Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 16 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Paul went on to Derbe and Lystra. A disciple was there named Timothy, son of a believing Jewish woman, but his father was a Greek. Pọl bịaruru Debi na Listra, ebe otu onye na-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Timoti bi. Nne ya bụ onye Juu bụrụkwa onye kwere ekwe, ma nna ya bụ onye Griik.
2 He was well thought of by the brothers at Lystra and Iconium. Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya.
3 Paul wanted him to travel with him, so he took and circumcised him, because of the Jews in those places, for they all knew his father was Greek. Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik.
4 Traveling through the towns, they delivered the decisions the apostles and elders in Jerusalem had made, for them to keep. Dịka ha na-eme njem site nʼobodo ruo nʼobodo, ha na-akọwara ha ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem ka ha nwe ike idebe ha.
5 So the churches were strengthened in the faith and grew in numbers daily. Ihe ndị a niile mere ka nzukọ sie ike nʼokwukwe ma baakwa ụba nʼọnụọgụgụ kwa ụbọchị.
6 They crossed the Phrygian and Galatian region, since the Holy Spirit had stopped them from speaking the word in Asia. Ha gara mpaghara Frigia na Galeshịa. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa oziọma nʼakụkụ Eshịa nʼoge ahụ.
7 Reaching Mysia, they tried entering Bithynia, but the Spirit of Jesus wouldn't let them. Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa.
8 So passing by Mysia, they went down to Troas. Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas.
9 Paul saw a vision in the night: a Macedonian man stood pleading with him, "Cross over to Macedonia and help us." Nʼabalị ahụ, Pọl hụrụ ọhụ ebe ọ hụrụ otu nwoke onye Masidonia ka o guzo na-arịọ ya sị, “Bịa na Masidonia nyere anyị aka.”
10 When he had seen the vision, we tried at once to leave for Macedonia, concluding our Father had called us to tell them the good news. Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.
11 So we set sail from Troas and sailed straight to Samothrace, and the next day to Neapolis, Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis.
12 and from there to Philippi, a leading city of that district of Macedonia, a Roman colony. We stayed there several days. Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị.
13 On the Sabbath we went outside the gate to a river, supposing there was a place of prayer. We sat and spoke with the women gathered there. Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu.
14 A woman named Lydia, from Thyatira, who sold purple cloth and worshiped our Father, was listening. The Lord opened her heart to Paul's words. Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu.
15 When she and her household were baptized, she urged us: "If you judge me faithful to the Lord, come to my house and stay." And she persuaded us. Ka e mesịrị ya na ezinaụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ anyị na-asị, “Ọ bụrụ nʼezie na unu gụrụ m dịka onye kwesiri ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, batanụ nʼụlọ m nọrọ.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.
16 As we went to the place of prayer, we met a slave girl possessed by a spirit of divination; she earned her owners great profit through fortune-telling. Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga nʼụlọ ekpere, anyị zutere otu nwaagbọghọ bụ ohu, onye nwere mmụọ ịgba afa. Ọ na-ewetara ndị nwe ya ezigbo ego site nʼịgba afa.
17 She followed Paul and us, shouting, "These men are servants of the Most High God, announcing to you the way of salvation." Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.”
18 She did this for many days. Paul, deeply annoyed, turned and told the spirit, "I command you in the name of Jesus Christ to come out of her." It came out instantly. O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta.
19 When her owners saw their hope of profit was gone, they seized Paul and Silas, dragged them to the marketplace before the rulers. Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa.
20 Bringing them to the magistrates, they said, "These men are Jews, disturbing our city. Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị,
21 They advocate customs that are not lawful for us as Romans to accept or practice." site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.”
22 The crowd joined the attack, and the magistrates ripped off Paul and Silas's clothes and ordered them beaten with rods. Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe.
23 After beating them severely, they threw them into prison, ordering the jailer to guard them securely. Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma.
24 Given that order, he locked them in the inner cell and clamped their feet in stocks. Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ.
25 About midnight Paul and Silas prayed and sang hymns to our Father while the prisoners listened to them. Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.
26 Suddenly a violent earthquake shook the prison's foundations; instantly all doors opened and everyone's chains loosened. Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara.
27 The jailer woke, saw the prison doors open, drew his sword meaning to kill himself, thinking the prisoners had escaped. Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.
28 But Paul shouted, "Don't harm yourself, for we are all here!" Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!”
29 The jailer called for lights, rushed in, and fell trembling before Paul and Silas. Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji.
30 Then he brought them outside and said, "Sirs, what must I do to be saved?" Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”
31 And they said, "Believe in the Lord Jesus, and you will be saved, you and your household." Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.”
32 They spoke the Lord's word to him and everyone in his house. Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị.
33 In that hour of the night, he took them and washed their wounds; then he and his whole household were baptized at once. Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim.
34 He brought them up into his house, set food before them, and was overjoyed with his whole household at believing in our Father. Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
35 But when morning came, the magistrates sent the police, saying, "Release those men." Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.”
36 The jailer told Paul, "The magistrates sent orders to release you. Come out now and go in peace." Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.”
37 But Paul said to them, "They beat us publicly, without trial, Roman citizens that we are, and threw us into prison. Now they want to send us off secretly? No! Let them come themselves and lead us out." Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.”
38 The officers reported these words to the magistrates, who were afraid to hear they were Roman citizens. Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.
39 They came, apologized, led them out, and asked them to leave the city. Ha bịakwutere ha rịọsie ha arịrịọ ike. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ.
40 So they left the prison and went to Lydia's house. There they saw the brothers, encouraged them, and left. Mgbe ha sitere nʼụlọ mkpọrọ pụta, ha gara nʼụlọ Lidia. Nʼebe ahụ ka ha zutere ụmụnna, gwa ha okwu mgbamume, emesịa ha si nʼobodo ahụ pụọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]