Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 18 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After this, Paul left Athens and went to Corinth. Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint.
2 There he found a Jew named Aquila, native of Pontus, newly arrived from Italy with his wife Priscilla since Claudius had ordered all Jews out of Rome. Paul visited them, Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha,
3 since they shared a trade, he stayed and worked with them—tentmakers by trade. nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu.
4 Every Sabbath he reasoned in the synagogue, trying to persuade Jews and Greeks. Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere.
5 When Silas and Timothy came from Macedonia, Paul was consumed by the word, testifying to the Jews that the Christ was Jesus. Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
6 When they resisted and insulted him, he shook out his clothes and said, "Your blood is on your own heads! I'm clean of it. From now on I'll go to the Gentiles." Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.”
7 He left the synagogue and went to the house of Titius Justus, a worshiper of our Father, next door to the synagogue. O siri nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Taịtọs Jọstus, onye na-asọpụrụ na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nso nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
8 Crispus, the synagogue leader, believed in the Lord with his whole household; many Corinthians who heard Paul believed and were baptized. Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim.
9 One night the Lord told Paul in a vision, "Don't be afraid; keep speaking, don't stay silent, Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, “Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị.
10 for I am with you, and no one will attack you to harm you, for I have many people in this city." Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.”
11 So Paul stayed for a year and six months, teaching the word of our Father among them. Ọ nọgidere ebe ahụ otu afọ na ọkara. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke.
12 While Gallio was proconsul of Achaia, the Jews united against Paul and brought him before the tribunal, Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe.
13 saying, "This man is persuading people to worship God in ways contrary to the law." Ha sịrị, “Nwoke a na-amanye ndị mmadụ ka ha na-ekpere Chineke nʼụzọ megidere iwu.”
14 As Paul was about to speak, Gallio told the Jews, "If this were some wrong or vicious crime, Jews, I'd have reason to put up with you. Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio sịrị ndị Juu ahụ, “Agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, maọbụ arụ mmadụ mere megide obodo.
15 Since this is a dispute about words, names, and your own law, settle it yourselves. I won't judge such matters. Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.”
16 And he drove them away from the tribunal." O sitere nʼime ụlọ ikpe ya chụpụ ha.
17 So they all grabbed Sosthenes, the synagogue leader, and beat him before the judgment seat, but none of it concerned Gallio. Ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ahụ tie ya ihe nke ukwuu nʼọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dịka ọ maara ihe na-eme nʼebe ahụ.
18 Paul stayed on in Corinth for many more days. Then he said farewell to the brothers and sisters and sailed for Syria, accompanied by Priscilla and Aquila. At Cenchreae he had his hair cut off, for he was keeping a vow. Mgbe ọ nọsịrị nʼebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, Pọl sịrị ndị kwere ekwe nọ nʼebe ahụ ka ha nọdụnụ nke ọma, ma si nʼebe ahụ banye nʼụgbọ mmiri ruo Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Nʼobodo a na-akpọ Senkria, ọ kpụchara agịrị isi ya, nʼihi nkwa o kwere.
19 They reached Ephesus, where Paul left Priscilla and Aquila, but he himself entered the synagogue and reasoned with the Jews. Mgbe ha rutere Efesọs, ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ, ma o bu ụzọ banye nʼụlọ nzukọ ebe ya na ndị Juu nwere mkparịta ụka.
20 When they asked him to stay longer, he declined. Ma mgbe ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụkwuoro ha ogologo oge, ọ kweghị.
21 But he left, saying, "I will come back to you if our Father is willing," and sailed from Ephesus. Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs.
22 Landing at Caesarea, he went up, greeted the church, then went down to Antioch. Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk.
23 After some time there, he set out through Galatia and Phrygia, strengthening all the disciples. Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume.
24 A Jew named Apollos, born in Alexandria, came to Ephesus—a learned man, well versed in the Scriptures. Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma.
25 He had been taught the way of the Lord, and, spirit boiling over, spoke and taught accurately about Jesus—though he knew only John's baptism. Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.
26 He spoke boldly in the synagogue. Priscilla and Aquila heard him, took him aside, and explained the way of our Father more accurately. Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nʼụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya, duru ya gaa nʼụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe niile banyere ụzọ Chineke.
27 When Apollos wanted to cross to Achaia, the brothers and sisters encouraged him and wrote to the disciples to welcome him; arriving, he greatly helped those who had believed by grace, Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ.
28 for he forcefully refuted the Jews in public, proving from the Scriptures that the Christ was Jesus. Nʼihi na nʼihu ndị mmadụ niile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka niile nke ndị Juu. O gosiri ha site nʼakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]