Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 19 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 While Apollos was in Corinth, Paul crossed the inland region and reached Ephesus, where he found some disciples. Mgbe Apọlọs nọ na Kọrint, Pọl sitere ụzọ nke nʼime elu ala bịarute Efesọs. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ,
2 He asked them, "Did you receive the Holy Spirit when you believed?" They replied, "No, we haven't even heard there is a Holy Spirit." sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha sịrị ya, “Mba, anyị anụbeghị na ọ nwere ihe dịka Mmụọ Nsọ.”
3 So he asked, "Into what then were you baptized?" "Into John's baptism," they said. Ya mere, ọ sịrị, “Gịnị ka unu kwenyere nʼime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha sịrị, “Baptizim nke Jọn.”
4 Paul said, "John baptized with a baptism of repentance, telling people to believe in the one coming after him—Jesus." Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.”
5 On hearing this, they were baptized in the name of the Lord Jesus. Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.
6 When Paul laid hands on them, the Holy Spirit came on them; they spoke in tongues and prophesied. Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma.
7 There were about twelve men in all. Ha niile ruru ndị ikom iri na abụọ.
8 Paul entered the synagogue, speaking boldly three months, reasoning and persuading about our Father's kingdom. Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a.
9 When some grew stubborn, refusing to believe and slandering the Way before the crowd, he withdrew from them, took the disciples, and reasoned daily in Tyrannus's lecture hall. Ma ụfọdụ nʼime ha mechiri obi ha; ha juru ikwenye, kama ha kwuru okwu ọjọọ megide Ụzọ ahụ nʼihu ọgbakọ ahụ niile. Ya mere, o sitere nʼebe ha nọ pụọ, kpọrọkwa ndị na-eso ụzọ ahụ, ha na-akparịta ụka kwa ụbọchị nʼụlọ ọgbakọ Tiranọs.
10 This continued two years, so all living in Asia, both Jews and Greeks, heard the word of the Lord Jesus. Ihe ndị a gakwara nʼihu afọ abụọ. Ndị niile bi na Eshịa nụkwara oziọma Onyenwe anyị. Ọtụtụ nʼime ha bụ ndị Juu, ma ndị ọzọ bụ ndị Griik.
11 Our Father did extraordinary miracles through the hands of Paul, Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche.
12 so even handkerchiefs and aprons that touched his skin were carried to the sick, and diseases left them and evil spirits went out of them. Nke bụ na-ewere ụfọdụ nʼime akịsị maọbụ ịchafọ na akwa mgbochi nke metụrụ ya nʼahụ na-atụkwasị nʼahụ ndị ọrịa, ahụ a dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.
13 Some traveling Jewish exorcists also tried invoking the name of the Lord Jesus over those with evil spirits, saying, "I command you by the Jesus Paul preaches." Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.”
14 Seven sons of a Jewish high priest named Sceva were doing this. Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa nke Skiva, onyeisi nchụaja, bụ onye Juu.
15 But the evil spirit answered them, "Jesus I know, and Paul I recognize, but who are you?" Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?”
16 And the man who had the evil spirit leaped on them, overpowered them all, and prevailed against them, so that they fled out of that house naked and wounded. Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ.
17 All Jews and Greeks living in Ephesus learned of this. Fear seized them all, and the name of the Lord Jesus was highly praised. Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs niile. Mgbe ahụ, ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidekwara ha. Nʼihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nʼebe niile.
18 Many of those who had become believers also came, confessing and disclosing their practices. Ọtụtụ ndị kwenyerenụ bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha niile, nʼihu mmadụ niile.
19 Many who had practiced sorcery brought their scrolls together and burned them before everyone. They added up the price and found it worth 50,000 days' wages. Ọtụtụ nʼime ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị bupụtara akwụkwọ niile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nʼihu mmadụ niile. Akwụkwọ niile a kpọrọ ọkụ nʼụbọchị ahụ ga-eru ego ruru puku ọlaọcha iri ise.
20 So the word of the Lord Jesus continued to grow mightily and prevail. Ya mere, okwu Onyenwe anyị toro, na-agbasa nʼike nʼike na-adịkwa ire.
21 When this was done, Paul decided in his spirit to go through Macedonia and Achaia to Jerusalem, saying, "After I've been there, I must see Rome too." Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.”
22 He sent two of his assistants, Timothy and Erastus, to Macedonia, while staying in Asia himself a while longer. O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.
23 About that time there arose a serious disturbance concerning the Way. Ma ọ bụ nʼoge a ka oke nsogbu malitere megide Ụzọ ahụ.
24 For a man named Demetrius, a silversmith who made silver shrines of Artemis, kept many craftsmen busy. Otu onye ụzụ na-agbaze ọlaọcha, aha ya bụ Dimitriọs, onye ji ọlaọcha na-akpụ ụlọ arụsị ala ahụ a na-akpọ Atemis. Ọ na-ewetara ya na ndị ụzụ ibe ya ego nʼebe o hiri nne.
25 He gathered them and workers in similar trades and said, "Men, you know our wealth comes from this trade. Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya niile, na ndị ya na ha na-arụkọ otu ọrụ, sị, “Ndị ibe m, unu ma na ọ bụ site nʼọrụ nke a ka anyị si enweta akụnụba anyị.
