Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Zechariah 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then he showed me Joshua the high priest standing before the messenger of our Father, with the Accuser at his right hand to accuse him. Mgbe ahụ, o gosiri m Joshua onyeisi nchụaja ka ọ na-eguzo nʼihu mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, na ekwensu ka ọ na-eguzo nʼaka nri ya ibo ya ebubo.
2 And our Father said to the Accuser, "May he rebuke you, Accuser! May he who has chosen Jerusalem rebuke you! Is this man not a burning stick snatched from the fire?" Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Onyenwe anyị basiere gị mba ike, gị ekwensu. Onyenwe anyị, onye họpụtara Jerusalem, basiere gị mba ike. Nwoke a, ọ bụghị ọlọkọ ọkụ na-ere ere, nke e si nʼime ọkụ gụpụta?”
3 Now Joshua was dressed in filthy garments as he stood before the messenger. Mgbe Joshua guzo nʼihu mmụọ ozi ahụ, uwe ya ruru unyi.
4 He said to those standing before him, "Remove his filthy clothes." Then to Joshua: "See, I've taken your guilt away, and I'll dress you in fine robes." Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya okwu sị, “Lee, ewepụla m mmehie gị, ma ugbu a, aga m eyikwasị gị uwe mmemme ndị a.”
5 Then I said, "Put a clean turban on his head." So they put it on his head and dressed him, while the messenger of our Father stood by. Ekwuru m, “Ka ha were ezi akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi.” Ya mere ha weere akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi, yikwasịkwa ya uwe ọhụrụ. Mmụọ ozi Onyenwe anyị guzokwa nʼebe ahụ.
6 Then the messenger of our Father solemnly charged Joshua: Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị,
7 "This is what the Father of heaven's armies says: If you walk in my ways and keep my requirements, you will govern my house and oversee my courts, and I will give you a place among these standing here. “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije nʼụzọ m niile, ọ bụrụkwa na i debe ihe niile m nyere gị nʼiwu, ị ga-abụ onyeisi ezinaụlọ m, ị ga-elekọta ụlọnsọ m anya, aga m enyekwa gị ọnọdụ nʼetiti ndị a niile guzo nʼebe a.
8 Listen now, Joshua the high priest, you and your companions seated before you, for they are men who are a sign: I am about to bring my servant, the Branch. “ ‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ.
9 Look at the stone I set before Joshua: seven eyes on that one stone. I will engrave its inscription, declares the Father of heaven's armies, and I will remove this land's guilt in one day. Lee, nkume nke m guzobere nʼihu Joshua. Nkume ahụ nwere akụkụ asaa nʼahụ ya, aga m egbunye akara dee ihe nʼelu ya. Aga m ewezugakwa mmehie nke ala a nʼotu ụbọchị.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
10 In that day, declares the Father of heaven's armies, each will invite his neighbor under his vine and under his fig tree." “ ‘Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-akpọbata mmadụ ibe ya, ka ọ bịa soro ya nọdụ nʼokpuru osisi vaịnị ya, na nʼokpuru osisi fiig ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]