Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 24 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Five days later the high priest Ananias came down with some elders and a lawyer, Tertullus, and they brought charges against Paul before the governor. Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ Ananayas na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo.
2 When Paul was summoned, Tertullus began his accusation: "Through you we enjoy great peace, and reforms have come to this nation through your foresight, Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a.
3 we acknowledge this in every way and everywhere, most excellent Felix, with all gratitude. Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị Feliks, onye a na-asọpụrụ.
4 But so as not to detain you any further, I ask you to hear us kindly, in a few words. Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa.
5 We found this man a plague, stirring up riots among all the Jews worldwide, and a ringleader of the Nazarene sect. “Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret.
6 He even tried to desecrate the temple, so we seized him. Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị,
7 Not in this edition ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.
8 By examining him yourself, you can learn all we accuse him of." Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.”
9 The Jews also joined in the attack, insisting that these things were so. Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme.
10 The governor motioned him to speak. Paul answered: "Knowing you've judged this nation for many years, I gladly defend myself. Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị.
11 You can confirm it's no more than twelve days since I went up to worship in Jerusalem. Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe.
12 They found me arguing with no one, stirring up no crowd—not in the temple, the synagogues, or anywhere in the city. Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo.
13 Nor can they prove to you the charges they are now bringing against me. Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
14 But I confess to you: following the Way—they call it a sect—I worship the God of our ancestors, believing all that agrees with the Law and is written in the Prophets. Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma.
15 I have hope in our Father—one these men also hold—that the righteous and unrighteous alike will rise. Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
16 So I always strive to keep my conscience clear before our Father and before people. Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.
17 After several years I came to bring charitable gifts for my nation's poor, and offerings. “Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.
18 Amid this, they found me purified in the temple—no crowd, no uproar. Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.
19 Some Jews from Asia should be here before you to accuse, if they have anything against me. Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.
20 Or let these men themselves say what wrongdoing they found when I stood before the council, Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.
21 except this one thing I shouted standing among them: 'It's over the resurrection of the dead that I'm on trial before you today.'" Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ”
22 Felix, who knew the Way fairly well, adjourned the hearing: "When Lysias the commander arrives, I will decide your case." Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”
23 He ordered the centurion to guard Paul but allow him some freedom, not stopping any of his friends from serving him. O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya.
24 Some days later, Felix came with his wife Drusilla, a Jew, sent for Paul, and heard him about faith in Christ Jesus. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
25 As Paul discussed righteousness, self-control, and the coming judgment, Felix grew frightened and said, "That's enough for now; go. When I find time, I'll call for you." Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”
26 He also hoped Paul would give him money, so he sent for him often and talked with him. Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka.
27 After two years, Porcius Festus succeeded Felix. Wanting to please the Jews, Felix left Paul in prison. Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]