Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 15 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "I am the true vine, and my Father is the gardener. “Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi.
2 Every branch in me not bearing fruit, he removes; and every one bearing fruit, he prunes, so it bears more fruit. Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ.
3 You are already clean because of the word I have spoken to you. Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu.
4 Remain in me, and I in you. As a branch can't bear fruit alone, unless it remains in the vine, neither can you unless you remain in me. Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m.
5 I am the vine, you the branches. Whoever remains in me, and I in them, bears much fruit, for apart from me you can do nothing. “Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla.
6 Anyone not remaining in me is thrown out like a branch and withers; branches are gathered, thrown into the fire, and burned. Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa.
7 If you remain in me and my words remain in you, ask whatever you want, and it will happen for you. Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.
8 This is how my Father is glorified: that you bear much fruit and prove to be my disciples. Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.
9 "As the Father has loved me, so I have loved you. Remain in my love. “Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m.
10 If you keep my commands, you will remain in my love, as I have kept my Father's commands and remain in his love. Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya.
11 I've told you this so my joy may be in you, and your joy be complete. Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke.
12 "This is my command: love one another as I have loved you. Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya.
13 No one has greater love than this: to lay down one's life for one's friends. Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya.
14 You are my friends if you do what I command you. Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu.
15 I no longer call you servants—a servant doesn't know what his master does. I call you friends, since I've made known to you everything I heard from my Father. Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m.
16 You didn't choose me—I chose you and placed you to go, bear fruit that lasts, so whatever you ask the Father in my name, he'll give you. Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m.
17 This is my command to you: love one another. Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.
18 "If the world hates you, know that it hated me first. “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị.
19 If you were of the world, the world would love you as its own. But you are not of the world; instead, I chose you out of the world, so the world hates you. A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị.
20 Remember what I told you: a servant isn't greater than his master. If they persecuted me, they'll persecute you too; if they kept my word, they'll keep yours too. Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.
21 But they'll do all this to you because of my name, since they don't know the one who sent me. Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m.
22 Had I not come and spoken to them, they would have no sin; now they have no excuse for their sin. Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha.
23 Whoever hates me hates my Father as well. Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị.
24 Had I not done among them the works no one else did, they would have no sin. But now they have seen and hated both me and my Father. A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị.
25 But this happened to fulfill what is written in their Law: 'They hated me without cause.' Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’
26 "When the Helper comes, whom I will send you from the Father—the Spirit of truth proceeding from the Father—he will testify about me. “Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m.
27 "And you also must testify, because you have been with me from the beginning." Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]