Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Romans 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 What should we say, then? Should we go on sinning so that grace may increase? Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba?
2 Absolutely not! How can we who died to sin still live in it? E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị?
3 Or are you unaware that all of us baptized into Christ Jesus were baptized into his death? Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ.
4 So we were buried with him through baptism into death, that as Christ was raised from the dead through our Father's glory, we too might walk in newness of life. Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ.
5 For if we've been joined to his death's likeness, we'll surely also be joined to his resurrection. Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ.
6 We know our old self was crucified with him to destroy sin's body, so we'd no longer be enslaved to sin. Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie.
7 For anyone who has died has been set free from sin. Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị.
8 Now if we died with Christ, we believe that we will also live with him. Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.
9 For we know Christ, raised from the dead, never dies again; death no longer rules him. Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ.
10 For the death he died, he died to sin once for all; but the life he lives, he lives to our Father. Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.
11 In the same way, count yourselves dead to sin but alive to our Father in Christ Jesus. Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
12 Therefore do not let sin reign in your mortal body so that you obey its desires. Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi.
13 Do not offer your body's parts to sin as weapons for wrongdoing; instead, offer yourselves to our Father as those brought from death to life, and your body's parts to him as weapons for righteousness. Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.
14 For sin will not have mastery over you, because you are not under law but under grace. Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara.
15 What then? Should we sin because we are not under law but under grace? Absolutely not! Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị.
16 Don't you know that offering yourselves to someone as slaves to obey makes you slaves of whoever you obey—whether sin, leading to death, or obedience, leading to righteousness? Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume?
17 Thanks to our Father: you were slaves of sin, but you obeyed from the heart the teaching pattern you were entrusted to. Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu.
18 Having been set free from sin, you became slaves of righteousness. Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.
19 I speak humanly, since your flesh is weak. As you offered your body's parts as slaves to impurity and lawlessness, resulting in more lawlessness, now offer them as slaves to righteousness, resulting in holiness. Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ.
20 For when you were slaves of sin, you were free from righteousness. Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume.
21 What did you gain then from what you're now ashamed of? For those things end in death. Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ.
22 But now, freed from sin and enslaved to our Father, your fruit leads to holiness, and the end, eternal life. Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi.
23 For the wages of sin is death, but our Father's gift is eternal life in Christ Jesus our Lord. Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]