Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After traveling through Amphipolis and Apollonia, they came to Thessalonica, where there was a Jewish synagogue. Mgbe ha gafechara obodo Amfipolis na Apolonia, ha bịaruru obodo Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị.
2 Paul, as usual, went in to them and reasoned with them from the Scriptures on three Sabbaths. Pọl bakwuuru ha, dịka ọ na-eme oge niile. Ọ nọnyere ha izu ụka atọ, ya na ha na-atụgharị uche nʼAkwụkwọ Nsọ,
3 Opening and explaining the Scriptures that the Christ must suffer and rise from the dead, he said, "This Jesus I proclaim to you is the Christ." na-akọwara ha na-edokwa ha anya na ọ dị mkpa na Kraịst ga-ahụ ahụhụ, ma sitekwa nʼọnwụ bilie. Ọ sịrị, “Jisọs a, nke m na-ekwusara unu bụ Kraịst ahụ.”
4 Some of them were persuaded and joined Paul and Silas, along with a great many devout Greeks and quite a few leading women. Ụfọdụ nʼime ndị Juu ahụ ka e mere ka ha kwere ma sonyere Pọl na Saịlas, otu aka ahụ, igwe mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nʼetiti ndị Griik na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha.
5 But the Jews grew jealous, gathered evil men from the marketplace, formed a mob, and threw the city into chaos. They stormed Jason's house, seeking to bring them out to the crowd. Ma ndị Juu jupụtara nʼekworo, nʼihi ya, ha kpaliri obi ụfọdụ mmadụ efu nʼetiti ha nʼọma ahịa. Ndị a malitekwara ọgbaaghara nʼụzọ dị iche nʼime obodo. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nʼihi na ha chọrọ ịdọpụta ha nyefee ha nʼaka ọha mmadụ.
6 Not finding them, they dragged Jason and some brothers before the city officials, shouting, "These men who have turned the world upside down have come here too, Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu.
7 Jason welcomed them. They all defy Caesar's decrees, claiming there is another king—Jesus. Ma Jesin nabatara ha nʼụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nʼihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.”
8 And they stirred up the crowd and the city authorities who heard these things." Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile.
9 And when they had taken bail from Jason and the rest, they let them go. Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha.
10 The brothers at once sent Paul and Silas off by night to Berea; on arrival they went to the Jewish synagogue. Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
11 These Jews were more open-minded than those in Thessalonica, receiving the word eagerly and examining Scripture daily to see if these things were true. Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile.
12 So many of them believed, along with many prominent Greek women and men. Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara.
13 When Jews from Thessalonica learned Paul proclaimed the word of our Father in Berea too, they went there also, agitating and stirring up the crowds. Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa oziọma Chineke na obodo Beria, ụfọdụ ha gara nʼebe ahụ na-akpali igwe ndị mmadụ nʼihi iwebata ọgbaaghara.
14 The brothers immediately sent Paul off to the sea, but Silas and Timothy stayed there. Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ.
15 Paul's escorts brought him to Athens, then left with orders for Silas and Timothy to join him as soon as possible. Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge.
16 While Paul waited for them in Athens, his spirit was provoked within him, seeing the city full of idols. Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ.
17 So he debated in the synagogue with Jews and worshipers of God, and daily in the marketplace with whoever was there. Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu.
18 Some of the Epicurean and Stoic philosophers also debated with him. Some asked, "What's this babbler trying to say?" Others said, "He seems to promote foreign gods"—since he preached the good news of Jesus and the resurrection. Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya.
19 They took him and brought him to the Areopagus, asking, "Can we know what this new teaching you're presenting is? Ha kpọbatara ya nʼebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Areopagọs, ebe ha nọ sị ya, “Anyị enwere ike ịmata ihe banyere ozizi ọhụrụ gị a?
20 For you bring strange things to our ears, so we want to know what they mean." Ị na-ekwu ihe ndị na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịmata ihe ndị a nke ọma.”
21 Now all the Athenians and foreigners living there spent their time on nothing but telling or hearing something new. (Ndị Atens niile na ndị ala ọzọ bi nʼobodo ahụ, enweghị ohere ime ihe ọbụla, ọ gwụchaala ọrụ ikwu na ịnụ banyere ihe dị ọhụrụ.)
22 Paul stood in the middle of the Areopagus and said, "Athenians, I see that you are extremely religious in every way. Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.
23 For as I passed through and examined your sacred objects, I found an altar inscribed: 'To an unknown god.' What you worship without knowing it, I now proclaim to you. Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu.
24 Our Father, who made the world and everything in it, being Sovereign of heaven and earth, doesn't live in temples made by hands, “Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo.
25 nor served by human hands, as if he needed anything—he himself gives everyone life, breath, and everything. Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile.
26 From one man he made every nation of mankind live across the whole earth, fixing their set times and the boundaries of their homelands, O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha.
27 so they might seek our Father, perhaps reach for him and find him—though he is not far from each of us, Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya.
28 for 'In him we live and move and have our being'; as even some of your own poets have said, 'We too are his descendants.' ‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’
29 So as our Father's children, we shouldn't think the divine is like gold, silver, or stone—an image shaped by human skill and imagination. “Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ.
30 The times of ignorance our Father overlooked, but now he commands all people everywhere to repent. Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.
31 He set a day to judge the world justly, through a man he appointed—proving it to all by raising him from the dead." Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”
32 Hearing of the resurrection of the dead, some mocked; others said, "We'll hear you on this again." Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”
33 So Paul left them. Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha.
34 But some men joined him and believed, including Dionysius the Areopagite, a woman named Damaris, and others. Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]