Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now there was a man of the Pharisees named Nicodemus, a ruler of the Jews. O nwere otu nwoke onyeisi ndị Juu nke so nʼotu ndị Farisii aha ya bụ Nikọdimọs.
2 This man came to Jesus at night and said, "Rabbi, we know you are a teacher who has come from our Father, for no one can do these signs you do unless our Father is with him." Ọ bịakwutere ya nʼabalị sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere na Chineke, nʼihi na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịrụ ọrụ ebube dị otu a ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”
3 Jesus answered, "Truly, truly, I tell you: unless someone is born from above, he can't see the kingdom of our Father." Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.”
4 Nicodemus asked, "How can a man be born when he's old? Can he enter his mother's womb again and be born?" Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?”
5 Jesus answered, "Truly, truly, I tell you, unless one is born of water and the Holy Spirit, he can't enter our Father's kingdom. Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke.
6 Born of the flesh is flesh, and born of the Holy Spirit is spirit. Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ.
7 Don't be amazed that I said to you, 'You must be born from above.' Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’
8 Wind blows where it wants; you hear its sound but don't know where it comes from or where it goes. So it is with everyone born of the Spirit." Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.”
9 Nicodemus said to him, "How can these things be?" Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?”
10 Jesus answered him, "Are you the teacher of Israel and yet you do not understand these things? Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a?
11 Truly, truly, I tell you: we speak what we know, we testify to what we've seen, yet you don't accept our testimony. Nʼezie, nʼezie agwa m unu. Anyị na-ekwu banyere ihe anyị maara, na-akọwapụtakwa ihe anyị hụrụ, ma unu onwe unu adịghị anabata akaebe anyị.
12 If I told you earthly things and you don't believe, how will you believe if I tell you heavenly things? Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe?
13 No one has ascended into heaven except the one who descended from heaven, the Son of Man. O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata.
14 As Moses lifted up the serpent in the wilderness, so the Son of Man must be lifted up, Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu.
15 that whoever believes in him may have eternal life. Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.”
16 For our Father so loved the world that he gave his one and only Son, that whoever believes in him will not perish but have eternal life. Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
17 For our Father did not send his Son into the world to condemn the world, but so the world could be saved through him. Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.
18 Whoever believes in him isn't condemned; whoever doesn't believe is condemned already, for not believing in the name of the one and only Son of our Father. Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.
19 This is the judgment: light has entered the world, and people loved darkness more than light because their deeds were evil. Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ.
20 Everyone who does evil hates the light and won't come to the light, so that his deeds aren't exposed. Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè.
21 But whoever does the truth comes to the light, so it may be revealed that his works have been done in our Father." Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.
22 After this, Jesus and his disciples went into the Judean countryside, where he stayed with them, baptizing. Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime obodo Judịa, ebe ọ nọtụrụ nwa oge, meekwa baptizim.
23 John also baptized at Aenon near Salim, since water was plentiful there, and people came and were baptized, Nʼotu aka ahụ, Jọn nọkwa nʼọnụ mmiri Enọn dị nso na Salim na-eme baptizim nʼihi na mmiri buru ibu nʼebe ahụ, ndị mmadụ gakwara nʼihu na-abịakwute ya, ọ na-emekwa ha baptizim.
24 for John had not yet been put in prison. E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ.
25 Now a discussion arose between some of John's disciples and a Jew over purification. Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha.
26 They came to John and said, "Rabbi, the man with you beyond the Jordan, the one you testified about—he's baptizing, and everyone goes to him." Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.”
27 John replied, "A person cannot receive even one thing unless it is given him from heaven. Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe.
28 You yourselves can testify: I said 'I'm not the Christ, but sent ahead of him.' Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa.
29 The one with the bride is the bridegroom—Jesus. The bridegroom's friend, who stands and hears him, rejoices greatly at the bridegroom's voice. So my joy is now complete. Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a.
30 He must increase, but I must decrease." Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala.
31 The one who comes from above is above all. The one from earth belongs to earth and speaks in an earthly way. The one who comes from heaven is above all. “Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile.
32 He bears witness to what he has seen and heard, yet no one receives his testimony. Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya.
33 Whoever receives his testimony confirms that our Father is true. Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu.
34 The one our Father sent speaks our Father's words, for he gives the Holy Spirit without measure. Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju.
35 Our Father loves the Son and has given all things into his hand. Nna hụrụ Ọkpara ya nʼanya, o tinyekwala ihe niile nʼaka ya.
36 Whoever believes in the Son has eternal life; whoever disobeys the Son won't see life—our Father's wrath remains on him. Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]