Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 16 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "I have told you all this so that you will not fall away. “Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda.
2 They will expel you from synagogues; but the hour is coming when whoever kills you will think he offers a service to God. Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.
3 They will do this because they have not known the Father or me. Ha ga-eme ihe ndị a nʼihi na ha amaghị Nna maọbụ m.
4 But I've told you this so that when their hour comes, you'll remember I told you. I didn't tell you this from the start, because I was with you. Ana m agwa unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ na mgbe oge ga-eru, unu echeta na m gwara unu. Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ nʼihi na mụ na unu nọ mgbe ahụ.
5 "But now I'm going to him who sent me, and none of you asks me, 'Where are you going?' Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ma ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu jụrụ m, ‘Olee ebe ị na-aga?’
6 Instead, because I have said these things to you, sorrow has filled your heart. Ma nʼihi na m gwara unu ihe ndị a, obi unu ejupụtala na mwute.
7 I tell you the truth: my going is for your good. If I don't go, the Helper, the Holy Spirit, won't come to you. But if I go, I will send him to you. Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya.
8 And when he comes, he will convict the world concerning sin and righteousness and judgment: Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe,
9 concerning sin, because they do not believe in me; maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m;
10 concerning righteousness, because I am going to my Father and you will see me no longer; ma gbasara ezi omume, nʼihi na ana m alakwuru Nna, ebe unu na-apụghị ịhụ m ọzọ,
11 concerning judgment, because the ruler of this world has been judged. maka ikpe, nʼihi na e kpeela onyeisi ụwa a ikpe.
12 "I still have many things to say to you, but you cannot bear them now. “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a, unu agaghị anabatalị ha.
13 But when he, the Spirit of truth, comes, he will guide you into all truth. He won't speak on his own, but will speak whatever he hears, and will tell you what is coming. Ma mgbe Mmụọ eziokwu ahụ bịara, ọ ga-eduba unu nʼeziokwu niile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya, kama ọ bụ ihe niile ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe niile gaje ịbịa.
14 He will glorify me, for he will take what is mine and tell it to you. Ọ ga-enye m otuto, nʼihi na ọ ga-esite nʼaka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu.
15 All my Father has is mine; that's why I said he takes from what is mine and will tell you. Ihe niile Nna nwere bụ nke m. Ọ bụ ya mere m ji sị, na ọ ga-ewere site nʼihe bụ nkem, kọwara ya unu.
16 "Soon you'll no longer see me; then soon again you'll see me." “Ọ fọdụrụ nwantakịrị oge unu agaghị ahụkwa m. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ.”
17 So some of his disciples asked each other, "What does he mean: 'In a little while you will not see me, and then in a little while you will see me,' and, 'Because I am going to the Father'?" Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka o bu nʼuche mgbe ọ na-asị, ‘Nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma mgbe nwa oge gasịkwara unu ga-ahụkwa m,’ na ‘Nʼihi na ana m alakwuru Nna’?”
18 So they kept saying, "What does he mean, 'a little while'? We don't know what he's talking about." Ha na-asị, “Gịnị ka okwu a pụtara bụ ‘nwa oge nta’? Anyị aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.”
19 Jesus knew they wanted to ask him, so he said to them, "Are you asking each other what I meant by saying, 'In a little while you will not see me, and then a little while you will see me'? Jisọs matara na ha chọrọ ịjụ ya ihe banyere nke a, nʼihi ya ọ sịrị ha, “Unu na-ajụrịta onwe unu ihe okwu m pụtara mgbe m sịrị, ‘Na nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma nwa mgbe nta unu ga-ahụkwa m’?
20 "Truly, truly, I tell you: you will weep and mourn, but the world rejoices. You'll grieve, but your grief will become joy. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, unu ga-akwa akwa ma nwekwa obi mwute, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma iru ụjụ unu ga-aghọrọ unu ọṅụ.
21 A woman in labor has pain because her hour has come; but once she gives birth, she forgets the anguish, because she is joyful that a person has been born into the world. Mgbe ime na-eme nwanyị, ọ na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa.
22 So you also have sorrow now, but I will see you again, and your heart will rejoice, and no one will take your joy from you. Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu.
23 In that day you will ask me nothing. Truly, truly, I tell you: whatever you ask my Father in my name, he will give you. Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu.
24 Until now you've asked nothing in my name. Ask, and you will receive, so your joy may be complete. Ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nʼaha m. Rịọọnụ, unu ga-arịọta, ka ọṅụ unu zukwaa oke.
25 I've told you these things in figures. The hour is coming when I'll no longer speak in figures, but tell you plainly about my Father. “Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m na-agaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu niile ihe banyere Nna m nʼụzọ unu ga-aghọta ya.
26 That day you'll ask in my name, and I'm not telling you I'll ask my Father on your behalf; Nʼụbọchị ahụ, unu ga-arịọ ihe nʼaha m. Asịghị m unu na m ga-arịọ Nna ihe nʼihi unu.
27 for the Father himself loves you, because you've loved me and believed I came from our Father. Nʼihi na Nna m nʼonwe ya hụrụ unu nʼanya, nʼihi na unu hụrụ m nʼanya kwerekwa na m si nʼebe Chineke nọ bịa.
28 I came from my Father and entered the world; again, I leave the world, going to my Father." Esi m nʼebe Nna nọ pụta, bịa nʼime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru Nna.”
29 His disciples said, "Now you are speaking plainly and not using any figure of speech! Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee, ugbu a ka okwu gị doro anya. Ọ bụkwaghị ilu ka i na-atụ.
30 Now we know you know everything and need no one to ask you questions; so we believe you came from our Father." Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe niile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọbụla jụọ gị ihe ọbụla. Nʼihi nke a, anyị kwere na i si nʼebe Chineke nọ bịa.”
31 Jesus replied, "Do you now believe? Jisọs zara ha, “Unu ekwerela ugbu a?
32 "See, the hour is coming—has come—when you'll be scattered, each to his own home, leaving me alone. Yet I'm not alone; my Father is with me. Lee! Oge na-abịa, oge ahụ eruola, mgbe unu ga-agbasacha. Onye ọbụla nʼụlọ nke ya. Mgbe ahụ, unu ga-ahapụ naanị m, ma ọ bụghị naanị m nọ nʼihi na mụ na Nna m nọ.
33 I've told you this so you may have peace in me. In the world you'll face trouble, but take heart—I've overcome the world." “Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]