Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 20 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After the uproar ended, Paul sent for the disciples, encouraged them, said goodbye, and left for Macedonia. Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia.
2 When he had passed through those regions and given the believers much encouragement, he came to Greece. Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis.
3 He stayed three months; when the Jews plotted against him as he was about to sail for Syria, he decided to return through Macedonia. Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi.
4 Sopater son of Pyrrhus of Berea, Aristarchus and Secundus of Thessalonica, Gaius of Derbe, Timothy, and Tychicus and Trophimus of Asia accompanied him. Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Arịstakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi na Timoti, na Taịkikọs na Trofimọs, ndị Eshịa sokwa ya na-aga ije a.
5 These went on ahead and were waiting for us at Troas. Ndị a bu ụzọ gawa, na-eche anyị na Troas.
6 We sailed from Philippi after the days of Unleavened Bread, reaching them at Troas in five days and staying there seven days. Mgbe Mmemme Ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai bịakwute ha na Troas nʼụbọchị nke ise. Anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị asaa.
7 On the first day of the week, when we gathered to break bread, Paul talked with them; planning to leave the next day, he kept talking until midnight. Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị.
8 There were many lamps in the upper room where we were gathered. Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ.
9 A young man named Eutychus sat in the window, sinking into deep sleep as Paul kept talking. Overcome by sleep, he fell from the third story and was picked up dead. Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.
10 Paul went down, bent over him, and embracing him said, "Don't be alarmed; his life is in him." Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.”
11 He went back up, broke bread, ate, and talked with them a long time, until daybreak, then left. Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya.
12 And they brought the young man home alive, and were greatly comforted. Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.
13 We went ahead by ship to Assos, planning to take Paul aboard; he had chosen to go by land. Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ.
14 And when he met us at Assos, we took him on board and came to Mitylene. Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen.
15 Sailing from there, we came opposite Chios the next day, put in at Samos the day after, and reached Miletus the following day. Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs.
16 Paul had decided to sail past Ephesus, avoiding time in Asia; he was hurrying to reach Jerusalem, if possible, by Pentecost. Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime.
17 From Miletus he sent to Ephesus and called the elders of the church to come to him. Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya.
18 When they came, he said, "You know how I lived among you the whole time, from the first day I set foot in Asia, Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a.
19 serving our Lord Jesus with complete humility, tears, and trials brought on by the Jews' plots against me, Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m.
20 how I held nothing back that would help you, but declared it and taught you publicly and house to house, Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.
21 testifying to both Jews and Greeks: repentance toward our Father and faith in our Lord Jesus. E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.
22 Now bound by the Spirit, I'm heading to Jerusalem, not knowing what awaits me there, “Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ.
23 except the Holy Spirit tells me in every city that chains and sufferings await me. Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ.
24 But I place no value on my life, nor treasure it for myself, only that I finish my course and the ministry I received from our Lord Jesus, testifying to the gospel of our Father's grace. Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke.
25 And now I know none of you among whom I went preaching the kingdom of our Father will see my face again. “Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
26 Therefore I testify to you this day that I am innocent of the blood of all, Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị.
27 for I did not shrink from declaring to you the whole purpose of our Father. Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
28 Watch yourselves and all the flock the Holy Spirit made you overseers of, to shepherd our Father's church, which he purchased with the blood of his own Son. Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
29 I know that after my departure fierce wolves will come in among you, not sparing the flock. Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere.
30 Men from among you will rise, speaking distorted things, to draw the disciples away after them. Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha.
31 So watch, remembering that for three years, night and day, I never stopped warning each one of you with tears. Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ.
32 Now I entrust you to our Father and to the word of his grace, able to build you up and give you the inheritance among all who are made holy. “Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ.
33 I coveted no one's silver or gold or clothing. Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m.
34 You yourselves know that these hands provided for my needs and for those who were with me. Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa niile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so.
35 In everything I showed you that, working hard this way, we must help the weak, remembering the words of our Lord Jesus, that he himself said, It is more blessed to give than to receive." Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ”
36 And when he had said these things, he knelt down with them all and prayed. Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere.
37 They all wept; they embraced Paul and kissed him, Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ.
38 grieving most over his words—that they'd never see his face again—they walked him to the ship. O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]