Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Romans 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Or don't you know, brothers—I'm speaking to people who know the law—that the law rules over a person only while he lives? Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya?
2 A married woman is bound by law to her husband while he lives; if he dies, she is free from the law of the husband. Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye.
3 While her husband lives, she's called an adulterous woman if she becomes another man's wife; but if he dies, she's free from that law—not an adulterous woman if she marries another. A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ.
4 So, my brothers and sisters, you too were put to death to the law through Christ's body, to belong to another—the one raised from the dead—so we might bear fruit for our Father. Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke.
5 For when we were in the flesh, sin's passions, stirred by the law, worked in our bodies to produce fruit for death. Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.
6 But now we're released from the law, dead to what held us bound, so we serve in the new way of the Spirit, not the old way of the written code. Ugbu a, a tọghapụla anyị pụọ nʼaka iwu ebe anyị nwụrụ nye ihe ndị kere anyị agbụ na mbụ, anyị anaghị ebikwa ndụ nʼusoro iwu ochie nke e dere nʼakwụkwọ, kama anyị na-eje ozi nʼusoro ndụ ọhụrụ nke mmụọ.
7 What then should we say? Is the law sin? Never! Yet I wouldn't have known sin except through the law—nor would I have known craving, had the law not said, "Do not crave what isn't yours." Ugbu a, gịnị ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Nʼezie, mbaa! Agaraghị m ama ihe mmehie bụ ma ọ bụghị site nʼiwu. Ọ bụrụ na iwu asịghị, “Enwela anya ukwu,” agaraghị m ama na ọ bụ mmehie.
8 But sin, seizing an opening through the commandment, produced in me every covetous craving. For apart from law, sin is dead. Ma mmehie sitere nʼiwu a megidere ọchịchọ ọjọọ, mee ka echiche m mgbe niile bụrụ ihe gbasara ihe ọjọọ, na otu m ga-esi mee ha. A sị na iwu adịghị, mmehie agaraghị adị.
9 I once lived apart from law; but when the commandment came, sin revived, and I died. Na mbụ, abụ m onye dị ndụ mgbe iwu na-adịghị, ma mgbe iwu bịara, e mere ka mmehie nwe ntute.
10 I found that the very commandment that was meant to bring life actually brought death. Anwụrụ m, ma chọpụta na iwu ahụ kwesiri iwetara m ndụ ghọziri ihe wetara ọnwụ.
11 For sin, seizing the opportunity through the commandment, deceived me, and through the commandment killed me. Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m.
12 So then, the law is holy, and the commandment is holy and righteous and good. Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma.
13 Did the good, then, bring death to me? