Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "Brothers and fathers, listen now to my defense before you." “Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nʼihu unu.”
2 When they heard him speaking to them in Hebrew, they grew even more quiet. And he said: Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nʼasụsụ Hibru, ha deere duu karịa. Mgbe ọ sịrị,
3 "I am a Jew, born in Tarsus of Cilicia, raised in this city, trained at Gamaliel's feet in the strict law of our ancestors, as eager for God as all of you are today. “Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa.
4 I persecuted this Way to the death, binding and delivering to prison both men and women, Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ.
5 as the high priest and the whole council of elders can testify. From them I received letters to the brothers in Damascus, and went to bring those there as prisoners to Jerusalem for punishment." Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.
6 "Traveling and nearing Damascus about noon, a great light from heaven suddenly flashed around me." “Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m.
7 I fell to the ground and heard a voice say to me, "Saul, Saul, why are you persecuting me?" Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’
8 I answered, "Who are you, Lord?" He replied, "I am Jesus of Nazareth, whom you're persecuting." “ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. “Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’
9 "Those with me saw the light but didn't understand the voice of the one speaking to me." Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.
10 I said, "What should I do, Lord?" The Lord replied, "Get up and go into Damascus. There you'll be told all you've been appointed to do." “Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’
11 "Since that light's brightness blinded me, my companions led me by the hand into Damascus." Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs.
12 "A man named Ananias, devout by the law, well spoken of by all the Jews living there, “Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ.
13 came and stood by me and said, 'Brother Saul, receive your sight.' At that very hour I looked up and saw him." Ọ bịakwutere m, guzoro nʼakụkụ m sị, ‘Nwanna anyị Sọl, ka emee ka ị hụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ, e nwetara m ike ịhụ ụzọ, m hụkwara ya.
14 "He said, 'The God of our fathers appointed you to know his will, to see the Righteous One, and to hear a voice from his mouth; “Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya.
15 for you will be his witness to everyone of what you have seen and heard. Ị ga-abụ onyeama ya nye ndị niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.
16 And now, why wait? Get up, be baptized, wash away your sins, calling on his name." Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị baptizim, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’
17 "When I had returned to Jerusalem and was praying in the temple, I fell into a trance," “Mgbe m lọghachikwara na Jerusalem, nọrọ na-ekpe ekpere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ahụrụ m ọhụ,
18 and saw him saying to me, "Hurry and leave Jerusalem quickly, because they won't accept your testimony about me." ebe ọ na-agwa m, ‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nʼihi na ndị bi nʼala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere m.’
19 I said, "Lord, they themselves know that I went from synagogue to synagogue imprisoning and beating those who believed in you. “Ma asịrị m, ‘Onyenwe anyị, ndị a maara nke ọma na m na-aga nʼụlọ nzukọ nʼotu nʼotu, na-atụba ndị kwere na gị nʼụlọ mkpọrọ, na-etikwa ha ihe.
20 When the blood of your witness Stephen was being shed, I stood by, approving and guarding the cloaks of those killing him.'" Nʼoge a na-awụfu ọbara onyeama gị bụ Stivin, eguzo m nso na-akwado nʼihe emere dị mma, ma na-elekọtakwa uwe ndị ahụ tụgburu ya anya.’
21 "And he said to me, 'Go, for I will send you far away to the Gentiles.'" “Mgbe ahụ, ọ sịrị m, ‘Gawa; nʼihi na aga m ezipu gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ.’ ”
22 Up to that point they listened, then they raised their voices and shouted, "Erase such a man from the earth! He shouldn't be allowed to live!" Ha ṅara ya ntị ruo ugbu a. Mgbe ahụ, ha niile tiri mkpu nʼotu olu sị, “Wepụnụ onye dị otu a nʼụwa! O kwesighị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”
23 And as they were shouting and throwing off their cloaks and flinging dust into the air, Ha tiri mkpu na-atụli uwe mgbokwasị ha elu, na-achilikwa aja nʼala na-efesasị ya ebe niile,
24 the commander ordered him taken into the barracks and whipped, to learn why they were shouting against him like this. ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpụgaa ya nʼogige ndị agha, pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nʼọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ha ji eti mkpu otu a megide ya.
25 As they stretched him out for the straps, Paul said to the centurion standing there, "Is it legal for you to whip a Roman citizen who hasn't been condemned?" Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?”
26 Hearing this, the centurion went to the commander and reported it: "What are you about to do? This man is a Roman citizen." Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.”
27 So the commander came and asked, "Tell me, are you a Roman citizen?" "Yes," he said. Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Ọ sịrị, “E.”
28 The commander said, "I paid a large sum for this citizenship." But Paul said, "I was born a citizen." Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.” Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”
29 So those about to question him withdrew at once; the commander was afraid, realizing he had bound a Roman citizen. Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.
30 The next day, wanting to know exactly why the Jews accused him, the commander freed Paul, ordered the chief priests and the whole council to assemble, brought Paul down, and set him before them. Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]