Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Zechariah 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then I looked up and saw a man with a measuring line in his hand. Mgbe m weliri anya m, ahụrụ m otu nwoke ji eriri ihe ọtụtụ nʼaka ya.
2 I asked, "Where are you going?" He said to me, "To measure Jerusalem, to see how wide and how long it is." Ajụrụ m, “Ebee ka ị na-aga?” Ọ sịrị m, “Ana m aga ịtụ Jerusalem, ịchọta ịdị ogologo ya, na ịdị obosara ya.”
3 The angel speaking with me left, and another angel came out to meet him, Mgbe mmụọ ozi na-ekwuru m okwu na-apụ, mmụọ ozi ọzọ bịara izute ya,
4 and said to him, "Run, tell this young man: 'Jerusalem will settle like open country, with so many people and livestock in her.' ọ sịrị ya, “Gbaa ọsọ, gwa nwa okorobịa ahụ, sị, ‘Obodo na-enweghị mgbidi ka Jerusalem ga-abụ, nʼihi ọtụtụ igwe mmadụ na anụmanụ ga-ejupụta nʼime ya.
5 I myself will be a wall of fire around her, declares our Father, and I will be the glory within her.'" Ma mụ onwe m ga-abụrụ ya mgbidi ọkụ nke ga-agba ya gburugburu.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Aga m aghọ ebube nʼetiti ya.’
6 "Come! Come! Flee from the land of the north, declares our Father, for I scattered you like the four winds of heaven, declares our Father. “Bịa, lee anya! Sitenụ nʼala dị nʼugwu gbapụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “nʼihi na achụsasịrị m unu nye ikuku anọ nke eluigwe,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
7 Come, Zion! Escape, you who live with the daughter of Babylon. “Bịanụ, unu ndị bi na Zayọn. Gbalaganụ, unu ndị bi nʼala nke ada Babilọn.”
8 This is what the Father of heaven's armies says—after his glory sent me against the nations who plundered you: whoever touches you touches the apple of his eye: Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Mgbe Onye ahụ dị ebube zipụrụ m ịga megide mba ndị ahụ niile kwakọọrọ ihe unu. Nʼihi na onye ọbụla metụrụ unu aka bụ mkpụrụ anya m ka ọ na-emetụ aka.
9 For look, I will wave my hand over them, and they will become plunder for those who served them. Then you will know the Father of heaven's armies sent me. Aghaghị m iweli aka m imegide ha, meekwa ka ndị ohu ha kwakọrọ ihe niile ha nwere. Mgbe ahụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m.
10 Sing and rejoice, daughter of Zion! For look, I am coming to live among you, declares our Father. “Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
11 "Many nations will join our Father that day and become my children. I will live among you, and you will know the Father of heaven's armies sent me to you. “Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ mba dị iche iche ga-adịnyere Onyenwe anyị, bụrụkwa ndị nke m. Aga m ebi nʼetiti gị, ị ga-amatakwa na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ka m bịakwute gị.
12 And our Father will claim Judah as his portion in the holy land, and again choose Jerusalem. Onyenwe anyị ga-eketa Juda dịka oke ya nʼime ala ahụ dị nsọ. Ọ ga-ahọrọkwa Jerusalem ọzọ.
13 Be silent, all flesh, before our Father, for he stirs himself from his holy dwelling." Derenụ duu nʼihu Onyenwe anyị, unu mmadụ niile, nʼihi na o sitela nʼebe obibi ya dị nsọ kpalie onwe ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]