Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now, before the Passover festival, Jesus knew his hour had come to leave this world to his Father. Having loved his own in the world, he loved them to the end. Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. Ọ hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ.
2 During supper, the devil had already put into Judas son of Simon Iscariot's heart the plan to betray Jesus. Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka ọ rara ya nye.
3 Jesus, knowing that the Father had given everything into his hands, and that he had come from him and was returning to him, Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke.
4 rose from supper, took off his outer clothes, picked up a towel, and tied it around his waist. Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya.
5 Then he poured water into a basin and began washing the disciples' feet, drying them with the towel tied around him. Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha.
6 He came to Simon Peter, who said to him, "Lord, are you going to wash my feet?" Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, “Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?”
7 Jesus answered him, "You do not realize now what I am doing, but later you will understand." Ma Jisọs zara sị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya.”
8 "You will never wash my feet," Peter said. Jesus answered, "Unless I wash you, you share nothing with me." Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.”
9 Simon Peter said to him, "Lord, not only my feet, but also my hands and head!" Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama saakwa aka m na isi m.”
10 Jesus told him, "One who has bathed needs only to wash his feet—he is fully clean. You are clean, but not all of you." Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.”
11 He knew who would betray him; that's why he said, "Not all of you are clean." Nʼihi na ọ maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.”
12 After washing their feet and dressing, he reclined again and said to them, "Do you understand what I have done for you? Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu?
13 You call me Teacher and Lord, and rightly so, for that is what I am. Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ.
14 So if I, your Lord and Teacher, washed your feet, you too must wash each other's feet. Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu.
15 For I have given you an example, that you should do as I have done for you. Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu.
16 Truly, truly, I say to you, a servant isn't greater than his master, nor a messenger greater than his sender. Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi.
17 If you know these things, you are blessed if you do them. Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.
18 "I don't mean all of you—I know those I've chosen. But Scripture must be fulfilled: 'The one eating my bread has raised his heel against me.' “Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ‘Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.’
19 I tell you now, before it happens, so you'll believe, once it happens, that I AM. “Ana m agwa unu ugbu a tupu ihe ndị a emee, ka unu kwere na mụ bụ ya mgbe ọ ga-emezu.
20 Truly, truly, I tell you, whoever welcomes someone I send welcomes me, and whoever welcomes me welcomes the one who sent me." Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla nabatara onye m zitere nabatara m. Onye ọbụla nabatara m nabatakwara onye zitere m.”
21 After saying this, Jesus, troubled in spirit, testified, "Truly, truly, I tell you, one of you will betray me." Mgbe Jisọs kwusiri ihe ndị a, o nweghị udo nʼime mmụọ ya. Ọ gbara ama sị, “Nʼezie, nʼezie, a sị m unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”
22 The disciples looked at one another, at a loss to know which of them he meant. Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nʼime obi ha onye ọ na-ekwu maka ya.
23 One of his disciples, the one Jesus loved, was reclining at his side. Otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya dabere ya nso.
24 So Simon Peter motioned to him to ask which one Jesus meant. Saimọn Pita fufeere ya isi, ka ọ, Jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya.
25 Leaning back against Jesus, he asked him, "Lord, who is it?" Ebe ọ dabere Jisọs nso, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?”
26 Jesus answered, "It's the one I'll give this bread to, once I've dipped it." Then he dipped the bread and gave it to Judas, son of Simon Iscariot. Jisọs zara, “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri.” Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt.
27 After Judas took the bread, Satan entered into him. So Jesus told him, "Do quickly what you're doing." Mgbe ọ narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọbụla ị chọrọ ime, mee ya ngwangwa.”
28 But no one reclining at the table understood why he said this to him. Ma ọ dịghị onye ọbụla so nọrọ nʼoche nri ghọtara ihe mere o ji gwa ya otu a.
29 Since Judas held the money bag, some thought Jesus meant, 'Buy what we need for the feast,' or, 'Give something to the poor.' Nʼihi na ụfọdụ na-eche, ebe Judas ji akpa ego ha, Jisọs na-asị ya ka ọ gaa zụta ihe ndị dị mkpa maka mmemme, maọbụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ihe.
30 As soon as Judas had taken the bread, he went out. And it was night. Mgbe ọ natachara iberibe achịcha ahụ, ọ pụrụ na-atụfughị oge, ọchịchịrị agbaala.
31 After Judas left, Jesus said, "Now the Son of Man is glorified, and my Father is glorified in him. Mgbe ọ pụrụ, Jisọs sịrị, “Ugbu a ka a na-enye Nwa nke Mmadụ otuto, a na-enyekwa Chineke otuto nʼime ya.
32 If my Father is glorified in him, my Father will also glorify the Son in himself and glorify him immediately. Ọ bụrụ na e nye Chineke otuto nʼime ya, Chineke ga-enyekwa Ọkpara ya otuto nʼime onwe ya, ọ ga-enyekwa ya otuto ahụ ngwangwa.
33 Dear children, I'm with you a little longer. You'll look for me, and as I told the Jewish leaders, so I tell you now: where I'm going, you can't come. “Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m, ma dị ka m gwara ndị Juu ka m na-agwa unu ugbu a. Ebe m na-aga unu enweghị ike ịbịa ya.
34 I give you a new command: love one another. As I have loved you, so you must love one another. “Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya.
35 By this everyone will know that you are my disciples, if you love one another." Ọ bụrụ na unu ahụrịta onwe unu nʼanya, otu a ka mmadụ niile ga-esi mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”
36 Simon Peter said to him, "Lord, where are you going?" Jesus answered, "Where I'm going you can't follow me now, but you'll follow later." Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị ebee ka ị na-aga?” Jisọs zaghachiri ya, “Ebe m na-aga, i nweghị ike iso m gaa ya ugbu a. Ma ị ga-abịa ma emesịa.”
37 Peter asked, "Lord, why can't I follow you now? I'll lay down my life for you." Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, gịnị mere na m apụghị isoro gị ugbu a? Aga m atọgbọ ndụ m nʼihi gị.”
38 Jesus replied, "You will lay down your life for me? Truly, truly, I tell you: the rooster won't crow until you have denied me three times." Jisọs zaghachiri, “I jikeere ịtọgbọ ndụ gị nʼihi m? Nʼezie, nʼezie, asị m gị, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]