Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ruth 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then her mother-in-law Naomi said, "My daughter, shouldn't I seek a home for you, so it goes well for you? Otu ụbọchị, Naomi, nne di Rut, gwara ya okwu sị, “Nwa m nwanyị, ọ bụ na o rubeghị mgbe m ga-achọtara gị ụlọ nke aka gị, ebe a ga-anọ lekọtazie gị anya nke ọma?
2 Isn't Boaz, whose young women you were with, our relative? Tonight he winnows barley at the threshing floor. Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka.
3 Wash, perfume yourself, put on your cloak, and go down to the threshing floor. Don't reveal yourself to the man until he finishes eating and drinking. Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka, ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.
4 When he lies down, note the place; go uncover his feet and lie down—he'll tell you what to do." Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”
5 And Ruth said to her, "All that you say I will do." Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.”
6 So she went down to the threshing floor and did everything her mother-in-law had told her. Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya.
7 Boaz ate, drank, and felt good, then lay down at the end of the grain heap. She came secretly, uncovered his feet, and lay down. Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya.
8 At midnight the man was startled, turned over, and there lay a woman at his feet! Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
9 "Who are you?" he asked. "I am Ruth, your servant," she said. "Spread your cloak's corner over your servant, for you are a redeemer." Ọ jụrụ ya sị, “Ị bụ onye?” Rut zara ya sị, “Abụ m Rut, ohu gị nwanyị, onyenwe m. Were ọnụ ọnụ akwa gị kpukwasị m, nʼihi na ị bụ onye agbụrụ mgbapụta m dị nso.”
10 He said, "Blessed are you by our Father, my daughter. This last kindness is better than the first, since you didn't chase young men, poor or rich. Boaz zara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị, nwa m nwanyị. Ịhụnanya i gosiri ugbu a akarịala nke i gosiri na mbụ, nʼihi na i gbasoghị ụmụ okorobịa, ma ha bụ ọgaranya maọbụ ogbenye.
11 Now, my daughter, don't be afraid. I'll do all you ask, for my whole town knows you're a worthy woman. Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na ị bụ onye nwere ezi agwa.
12 Now it is true that I am a redeemer, yet there is a redeemer nearer than I. Ọ bụ ezie na m bụ onye mgbapụta dị nso nke ezinaụlọ anyị, ma o nwere onye ọzọ dị ezi nso karịa m.
13 Stay tonight. In the morning, if he'll redeem you—good, let him redeem. If not, as our Father lives, I will redeem you. Lie down until morning." Nọdụ nʼebe a nʼabalị a. Nʼụtụtụ, ọ bụrụ na onye ahụ ekwere imezu ọrụ ya dịka onye mgbapụta, ya rụzuo ya. Ọ bụrụ na o kwere, ọ dị mma, ọ bụrụkwanụ na o kweghị, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m emezu ya. Ugbu a, dinara ala ruo ụtụtụ.”
14 She lay at his feet until morning, rose before anyone was recognizable, for he said, "No one may know a woman came to the threshing floor." Ya mere, Rut dinara nʼụkwụ ya ruo ụtụtụ. Ma chi abọzibeghị nke ọma mgbe o si nʼebe ahụ bilie nʼihi na Boaz sịrị ya, “Ekwela ka onye ọbụla mata na nwanyị bịara nʼebe ịzọcha ọka.”
15 He said, "Bring the shawl you're wearing; hold it out." She held it out. He measured six portions of barley, put it on her, and went into the city. O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo.
16 When Ruth came to her mother-in-law, Naomi asked, "How did it go, my daughter?" She told her all the man had done for her. Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?” Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị,
17 She said, "He gave me these six measures of barley, saying, 'Don't return to your mother-in-law empty-handed.'" “Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’ ”
18 Naomi said, "Wait, my daughter, until you know the outcome, for the man won't rest until he settles it today." Naomi zara si ya, “Chere, nwa m nwanyị, ruo mgbe ị ga-ahụ otu okwu a ga-esi bie. Nwoke a agaghị ezu ike tutu ruo mgbe o kwubiri okwu a taa.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]