Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 14 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "Do not let your hearts be troubled. Believe in our Father; believe also in me. “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.
2 In my Father's house are many rooms. If it were not so, would I have told you that I am going to prepare a place for you? Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi?
3 And if I go and prepare a place for you, I'll come back and take you to myself, so you'll be where I am. Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ.
4 And you know the way to where I am going." Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”
5 Thomas said to him, "Lord, we don't know where you're going—how can we know the way?" Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?”
6 Jesus told him, "I am the way, and the truth, and the life. No one comes to the Father except through me. Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.
7 Had you known me, you would have known my Father too. Starting now, you know him and have seen him." Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.”
8 Philip said to him, "Lord, show us the Father, and that will be enough for us." Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.”
9 Jesus said, "Philip, I've been with you this long, and you don't know me? Whoever has seen me has seen the Father. How can you say, 'Show us the Father'? Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’
10 Don't you believe I'm in the Father, and the Father in me? The words I speak to you aren't my own—the Father living in me does his works. Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya.
11 Believe me: I'm in the Father, the Father in me—or else believe because of the works themselves. Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a.
12 Truly, truly, I tell you, whoever believes in me will do the works I do, and will do even greater works, because I am going to the Father. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m.
13 Whatever you ask in my name, I will do it, so the Father may be glorified in the Son. Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya.
14 If you ask me anything in my name, I will do it. Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.
15 "If you love me, you will keep my commandments. “Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile.
16 And I will ask the Father, and he will give you another Helper, the Holy Spirit, to be with you forever, Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi.
17 the Spirit of truth, whom the world cannot receive, since it neither sees him nor knows him. But you know him, since he remains with you and will be in you. Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu.
18 I will not leave you as orphans; I will come to you. Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
19 Soon the world won't see me anymore, but you will see me. Because I live, you will live too. Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ.
20 On that day you'll know: I'm in my Father, you in me, and I in you. Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu.
21 Whoever has my commandments and keeps them loves me, and my Father will love whoever loves me. I will love him and show myself to him." Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.”
22 Judas, not Iscariot, asked, "Lord, why show yourself to us and not to the world?" Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”
23 Jesus replied, "Anyone who loves me will keep my word, and my Father will love that person, and we will come to them and make our home with them. Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri.
24 Whoever doesn't love me doesn't keep my words. And the word you hear isn't mine but the Father's who sent me. Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.
25 I have spoken these things to you while I am still with you. “Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ.
26 But the Helper, the Holy Spirit, whom the Father will send in my name, will teach you everything and remind you of everything I said to you. Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.
27 Peace I leave you; my own peace I give you. Not as the world gives, I give it. Don't let your hearts be troubled or afraid. Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
28 You heard me say to you, 'I'm going away, and I'm coming to you.' If you loved me, you'd have rejoiced, because I'm going to the Father, for the Father is greater than I. “Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m.
29 And now I've told you before it happens, so that when it happens you'll believe. Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere.
30 I won't talk with you much longer—this world's ruler is coming. He has no hold on me, Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nʼihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. O nwekwaghị ike ọbụla nʼebe m nọ.
31 but I do exactly as the Father commanded me, so the world may know I love the Father. Get up, let's leave this place." Ana m eme dịka Nna m nyere m nʼiwu, ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nʼanya. “Bilienụ ugbu a ka anyị si ebe a pụọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]