Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ruth 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When the judges ruled, a famine struck the land, and a man from Bethlehem in Judah went with his wife and two sons to stay a while in the fields of Moab. Nʼoge ndị ahụ, mgbe ndị ikpe na-achị, oke ụnwụ dara nʼala Izrel. Nʼihi ụnwụ a, otu nwoke, onye Betlehem, obodo dị na Juda, kwakọọrọ ihe ya niile, duru nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom abụọ, hapụ obodo ya gaa biri dịka ọbịa nʼala Moab.
2 The man was named Elimelech, his wife Naomi, and his two sons Mahlon and Chilion—Ephrathites from Bethlehem in Judah. They went to the territory of Moab and stayed there. Aha nwoke a bụ Elimelek. Aha nwunye ya bụ Naomi, ma aha ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Mahlọn na Kilịọn. Ha bụ ndị Efrat si Betlehem nke dị na Juda. Ha bịarutere nʼala Moab biri nʼebe ahụ.
3 Then Elimelech, Naomi's husband, died, and she was left with her two sons. Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ.
4 They married Moabite women—Orpah and Ruth—and lived there about ten years. Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri.
5 Both Mahlon and Chilion also died, and Naomi was left without her two children and husband. Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ.
6 In Moab's fields, Naomi heard that our Father had attended his people, giving them food, so she set out with her two daughters-in-law to return from there. Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na Onyenwe anyị eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel.
7 She left the place where she had been, with her two daughters-in-law, and they went on the road back to the land of Judah. Ya mere, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ hapụrụ ala Moab ebe ha bi kemgbe, malite ịgbaso ụzọ ha ga-esi laghachi nʼala Juda.
8 Naomi told her two daughters-in-law, "Return, each to your mother's home. May our Father deal kindly with you, as you dealt with the dead and with me. Mgbe ahụ, Naomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ okwu sị ha, “Ngwa, onye ọbụla nʼime unu laghachi nʼụlọ nne ya. Ka Onyenwe anyị gosi unu obiọma dịka unu si gosi mụ onwe m, na ndị unu nwụrụ anwụ.
9 May our Father give each of you rest in another husband's home." Then she kissed them, and they wept aloud. Ka Onyenwe anyị nyekwa unu di ọzọ ma meekwa ka unu chọta udo nʼezinaụlọ ọzọ.” Mgbe ahụ Naomi suturu ha ọnụ, ha niile kwara akwa.
10 And they said to her, "No—we will return with you to your people." Ma Ọpa na Rut zara Naomi sị ya, “E, anyị agaghị ala. Anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị gị.”
11 Naomi said, "Go back, my daughters. Why go with me? Do I have more sons in my womb to become your husbands? Naomi zara sị ha, “Laghachinụ ụmụ m, ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ga-eji soro m laa? E nwere m ike ịmụta ụmụ ndị ikom ọzọ ndị ga-abụ di unu?
12 Return, my daughters, go, for I'm too old to marry. Even if I said there's still hope, even if I had a husband tonight and bore sons, Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa,
13 would you wait for them until grown? Would you stay unmarried for them? No, my daughters—it's far more bitter for me than you, since our Father's hand has turned against me." unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi na Onyenwe anyị esepụtala aka ya imegide m.”
14 At this they wept aloud again. Then Orpah kissed her mother-in-law goodbye, but Ruth clung to her. Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ.
15 Naomi said, "Look, your sister-in-law went back to her people and her gods. Go back with her." Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.”
16 Ruth said, "Don't push me to leave you or turn back from following you. Where you go, I'll go; where you stay, I'll stay. Your people will be my people, and your God my God. Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m,
17 Where you die I will die, and there I will be buried. May our Father punish me ever so severely if anything but death separates you and me." ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụ kwa ka a ga-eli m. Ka Onyenwe anyị mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ekwere ka ihe ọzọ, ma ọ bụghị ọnwụ, kewaa mụ na gị.”
18 When Naomi saw that Ruth was determined to go with her, she said no more to her. Mgbe Naomi hụrụ na Rut ekpebiela nʼime onwe ya iso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya okwu ọzọ.
19 So both of them traveled until they reached Bethlehem. When they entered Bethlehem, the whole town stirred over them, and the women said, "Is this Naomi?" Ya mere, ha abụọ gagidere ije rute Betlehem. Mgbe ha batara Betlehem, obodo ahụ mere mkpọtụ, nʼihi nlọta ha. Ndị inyom jụrụ sị, “Ọ bụ Naomi bụ nke a nʼezie?”
20 "Don't call me Naomi," she said. "Call me Mara—the Almighty has dealt very bitterly with me. Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu.
21 I went away full, but our Father has brought me back empty. Why call me Naomi, when our Father has afflicted me and the Almighty has brought misfortune upon me?" Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma Onyenwe anyị emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.”
22 So Naomi returned from the fields of Moab with Ruth the Moabite, her daughter-in-law, who came back with her. They reached Bethlehem as barley harvest began. Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]