Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 18 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After saying these things, Jesus went out with his disciples across the Kidron Valley, where a garden stood; he and his disciples entered it. Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya.
2 Judas the betrayer knew the place too, since Jesus often gathered there with his disciples. Judas, onye rara ya nye matakwara ebe ahụ. Nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ ọtụtụ oge.
3 So Judas came there with a detachment of soldiers and officers from the chief priests and Pharisees, carrying lanterns, torches, and weapons. Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha.
4 So Jesus, knowing all that was coming on him, went out and said to them, "Who are you looking for?" Ebe Jisọs maara ihe niile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ pụtara sị ha, “Onye ka unu na-achọ?”
5 They answered him, "Jesus of Nazareth." Jesus said, "I AM." Judas, his betrayer, stood with them. Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.)
6 When Jesus said to them, "I AM," they drew back and fell to the ground. Mgbe Jisọs gwara ha, “Ọ bụ m,” ha laghachiri azụ, daa nʼala.
7 So he asked them again, "Who are you looking for?" And they said, "Jesus of Nazareth." Ọzọ ọ jụkwara ha, “Onye ka unu na-achọ?” Ha sịrị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.”
8 Jesus answered, "I told you I AM. So if you're looking for me, let these men go." Jisọs zara, “Agwara m unu na Ọ bụ m. Ọ bụrụ na unu na-achọ m, hapụnụ ndị a ka ha laa.”
9 This fulfilled Jesus's own word: "I have not lost a single one of those you gave me." Nke a bụ iji mezuo okwu ahụ o kwuru na mbụ, “Etufughị m onye ọbụla nʼime ndị ahụ i nyere m.”
10 So Simon Peter drew his sword, struck the high priest's servant, and cut off his right ear—the servant named Malchus. Ya mere Saimọn Pita, onye ji mma agha, mịpụtara ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Aha ohu ahụ bụ Malkus.
11 So Jesus told Peter, "Sheath your sword. Shouldn't I drink the cup my Father has given me?" Ma Jisọs gwara Pita, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya! Ọ bụ na mụ agaghị aṅụ site nʼiko ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?”
12 Then the troops, their commander, and the Jewish officers seized Jesus and tied him up. Ya mere ndị agha ahụ na ọchịagha ha, na ndị na-ejere ndị Juu ozi, jidere Jisọs kee ya agbụ.
13 They took him to Annas first, for he was father-in-law to Caiaphas, high priest that year. Ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas, onye bụ nna nwunye Kaịfas. Onye bụ onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ.
14 Caiaphas was the one who advised the Jews: better one man die for the people. Kaịfas bụkwa onye ahụ dụrụ ndị ndu ndị Juu ọdụ, sị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile.
15 Simon Peter and another disciple followed Jesus. That disciple was known to the high priest, so he entered with Jesus into the high priest's courtyard, Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja.
16 but Peter stood outside at the door. So the other disciple, known to the high priest, went out, spoke to the servant girl who kept the door, and brought Peter in. Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita.
17 The servant girl guarding the door said to Peter, "You also are not one of this man's disciples, are you?" He said, "I'm not." Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.”
18 The servants and officers, feeling the cold, had lit a charcoal fire and stood warming themselves; Peter stood with them, warming himself. Ndị ohu na ndị nche kwanyere ọkụ nʼihi na oyi na-atụ. Ha guzoro nʼebe ahụ na-anya ọkụ. Pita soro ha guzo na-anyakwa ọkụ.
19 The high priest then questioned Jesus about his disciples and his teaching. Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya.
20 Jesus answered him, "I spoke openly to the world; I always taught in synagogues and in the temple, where all the Jews gather. I said nothing in secret. Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo.
21 Why ask me? Ask those who heard what I said to them; they know what I said." Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.”
22 At this, one of the guards nearby slapped Jesus, saying, "Is that how you answer the high priest?" Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?”
23 Jesus answered him, "If I spoke wrongly, testify about the wrong; but if rightly, why do you strike me?" Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.”
24 Then Annas sent him, still bound, to Caiaphas the high priest. Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja.
25 Simon Peter, meanwhile, stood warming himself. They said, "Aren't you also one of his disciples?" He denied it: "I'm not." Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.”
26 One of the high priest's servants, a relative of the man whose ear Peter cut off, asked, "Didn't I see you with him in the garden?" Otu nʼime ndị ohu onyeisi nchụaja, bụ onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, sịrị, “Ọ bụ na m ahụghị gị na ya nʼime ogige ahụ?”
27 Peter again denied it, and at once a rooster crowed. Ma Pita gọkwara agọ ọzọ. Nʼotu mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
28 Then they led Jesus from Caiaphas to the governor's headquarters. It was early morning. They themselves didn't enter, so they wouldn't be made unclean but could eat the Passover. Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga.
29 So Pilate went out to them and said, "What accusation do you bring against this man?" Pailet gakwuru ha nʼezi sị, “Gịnị bụ ebubo unu na-ebo nwoke a?”
30 They answered him, "If this man weren't doing wrong, we wouldn't have handed him over to you." Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.”
31 Pilate said, "Take him yourselves and judge him by your own law." The Jews said, "We're not permitted to execute anyone." Pailet sịrị, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nʼonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu sịrị ya, “Ma anyị enweghị ikike igbu onye o bụla.”
32 This fulfilled the word Jesus had spoken, showing what kind of death he was about to die. Nke a mere iji mezuo okwu ahụ Jisọs kwuru banyere ụdị ọnwụ ọ gaje ịnwụ.
33 So Pilate went back into the headquarters, summoned Jesus, and asked, "Are you the King of the Jews?" Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?”
34 Jesus answered, "Are you saying this on your own, or did others tell you about me?" Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?”
35 Pilate replied, "Am I a Jew? Your own nation and chief priests handed you over to me. What have you done?" Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?”
36 Jesus answered, "My kingdom isn't from this world. If it were, my servants would fight against my being handed to the Jews. But my kingdom isn't from here." Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.”
37 Then Pilate said to him, "So you are a king?" Jesus answered, "You say I'm a king. I was born for this, and I came into the world for this—to testify to the truth. Everyone who belongs to the truth hears my voice." Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.”
38 Pilate asked, "What is truth?" Then he went out to the Jews again and said, "I find nothing wrong in him. Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya.
39 But you have a custom: I release one man to you at Passover. So do you want me to release the King of the Jews to you?" Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?”
40 They cried out again, "Not this man, but Barabbas!" Now Barabbas was a robber. Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]