Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ruth 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Boaz went up to the town gate and sat. When the family redeemer he'd mentioned came by, Boaz said, "Come sit here, friend." So he came and sat. Ya mere, Boaz pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ, nọdụ ala nʼebe ahụ. Ọ dịghị anya onye mgbapụta ahụ dị nso nke Boaz kwuru okwu banyere ya si nʼebe ahụ na-agafe. Boaz kpọrọ ya sị, “Enyi m bịa nọdụ ala.” Ọ bịara nọdụ ala.
2 Then he took ten of the town elders and said, "Sit here." So they sat down. Boaz kpọrọ mmadụ iri, ndị bụ ndị okenye obodo ahụ, gwa ha, “Nọdụnụ ala nʼebe a.” Ha mere otu ahụ.
3 He told the family redeemer, "Naomi, back from Moab's country, is selling the parcel of land that belonged to our brother Elimelech. Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek.
4 So I decided to tell you: buy it before those sitting here and my people's elders. If you'll redeem it, redeem it. If not, tell me so I know, since no one but you can redeem, and I'm after you." He said, "I will redeem it." Ahụrụ m na o kwesiri ka m buru ụzọ gwa gị ka ị zụọ ya nʼihu ndị a nọ ọdụ nʼebe a, na nʼihu ndị okenye obodo anyị. Ọ bụrụ na ị ga-agbara ya, gwa m, ọ bụrụkwanụ na ị gaghị agbara ya, gwa m, ka m mara ihe m ga-eme. Nʼihi na ọ bụ gị ka ọ dịrị ịgbapụta ya. Mụ onwe m na-esote gị.” Ọ zara sị, “Aga m agbapụta ya.”
5 Boaz said, "The day you buy the field from Naomi, you also acquire Ruth the Moabite, the dead man's widow, to raise up his name on his inheritance." Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.”
6 Then the redeemer said, "I can't redeem it myself, or I'd ruin my own inheritance. You take my right of redemption; I cannot redeem it." Na nke a, onye nchekwa mgbapụta ahụ sịrị, “Apụghị m ịgbapụta ya nʼihi na e nwere m ike itinye ihe nketa m na nsogbu. Gị onwe gị gbapụta ya. Nke a agaghị ekwe m omume.”
7 Earlier in Israel, to make any deal for redeeming or exchanging property binding, a man would take off his sandal and give it to the other. This confirmed agreements in Israel. Na mgbe ochie nʼala Izrel, ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel.
8 So when the family redeemer said to Boaz, "Buy it for yourself," he took off his sandal. Nʼihi ya, mgbe nwoke ahụ gwara Boaz sị ya, “Zụrụ ala ahụ nʼonwe gị,” o yipụtara akpụkpọụkwụ ya.
9 Then Boaz told the elders and all the people, "You are witnesses today that I have bought from Naomi all that belonged to Elimelech, Chilion, and Mahlon. Mgbe ahụ, Boaz kwupụtara na ntị ndị okenye ndị ahụ na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Unu bụ ndị akaebe na esitela m nʼaka Naomi zụrụ ala niile Elimelek, na Kilịọn na Mahlọn nwere.
10 I have also taken Ruth the Moabite, Mahlon's widow, as my wife, to preserve the dead man's name with his inheritance, so his name won't vanish from his family or his hometown's records. You are witnesses today." Azụrụkwala m Rut onye Moab, nwunye Mahlọn ka ọ bụrụ nwunye m, ime ka aha onye nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide, ka aha ha hapụ ifu nʼetiti ndị ikwu ya maọbụ site nʼobodo ebe amụrụ ya. Taa unu niile bụ ndị akaebe m.”
11 Then all the people at the gate and the elders said, "We are witnesses. May our Father make the woman entering your house like Rachel and Leah, who together built the house of Israel. Prosper in Ephrathah and be famous in Bethlehem. Mgbe ahụ, ndị okenye na ndị niile nọ nʼọnụ ụzọ ama kwuru sị, “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Onyenwe anyị mee nwanyị a na-abata nʼezinaụlọ gị ka ọ dịrị ka Rechel na Lịa, ndị ebo Izrel niile sitere na ha pụta! Ka ị bụrụkwa ọgaranya nʼagbụrụ Efrata, ghọọkwa onye a ma ama na Betlehem.
12 May your house be like Perez's, whom Tamar bore to Judah, through the children our Father gives you by this young woman." Site nʼụmụ Onyenwe anyị ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez onye Tama mụụrụ Juda.”
13 So Boaz took Ruth as his wife. He slept with her, and our Father let her conceive, and she gave birth to a son. Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.
14 Then the women said to Naomi, "Praise our Father, who has not left you today without a family redeemer—may his name become famous in Israel! Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile.
15 He will renew your life and sustain your old age, for your daughter-in-law who loves you, worth more to you than seven sons, has borne him." Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.”
16 Then Naomi took the child, held him on her lap, and cared for him. Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya.
17 The neighbor women named him: "A son is born to Naomi!" They called him Obed, father of Jesse, father of David. Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid.
18 Now these are the generations of Perez: Perez fathered Hezron, Nke a bụ usoro ndị a mụrụ site na Perez. Perez mụrụ Hezrọn
19 Hezron fathered Ram, Ram fathered Amminadab, Hezrọn mụrụ Ram Ram mụrụ Aminadab
20 Amminadab fathered Nahshon, Nahshon fathered Salmon, Aminadab mụrụ Nashọn Nashọn mụrụ Salmọn
21 Salmon fathered Boaz, Boaz fathered Obed, Salmọn mụrụ Boaz Boaz mụrụ Obed
22 Obed fathered Jesse, and Jesse fathered David. Obed mụrụ Jesi Jesi mụrụ Devid.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]