Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After saying this, Jesus looked up to heaven and said: "Father, the hour has come. Glorify your Son, so the Son may glorify you, Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto.
2 since you gave him authority over all people, to give eternal life to all you gave him. I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi.
3 This is eternal life: that they know you, the only true Father, and Jesus Christ whom you sent. Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa.
4 I glorified you on the earth, having finished the work you gave me to do. Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ.
5 Father, glorify me now with yourself, with the glory I had with you before the world existed. Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa.
6 I revealed your name to those you gave me from the world. They were yours; you gave them to me, and they have kept your word. “Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị.
7 Now they know that everything you have given me is from you, Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa.
8 for I gave them the words you gave me; they received them, truly knew I came from you, and believed you sent me. Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m.
9 I pray for them, not for the world, but for those you gave me, since they are yours. Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị.
10 Everything mine is yours, and yours is mine, and I am glorified in them. Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè.
11 I'm no longer in the world, but they are in the world, and I'm coming to you. Holy Father, keep them in your name, the name you gave me, so they may be one as we are. Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.
12 While with them, I kept them in your name you gave me. I guarded them—none was lost except the son of destruction, so Scripture would be fulfilled. Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru.
13 Now I come to you, and I say these things in the world so they may have my joy completed in themselves. “Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha.
14 I've given them your word; the world hated them, since they're not of the world, just as I'm not of the world. Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa.
15 I don't ask you to remove them from the world, but to guard them from the evil one. Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ.
16 They are not of the world, just as I am not of the world. Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa.
17 Make them holy by truth; your word is truth. Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu.
18 As you sent me into the world, so I have sent them into the world. Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa.
19 For them I make myself holy, so they too may be made holy in truth. Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu.
20 I pray not only for these, but also for those who will believe in me through their word. “Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha.
21 Father, let them all be one, as you're in me and I in you, so they're in us too, and the world believes you sent me. Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m.
22 The glory you have given me, I have given them, so they may be one as we are one. Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu;
23 I in them and you in me, so they may be made completely one, so the world may know you sent me and loved them as you loved me. Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya.
24 Father, I want those you gave me to be with me where I am, to see my glory, which you gave me because you loved me before the world was made. “Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa.
25 Righteous Father—the world doesn't know you, but I know you, and these know you sent me. “Nna onye ezi omume, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Ndị a matakwara na ọ bụ gị zitere m.
26 I have made your name known to them, and will keep making it known, so the love you loved me with may be in them, and I in them." Emekwara m ka ha mara aha gị. Aga m agakwa nʼihu ime ka ha mara ya. Ka ịhụnanya ahụ i nwere nʼebe m nọ dịgide nʼime ha, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime ha.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]