Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Zechariah 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In Darius's second year, eighth month, our Father's word came to Zechariah son of Berechiah, son of Iddo the prophet: Nʼọnwa nke asatọ, nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya nwa Berekaya, nwa Ido, bụ onye amụma ntị, na-asị,
2 Our Father was very angry with your ancestors. “Onyenwe anyị were oke iwe megide nna unu ha.
3 So tell them: This is what the Father of heaven's armies says: Return to me, declares the Father of heaven's armies, and I will return to you. So says the Father of heaven's armies. Nʼihi ya, gwa ha, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. ‘Lọghachikwutenụ m,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara, ‘Mụ onwe m kwa ga-alọghachikwute unu.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
4 Do not be like your ancestors. To them the earlier prophets proclaimed: This is what the Father of heaven's armies says: Turn now from your evil ways and evil deeds. But they would not listen or heed me, declares our Father. Unu adịla ka ndị nna unu ha, ndị amụma mbụ kpọrọ oku si, Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara: ‘Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ajọ omume unu chigharịa’ ma ha achọghị ịnụ maọbụ gee m ntị, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
5 Your ancestors—where are they now? And the prophets, do they live forever? Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
6 But my words and decrees, which I commanded my servants the prophets—did they not overtake your ancestors? Then they turned back and said, 'Just as the Father of heaven's armies planned to do to us, matching our ways and deeds, so he has dealt with us.' Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ? “Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’ ”
7 On the twenty-fourth day of the eleventh month, Shebat, in Darius's second year, the word of our Father came to Zechariah son of Berechiah, son of Iddo the prophet: Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị:
8 During the night I had a vision—and there before me was a man riding a red horse, standing among the myrtle trees in a ravine, and behind him were red, brown, and white horses. Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa.
9 I asked, 'What are these, my lord?' The angel talking with me said, 'I will show you what they are.' Ajụrụ m, “Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?” Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu sịrị m, “Aga m egosi gị ihe ha bụ.”
10 The man among the myrtle trees answered, 'These are the ones our Father sent to patrol the earth.' Mgbe ahụ onye ahụ guzo nʼetiti osisi mietul ndị ahụ sịrị, “Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị zitere ka ha jegharịa nʼụwa niile.”
11 They reported to the messenger of our Father standing among the myrtle trees, 'We have patrolled the earth; the whole earth sits at rest and peace.' Ha sịrị mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nke na-eguzo nʼetiti osisi mietul ahụ, “Anyị ejegharịala nʼụwa niile, ma lee anyị chọpụtara na ụwa niile nọ nʼudo, dịkwa jụụ.”
12 Then the messenger of our Father said, 'Father of heaven's armies, how long will you hold back mercy from Jerusalem and Judah's cities, angry with them these seventy years?' Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, “Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?”
13 So our Father spoke kind and comforting words to the angel who was talking with me. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara mmụọ ozi ahụ guzo na-agwa m okwu, okwu nkasiobi na okwu ọma dị iche iche.
14 Then the angel talking with me said, 'Proclaim: This is what the Father of heaven's armies says: I am very jealous for Jerusalem and Zion,' Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, “Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ,
15 but I am very angry with the secure nations; I was only a little angry, but they added to the harm. ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’
16 So our Father says: I will return to Jerusalem with mercy; there my house will be rebuilt, declares the Father of heaven's armies, and the measuring line will be stretched over Jerusalem. “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
17 Proclaim further: So says the Father of heaven's armies: My cities will again overflow with prosperity; our Father will again comfort Zion and again choose Jerusalem. “Kwusaakwa ọzọ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọganihu ga-adịkwa nʼobodo m niile ọzọ. Onyenwe anyị ga-akasị Zayọn obi ọzọ, ma họpụtakwa Jerusalem.’ ”
18 Then I looked up, and there before me were four horns. Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ.
19 I asked the angel talking with me, 'What are these?' He said, 'These are the horns that scattered Judah, Israel, and Jerusalem.' Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sị, “Gịnị ka ihe ndị a bụ?” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ mpi ndị ahụ chụsasịrị Juda, na Izrel, na Jerusalem.”
20 Then our Father showed me four craftsmen. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ.
21 I asked, 'What are these coming to do?' He said, 'These horns scattered Judah so no one could lift his head; but these craftsmen came to terrify them and throw down the horns the nations raised against Judah's land to scatter it.' Asịrị m, “Gịnị ka ndị na-abịa ime?” Ọ zaghachiri m, “Ndị a bụ mpi anọ ndị ahụ chụsasịrị Juda, ime ka onye ọbụla ghara inwe ike iwelite isi ya. Ma ndị a abịala imenye ha ụjọ, na ịtụda mpi mba niile, bụ ndị ahụ buliri mpi ha imegide ala Juda, na ịchụsa ndị ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]