37 For here the saying holds true: 'One plants and another harvests.' Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’
38 I sent you to reap what you didn't work for. Others worked, and you have entered into their labor." E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.”
39 Many Samaritans from that town believed in him because of the woman's testimony: "He told me everything I ever did." Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.”
40 When the Samaritans came to him, they asked him to stay with them; he stayed two days. Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ.
41 And many more believed because of his word. Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya.
42 They told the woman, "It is no longer because of what you said that we believe—we've heard for ourselves, and we know this man truly is the Savior of the world." Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
43 After the two days he departed from there for Galilee. Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.
44 (For Jesus himself had testified that a prophet has no honor in his own hometown.). (Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.)
45 When he arrived in Galilee, the Galileans welcomed him, having seen all he did in Jerusalem at the feast—they too had gone to the feast. Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ.
46 He went again to Cana in Galilee, where he had turned water to wine. A royal official's son was sick at Capernaum. Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm.
47 Hearing that Jesus had come from Judea to Galilee, he went to him and begged him to come down and heal his son, who was about to die. Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.
48 So Jesus said to him, "Unless you people see signs and wonders, you will never believe." Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.”
49 The royal official said to him, "Sir, come down before my child dies." Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”
50 Jesus said to him, "Go; your son will live." The man believed what Jesus told him and left. Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa.
51 As he was going down, his servants met him and told him that his boy was living. Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma.
52 So he asked them the hour he improved, and they said, "Yesterday at the seventh hour, the fever left him." Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.”
53 So the father knew this was the hour when Jesus told him, "Your son will live." He and his whole household believed. Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.
54 This was now the second sign that Jesus did when he had come from Judea to Galilee. Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]