Side by side with the Father's Heart Bible™ Okwu ikpeazụ Job nye ndị enyi ya
1Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
2“Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.
3Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,
4egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.
5Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.
6Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.
7“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.
8Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?
9Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa yamgbe nsogbu dakwasịrị ya?
10Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?
11“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.
12Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?
13“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
14Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.
15Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.
16Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,
17ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.
18Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.
19Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.
20Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.
21Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.
22Ọ na-atụfu ya na-enweghị eberemgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.
23Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”