Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 25 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now three days after Festus had arrived in the province, he went up to Jerusalem from Caesarea. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem.
2 There the chief priests and Jewish leaders presented their case against Paul and kept urging him, Nʼebe ahụ ka ndịisi nchụaja na ndịisi ndị Juu kọwara ya ihe banyere Pọl.
3 requesting a favor against him—that he summon Paul to Jerusalem. They were setting an ambush to kill him on the road. Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ.
4 Festus replied that Paul was held at Caesarea, and he himself would leave shortly. Ma Festọs zara, “Pọl nọ dịka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya.
5 "So," he said, "let those among you who are able go down with me and accuse the man, if there is anything wrong with him." Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.”
6 Festus stayed with them no more than eight or ten days, then went down to Caesarea. The next day he took the judge's seat and ordered Paul brought in. Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl.
7 When Paul arrived, the Jews from Jerusalem surrounded him, bringing many serious charges they couldn't prove. Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa.
8 Paul answered in his defense: "I have done no wrong against the Jewish law, the temple, or Caesar." Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.”
9 But Festus, wanting to please the Jews, asked Paul, "Will you go up to Jerusalem and be tried there before me on these charges?" Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?”
10 Paul said, "I stand before Caesar's tribunal, where I must be judged. I've done the Jews no wrong, as you yourself know very well. Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma.
11 If I've done wrong, done something deserving death, I won't refuse to die. But if these men's charges against me are groundless, no one can hand me over to them. I appeal to Caesar." Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.”
12 After consulting his council, Festus answered, "You appealed to Caesar; to Caesar you will go." Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”
13 Some days later, King Agrippa and Bernice came to Caesarea and greeted Festus. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs.
14 As they spent many days there, Festus presented Paul's case to the king: "Felix left a man here as a prisoner. Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a.
15 While I was in Jerusalem, the chief priests and elders of the Jews accused him, asking me for his conviction. Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe.
16 I told them it's not Roman custom to hand over anyone before the accused faces his accusers in person and gets a chance to defend himself against the charge. “Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo.
17 So when they gathered here, I delayed nothing—next day I sat on the judgment seat and ordered the man brought in. Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ.
18 When his accusers stood up, they raised none of the criminal charges I had expected. Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere.
19 Instead, they had some disputes with him about their own religion and a dead man named Jesus, whom Paul kept claiming was alive. Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ.
20 Unsure how to investigate this, I asked if he was willing to go to Jerusalem and be tried there on these charges. Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nʼihi ya, a jụrụ m ya ma ọ ga-amasị ya ị ga nʼụlọikpe dị na Jerusalem ka ọ nọrọ nʼebe ahụ gọrọ onwe ya.
21 But since Paul appealed to be held for the Emperor's decision, I ordered him held until I could send him to Caesar." Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.”
22 Agrippa told Festus, "I'd like to hear the man myself." "Tomorrow," Festus said, "you will hear him." Agripa gwara Festọs, “Achọrọ m ịnụ okwu site nʼọnụ nwoke a nʼonwe ya.” Ọ sịrị, “Ị ga-anụ ya echi.”
23 The next day Agrippa and Bernice arrived with great show and entered the hall with the military commanders and the city's prominent men. On Festus's order, Paul was brought in. Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl.
24 Festus said, "King Agrippa, and all here with us—you see this man. The whole Jewish community petitioned me about him, both in Jerusalem and here, shouting he must not live any longer. Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ.
25 But finding nothing deserving death, and since he himself appealed to the Emperor, I decided to send him. Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesiri ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya.
26 I have nothing definite to write my lord about him, so I brought him before you all, especially before you, King Agrippa, so that after this examination I may have something to write. Ma enweghị m ihe ọbụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nʼihu unu niile, ma karịsịa nʼihu gị onwe gị eze Agripa, ka ọ ga-abụ anyị tulesịa ihe banyere ya, ka m nwee ihe m ga-ede.
27 For it seems unreasonable to me to send a prisoner without indicating the charges against him." Nʼihi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi na m ga-ezipụ onye mkpọrọ na-egosighị nʼebubo e boro ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]