Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 23 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Paul stared at the council: "Brothers, I have lived my life before our Father in all good conscience until today." Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.”
2 The high priest Ananias ordered those standing near him to strike Paul on the mouth. Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ.
3 Paul said to him, "Our Father will strike you, you whitewashed wall! You sit there to judge me by the law, yet you break the law by ordering me struck?" Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”
4 Those standing nearby said, "Do you dare to insult our Father's high priest?" Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?”
5 Paul said, "Brothers, I didn't know he was high priest; for Scripture says, 'Don't speak evil of your people's ruler.'" Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’”
6 Paul, knowing some were Sadducees, others Pharisees, cried out in the council, "Brothers, I am a Pharisee, son of Pharisees. I am on trial over the hope and resurrection of the dead!" Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.”
7 When he said this, a dispute arose between the Pharisees and Sadducees, and the assembly was split. Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara.
8 For the Sadducees say there is no resurrection, and neither angel nor spirit, but the Pharisees acknowledge them all. Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile.
9 A loud uproar broke out. Some scribes from the Pharisees' side stood and argued sharply: "We find nothing wrong in this man. What if a spirit or an angel spoke to him?" Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?”
10 As the dispute grew violent, the commander, fearing Paul would be torn apart by them, ordered the soldiers to go down, seize him from among them, and bring him into the barracks. Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.
11 The next night our Lord Jesus stood beside him and said, "Take courage! As you testified about me in Jerusalem, so you must testify in Rome too." Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”
12 At daybreak the Jews conspired and swore not to eat or drink until they killed Paul. Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl.
13 There were more than forty who had joined in this plot. Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ.
14 They went to the chief priests and elders and said, "We have bound ourselves under a solemn oath to taste nothing until we kill Paul. Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl.
15 So now, you and the council, ask the commander to bring him down to you, as if to examine his case more closely. We're ready to kill him before he arrives." Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.”
16 But Paul's sister's son, hearing of the ambush, went and entered the barracks and told Paul. Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl.
17 Paul called a centurion and said, "Take this young man to the commander—he has something to report." Pọl kpọrọ otu nʼime ndịisi agha ahụ gwa ya, “Biko kpọrọ nwokorobịa a gaa nʼebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.”
18 So he took him to the commander and said, "The prisoner Paul called me and asked me to bring this young man to you; he has something to tell you." Ọ kpọọrọ ya jekwuru onyeisi agha, sị. “Pọl, onye mkpọrọ, kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwokorobịa a nʼihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.”
19 The commander took his hand, led him aside privately, and asked, "What do you have to tell me?" Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?”
20 He said, "The Jews have agreed to ask you to bring Paul down to the council tomorrow, pretending to inquire more precisely about him. Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya.
21 Don't listen to them—more than forty of their men are waiting in ambush for him. They've bound themselves by oath not to eat or drink until they kill him, and now they're ready, waiting for your agreement." Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.”
22 The commander sent the young man off, ordering him, "Tell no one you reported this to me." Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.”
23 Then he called two centurions: "Ready 200 soldiers for Caesarea, and seventy horsemen, and 200 spearmen, by nine tonight." Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a.
24 He told them to provide mounts for Paul, to bring him safely to Governor Felix. Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.”
25 And he wrote a letter that read as follows:" O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a:
26 "Claudius Lysias, to his Excellency Governor Felix: Greetings. Klọdiọs Lisias, Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a. Ana m ekele gị.
27 The Jews seized this man and were about to kill him when I came with my troops and rescued him, having learned he was a Roman citizen. Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha.
28 Wanting to know the charge they were bringing against him, I brought him down to their council. Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha.
29 I found him accused over questions of their law, with no charge deserving death or imprisonment. Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ.
30 Told of a plot against the man, I sent him to you at once, also ordering his accusers to state their case against him before you." Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha.
31 So the soldiers, following their orders, took Paul and brought him by night to Antipatris. Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu.
32 The next day they let the horsemen go on with him while they returned to the barracks. Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha.
33 The horsemen reached Caesarea, delivered the letter to the governor, and presented Paul to him. Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl.
34 After reading it, the governor asked what province he was from, and learned he was from Cilicia, Gọvanọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ, jụọ ya akụkụ ala o si pụta. Mgbe ọ matara na ọ bụ onye Silisia,
35 "I'll hear you," he said, "once your accusers arrive." He ordered him held under guard in Herod's headquarters. ọ sịrị ya, “Aga m enye okwu gị ezigbo ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” O nyekwara iwu ka e debe ya nʼobi Herọd nʼaka ndị nche.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]