Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ruth 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Naomi had a relative through her husband, a prominent, wealthy man from Elimelech's clan, named Boaz. Ma Naomi nwere otu nwanne di ya, onye bara ụba, bụrụkwa onye a maara nke ọma, onye si nʼagbụrụ Elimelek. Aha nwoke a bụ Boaz.
2 Ruth the Moabite said to Naomi, "Let me glean grain behind anyone who favors me." She said, "Go, my daughter." Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.” Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.”
3 So she went out and gleaned behind the harvesters, and she happened to come to the field belonging to Boaz, of Elimelech's family. Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek.
4 Just then Boaz came from Bethlehem, telling the harvesters, "May our Father be with you." "Our Father bless you," they replied. Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “Onyenwe anyị nọnyere unu.” Ha niile zakwara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị.”
5 Then Boaz said to his foreman, "Whose young woman is this?" Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”
6 The foreman answered, "She's the young Moabite woman who returned with Naomi from Moab's country. Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta.
7 She said, 'Please let me glean and gather among the sheaves behind the harvesters.' She came and has stayed from morning till now, resting only briefly in the shelter." Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”
8 Boaz said to Ruth, "Listen, my daughter. Don't glean in another field or leave here; stay close to my young women. Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a.
9 Watch the field they harvest and follow behind them. I've told the young men not to touch you. When thirsty, drink from the jars the young men filled." Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.”
10 She bowed facedown to the ground and asked him, "Why have I found favor in your eyes that you notice me, a foreigner?" Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?”
11 Boaz answered, "I've heard all you did for your mother-in-law since your husband died—how you left your father, mother, and homeland to come to a people you didn't know before. Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ.
12 May our Father repay your deed; may our Father, the God of Israel, under whose wings you've come for refuge, reward you fully." Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”
13 "May I find favor in your eyes, my lord," she said, "for you've comforted me and spoken kindly to your servant, though I'm not one of your servants." Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.”
14 At mealtime Boaz said, "Come here, eat some bread, dip your piece in the wine vinegar." She sat beside the harvesters; he passed her roasted grain. She ate her fill and had some left. Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.
15 When she rose to glean, Boaz ordered his young men, "Let her glean even among the sheaves; don't shame her. Mgbe o biliri ịchịkọtakwa ọka, Boaz nyere ụmụ okorobịa ya iwu, “Hapụnụ ya ka ọ chịkọta ọka ọ bụladị nʼetiti ukwu ọka ndị guzo eguzo, unu agwala ya okwu ihere ọbụla.
16 Instead, pull stalks from the bundles for her and leave them for her to pick up, and don't correct her." Unu sitekwa nʼukwu ọka mịpụtara ya ụfọdụ tụsara ya nʼala ka ọ tụtụrụ. Unu abarala ya mba.”
17 She gleaned in the field till evening, then beat out what she'd gathered—about twenty quarts of barley. Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel.
18 She carried it to town; her mother-in-law saw how much she'd gleaned. She also brought out and gave her what she'd saved after eating her fill. O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.
19 Her mother-in-law asked, "Where did you gather today? Where did you work? Blessed be the man who noticed you!" Ruth named whose field: "The man I worked with today is Boaz." Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.” Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.”
20 Naomi told her daughter-in-law, "May our Father bless him, whose kindness hasn't left the living or the dead." She added, "He's a close relative, one of our redeemers." Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”
21 Then Ruth the Moabite said, "He even told me, 'Stay with my workers until they finish all my harvest.'" Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ”
22 Naomi told her daughter-in-law Ruth, "Good, my daughter—go out with his young women, so you won't be harmed in another field." Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.”
23 She stayed close to Boaz's young women, gleaning until the barley and wheat harvests ended, and lived with her mother-in-law. Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]