Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 21 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Having torn ourselves away from them, we set sail and went straight to Cos, then the next day to Rhodes, then from there to Patara. Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo Kos. Nʼechi ya, anyị rutere Rods. Anyị sitere nʼebe ahụ jeruo Patara.
2 Finding a ship crossing over to Phoenicia, we went aboard and set sail. Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga Fonisia, anyị banyere nʼime ya kwọpụ.
3 Sighting Cyprus and leaving it on our left, we sailed to Syria and landed at Tyre, where the ship was to unload its cargo. Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya.
4 We found the disciples there and stayed seven days. Through the Holy Spirit they kept telling Paul not to set foot in Jerusalem. Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem.
5 When our time there was up, we left and went on, all of them with wives and children walking with us out of the city. We knelt on the beach and prayed, Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere.
6 and said farewell to one another. Then we went aboard the ship, and they returned home. Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha.
7 Finishing our voyage from Tyre, we arrived at Ptolemais, greeted the brothers, and stayed one day with them. Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị.
8 The next day we left for Caesarea and entered the house of Philip the evangelist, one of the seven, and stayed with him. Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ.
9 He had four unmarried daughters who prophesied. O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma.
10 While we were staying there for many days, a prophet named Agabus came down from Judea. Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, ka otu onye amụma a na-akpọ Agabọs, si Judịa bata.
11 He came to us, took Paul's belt, tied his own feet and hands, and said, "The Holy Spirit says this: the Jews in Jerusalem will tie up this belt's owner the same way, then hand him over into Gentile hands." Ọ bịakwutere anyị, chilite belịt Pọl na-eke nʼukwu, kee onwe ya nʼụkwụ na aka sị, “Dịka Mmụọ Nsọ kwuru, ‘otu a ka ndị ndu ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nʼaka ndị mba ọzọ.’ ”
12 When we heard this, we and the local people begged Paul not to go up to Jerusalem. Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem.
13 Paul answered, "Why weep and break my heart? I'm ready not only to be bound but to die in Jerusalem for the name of the Lord Jesus." Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.”
14 And since he would not be persuaded, we fell silent and said, "The Lord's will be done." Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”
15 After these days we got ready and went up to Jerusalem. Mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, anyị jikere bilie ịga Jerusalem.
16 Some disciples from Caesarea also went with us, bringing us to stay with Mnason, a Cypriot and early disciple. Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na Sizaria, duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ Mnasin, onye Saiprọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ.
17 When we arrived in Jerusalem, the brothers welcomed us gladly. Mgbe anyị rutere Jerusalem, ndị ụmụnna jiri obi ụtọ nabata anyị.
18 On the following day Paul went with us to see James, and all the elders were present. Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta Jemis, ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ.
19 He greeted them, then related one by one what our Father had done among the Gentiles through his ministry. Mgbe o kelechara ha, ọ kọọrọ ha nʼotu nʼotu, ihe niile Chineke rụrụ nʼetiti ndị mba ọzọ site nʼije ozi ya.
20 Hearing this, they praised our Father, then told him, "You see, brother, how many thousands of Jews have believed, and all are passionate for the law. Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị Juu si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi.
21 They were told you teach all Jews among the nations to abandon Moses, telling them not to circumcise their children or follow our customs. A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị Juu bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosis, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị.
22 So what should we do? They will certainly hear that you have come. Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a.
23 So do what we tell you. We have four men who are under a vow. Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke.
24 Take these men, purify yourself with them, and pay their expenses so they may shave their heads. Then everyone will know the reports about you are false, and that you yourself keep the law. Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu.
25 As for the Gentiles who have believed, we already wrote our decision: avoid food offered to idols, blood, strangled animals, and sexual immorality." Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”
26 So Paul took the men, and the next day, having purified himself with them, entered the temple, announcing when the purification days would end and the offering would be made for each of them. Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ.
27 As the seven days were ending, Jews from Asia saw him in the temple, stirred up the whole crowd, and grabbed him, Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya,
28 shouting, "Men of Israel, help! This is the man teaching everyone everywhere against our people, the law, and this place. He's even brought Greeks into the temple, making this holy place unclean." na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.”
29 They had earlier seen Trophimus the Ephesian with Paul in the city and assumed Paul had brought Trophimus into the temple. (Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.)
30 The whole city was stirred; people ran together, seized Paul, dragged him out of the temple, and at once the gates were shut. Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.
31 As they tried to kill him, word reached the cohort commander that all Jerusalem was in turmoil. Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara.
32 He immediately took soldiers and centurions and ran down to them. Seeing the commander and soldiers, the crowd stopped beating Paul. Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.
33 The commander came, seized him, ordered him bound with two chains, then asked who he was and what he'd done. Ọchịagha ahụ bịara jide ya, nye iwu ka e were ụdọ igwe abụọ kee ya agbụ, ọ jụkwara onye ọ bụ na ihe o mere.
34 In the crowd some shouted one thing, some another. Unable to learn what was true because of the uproar, he ordered Paul brought into the barracks. Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha.
35 When Paul reached the steps, soldiers had to carry him because of the crowd's violence, Mgbe o rutere na mgbagolite ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ndị agha bulitere ya elu nʼihi ọgbaaghara igwe ndị mmadụ dị ukwuu.
36 for the mob kept following, shouting, "Away with him!" Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!”
37 As Paul was about to be led into the barracks, he asked the commander, "May I say something to you?" He replied, "Do you know Greek?" Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?” Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik?
38 Aren't you the Egyptian who stirred up a revolt earlier and led 4,000 Assassins into the wilderness? Ọ pụtara na ị bụghị onye Ijipt ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?”
39 Paul answered, "I am a Jew, from Tarsus in Cilicia, a citizen of no insignificant city. I beg you, let me speak to the people." Pọl sịrị, “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nwa afọ oke obodo amara aha ya. Biko, kwee ka m gwa ndị mmadụ okwu.”
40 With permission granted, Paul stood on the steps and motioned to the people with his hand. When deep silence fell, he spoke to them in Hebrew: Mgbe o nyere ya ikike, Pọl guzooro nʼihe nrigo nke ọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, ọ gwara ha okwu nʼasụsụ Hibru sị,
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]