Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 On the third day, a wedding took place in Cana of Galilee; Jesus's mother was there. Nʼụbọchị nke atọ, o nwere mmemme agbamakwụkwọ na Kena nke Galili, nne Jisọs bịakwara ebe ahụ.
2 Jesus and his disciples were also invited to the wedding. A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oku na mmemme agbamakwụkwọ a.
3 When the wine ran out, the mother of Jesus said to him, "They have no wine." Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, “Ha enweghị mmanya.”
4 "Woman, why are you bringing me into this?" Jesus replied. "My hour has not yet come." Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị.”
5 His mother said to the servants, "Do whatever he tells you." Nne ya gwara ndị na-eje ozi, “Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya.”
6 Six stone water jars stood there, used for Jewish purification, each holding twenty to thirty gallons. A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.
7 Jesus said to them, "Fill the jars with water," so they filled them to the brim. Jisọs gwara ha, “Gbajuonụ ite ndị a mmiri.” Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri.
8 He told them, "Draw some out now, and take it to the head steward." So they did. Mgbe ahụ, ọ gwara ha, “Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche.” Ha mekwara nke a.
9 The master of the banquet tasted the water now wine, not knowing its source—though the servants who drew it knew. So he called the bridegroom aside, Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche
10 and said, "Everyone serves the good wine first, then the lesser once guests are drunk. But you've kept the good wine till now." sị ya, “Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a.”
11 Jesus performed this first sign at Cana in Galilee. He revealed his glory, and his disciples believed in him. Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.
12 After this he went down to Capernaum with his mother, brothers, and disciples, and stayed there a few days. Mgbe nke a gasịrị, ọ gara Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya, nakwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ụbọchị ole na ole nʼebe ahụ.
13 When the Jewish Passover was near, Jesus went up to Jerusalem. Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem.
14 In the temple courts he found sellers of cattle, sheep, and doves, and others sitting at tables exchanging money. Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego.
15 He made a whip of cords and drove them all out of the temple courts, sheep and cattle alike, poured out the money-changers' coins, and overturned their tables. Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu.
16 To the dove sellers he said, "Take these out of here! Don't make my Father's house a marketplace." Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru, “Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ebe a na-azụ ahịa.”
17 His disciples remembered that it is written: "Zeal for your house will consume me." Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, “Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi.”
18 So the Jews asked, "What sign will you show us for doing these things?" Ma ndị Juu sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị pụrụ igosi anyị na ikike i ji eme ihe ndị a.”
19 Jesus answered them, "Destroy this temple, and in three days I will raise it up." Jisọs zara sị, “Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.”
20 They replied, "This temple took forty-six years to build, and will you raise it in three days?" Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?”
21 But the temple he had spoken of was his body. Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya.
22 After he rose from the dead, his disciples remembered he had said this, and believed the Scripture and the word Jesus had spoken. Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru.
23 While he was in Jerusalem at the Passover, many saw the signs he did and trusted in his name. Mgbe ọ nọ na Jerusalem nʼoge Mmemme Ngabiga, ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe ịrịbama o mere kweere na ya.
24 But Jesus would not entrust himself to them, for he knew all people. Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nʼihi na ọ matara mmadụ niile nke ọma.
25 He didn't need anyone's testimony about people—he knew what was in each one. Ọ dịghị ya mkpa ka onye ọbụla gbaa akaebe banyere ụmụ mmadụ, nʼihi na ya onwe ya maara ihe dị nʼime mmadụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]