26 You see and hear that this Paul has persuaded and turned away a great many people—not only in Ephesus but nearly all of Asia—telling them gods made by hands aren't gods at all. Unu niile ahụla ma nụkwa, otu nwoke a na-akpọ Pọl si rafuo ọtụtụ ndị mmadụ site nʼime ka ha kwenye na chi ọbụla e ji aka mee abụghị chi. Ọ bụkwaghị naanị nʼEfesọs kama ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ nʼEshịa niile.
27 The risk isn't just that our trade loses its good name, but that the temple of the great goddess Artemis will count for nothing, and she, worshiped by all Asia and the world, will be stripped of her greatness." Ọ bụkwaghị naanị na ihe ize ndụ dị banyere ọrụ aka anyị nke a ga elelị kama tinyere nke a, ụlọ nke oke chi nwanyị bụ Atemis agaghị enwekwa nsọpụrụ. Ya bụ, chi nwanyị nʼonwe ya bụ onye a na-efe nʼobodo Eshịa niile nakwa nʼelu ụwa niile ka a ga-anapụ nkwanye ugwu dịrị ya dịka chi.”
28 Hearing this, they were enraged and shouted, "Great is Artemis of the Ephesians!" Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha were oke iwe tie mkpu na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”
29 The city filled with confusion; together they rushed into the theater, dragging along Gaius and Aristarchus, Macedonians, Paul's traveling companions. Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ.
30 When Paul wanted to go in among the crowd, the disciples would not let him. Pọl chọrọ ịbakwuru igwe mmadụ ahụ, ma ndị na-eso ụzọ ahụ ekweghị ya.
31 Even some officials of the province, his friends, sent word urging him not to risk entering the theater. Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nʼetiti ndị na-achị Eshịa zigakwaara ya ozi na-arịọ ya ka ọ hapụ ịbanye nʼebe ahụ a na-eme ihe ileleanya.
32 Meanwhile some shouted one thing, others another—the assembly was in confusion, and most didn't know why they'd gathered. Ugbu a, nzukọ ahụ na-agba aghara, ụfọdụ mmadụ na-eti mkpu otu ihe, ndị ọzọ na-eti ihe ọzọ. Nʼezie, ọtụtụ nʼime ha amatakwaghị ihe ha jiri nọdụ nʼebe ahụ.
33 Some in the crowd coached Alexander, whom the Jews pushed forward; motioning with his hand, he wanted to defend himself before the people. Ụfọdụ ndị Juu nʼime ọgbakọ ahụ nupuru Alegzanda, sepụta ya, mee ka o buru ụzọ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ịgọrọ onwe ya nʼihu ọha mmadụ ahụ.
34 Realizing he was a Jew, they shouted as one for about two hours, "Great is Artemis of the Ephesians!" Ma nʼotu ntabi anya ahụ, mgbe ha matara na ọ bụ onye Juu, ha bidoro iti mkpu ihe dịka ogologo awa abụọ na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”
35 When the town clerk had quieted the crowd, he said, "Men of Ephesus, who doesn't know the Ephesians' city is temple keeper of the great Artemis and of the image that fell from heaven? Nʼikpeazụ, ode akwụkwọ nke obodo ahụ kwụsịrị igwe mmadụ ahụ ime ụzụ. O kwuru, “Ndị ikom Efesọs, o nwere onye na-amaghị na obodo Efesọs bụ obodo na-echekwa ụlọ ofufe Atemis, na oyiyi ya nke si nʼeluigwe daa?
36 Since these things cannot be denied, you ought to keep calm and do nothing rash. Ebe ihe ndị a adịghị na ngọpụ, ọ dị mkpa ka unu nọdụ nwayọọ, ghara imebi ihe ọbụla nʼecheghị echiche.
37 For you have brought these men here who are neither temple robbers nor blasphemers of our goddess. Lee ugbu a, ndị a unu kpọtara nʼebe a abụghị ndị ohi, ndị na-ezuru ihe nʼogige chi anyị, maọbụ na-ekwutọ eze nwanyị arụsị anyị.
38 So if Demetrius and his fellow craftsmen have a charge against anyone, courts are in session and proconsuls are available—let them accuse each other there. Ọ bụrụ na Dimitriọs na ndị ọkpụ ụzụ ibe ya nwere ihe ọbụla megide ha, ha gaa nʼụlọikpe. Ndị na-ekpe ikpe ga-eleba okwu ha anya. Kama ha mee ya nʼusoro iwu kwadoro.
39 But if you are seeking anything further, it will be settled in the regular assembly. Ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọzọ dị iche unu chọrọ ka e mee, a ga-edozi ya na nzukọ nke ndị obodo na-eme nʼụzọ ziri ezi.
40 We risk being charged with today's riot, since we have no reason to justify this uproar." Nʼihi na egwu dị, na-eleghị anya a ga-eji ihe nke mere taa boo anyị ebubo na anyị na-ebute ọgbaaghara. Anyị enweghị ọsịsa ziri ezi banyere ọgbaaghara nke a.”
41 And when he had said this, he dismissed the assembly. Mgbe o kwuchara nke a, ọ gbasara ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]