Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In the beginning was the Word, and the Word was with our Father, and the Word was God. Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke.
2 He was in the beginning with our Father. Ya na Chineke nọ site na mbụ.
3 All things were made through him, and without him not one thing was made that was made. E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.
4 In him was life, and the life was the light of all people. Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile,
5 The light shines in the darkness, and the darkness has not overcome it. ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya.
6 There came a man sent from our Father, whose name was John. Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn.
7 He came as a witness, to bear witness about the light, so that all might believe through John's witness. Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere.
8 He was not the light, but came to bear witness about the light. Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ.
9 The true light, which gives light to everyone, was coming into the world. Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa.
10 He was in the world. The world came into being through him, yet did not know him. Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ.
11 He came to his own, and his own people did not receive him. Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya.
12 But to all who received him, believing in his name, he gave the right to become children of our Father, Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke.
13 children born not of blood nor of the will of flesh nor of the will of man, but of our Father. Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.
14 The Word became flesh and lived among us. We saw his glory, the glory of the one and only Son from the Father, full of grace and truth. Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.
15 John testified about him, crying out, "This is the one I meant: he who comes after me outranks me, since he existed before me." Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ ”
16 For from his fullness we have all received, grace upon grace. Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara.
17 For the law was given through Moses; grace and truth came through Jesus Christ. Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst.
18 No one has ever seen our Father; the one and only God, close beside the Father, has made him known. Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.
19 This is John's testimony, when the Jews sent priests and Levites from Jerusalem to ask him, "Who are you?" Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ?
20 He confessed, and did not deny, but confessed, "I am not the Christ." O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.”
21 So they asked him, "What then? Are you Elijah?" "I am not," he said. "Are you the Prophet?" "No," he answered. Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.”
22 So they asked, "Who are you? We need to give an answer to those who sent us. What do you say about yourself?" Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?”
23 He said, "I'm the voice of one crying out in the wilderness, 'Make straight the way of the Lord,' as the prophet Isaiah said." Ọ sịrị, dịka Aịzaya onye amụma kwuru, “Abụ m onye na-eti mkpu nʼime ọzara, ‘Meenụ ka ụzọ Onyenwe anyị guzozie.’ ”
24 Now they had been sent from the Pharisees. Ma ndị Farisii ahụ ezitere
25 They asked him, "Why baptize, then, if you're not the Christ, nor Elijah, nor the Prophet?" jụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji na-eme baptizim ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst maọbụ Ịlaịja, maọbụ onye amụma ahụ?”
26 John answered them, "I baptize with water, but among you stands one you do not know, Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ dị otu onye nọ nʼetiti unu nke unu na-amaghị.
27 even he who comes after me, whose sandal strap I am not worthy to untie." Onye ahụ nke na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.”
28 These things took place in Bethany across the Jordan, where John was baptizing. Ihe a mere na Betani nʼofe osimiri Jọdan bụ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.
29 The next day, seeing Jesus coming toward him, he said, "Look! The Lamb of our Father—Jesus—who takes away the sin of the world! Nʼechi ya, ọ hụrụ ka Jisọs na-abịakwute ya sị, “Leekwa, Nwa Atụrụ Chineke, onye na-ebupụ mmehie ụwa.
30 This is the one I meant: 'After me comes a man who ranks before me, because he was before me.' Ọ bụ onye a ka m kwuru okwu ya mgbe ahụ m sịrị, ‘otu nwoke na-abịa nʼazụ m, onye dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’
31 I didn't know him, but I came baptizing with water so he would be revealed to Israel." Mụ onwe m amataghị ya, ma a bịara m were mmiri na-eme baptizim nʼihi nke a, ka e kpughee ya nye ndị Izrel.”
32 John testified: "I saw the Holy Spirit descend from heaven like a dove and remain on him. Mgbe ahụ Jọn gbara ama a sị, “Ahụrụ m ka Mmụọ Nsọ sitere nʼeluigwe rịdata dị ka nduru, nọkwasị ya.
33 I didn't know him, but the one who sent me to baptize with water told me, 'The one you see the Holy Spirit come down and stay on—he is the one who baptizes with the Holy Spirit.' Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’
34 And I have seen and have borne witness that this is the Son of our Father." Mụ onwe m ahụla ya, na-agbakwa ama na onye a bụ Ọkpara Chineke.”
35 The next day John was standing again with two of his disciples, Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ.
36 and looking at Jesus as he walked by, he said, "Look! The Lamb of our Father!" Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.”
37 The two disciples heard him say this, and they followed Jesus. Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs.
38 Jesus turned, saw them following, and asked, "What do you seek?" They said, "Rabbi" (meaning Teacher), "where do you stay?" Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?” Ha sịrị ya, “Rabbi” (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?”
39 He told them, "Come and you will see." So they went and saw where he was staying, and remained with him that day—about four in the afternoon. Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede.
40 One of the two who heard John speak and followed Jesus was Andrew, Simon Peter's brother. Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita.
41 He first found his own brother Simon and told him, "We've found the Messiah" (meaning Christ). Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst).
42 He brought him to Jesus. Jesus looked at him and said, "You are Simon the son of John. You will be called Cephas" (meaning Peter). Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).
43 The next day, Jesus decided to leave for Galilee. He found Philip and said, "Follow me." Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.”
44 Now Philip was from Bethsaida, the city of Andrew and Peter. Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita.
45 Philip found Nathanael and told him, "We've found the one Moses wrote of in the Law and the prophets—Jesus, son of Joseph, from Nazareth." Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.”
46 Nathanael said, "Can anything good come from Nazareth?" Philip said, "Come and see." Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?” Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.”
47 Jesus saw Nathanael approaching and said of him, "Look—a true Israelite, with no deceit in him!" Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.”
48 Nathanael asked him, "How do you know me?" Jesus answered, "Before Philip called you, while you were under the fig tree, I saw you." Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.”
49 Nathanael answered him, "Rabbi, you are the Son of our Father! You are the King of Israel!" Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”
50 Jesus answered him, "You believe because I told you I saw you under the fig tree? You'll see greater things than these." Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.”
51 He told him, "Truly, truly, I say to you, you will see heaven opened, and our Father's angels ascending and descending on the Son of Man." Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]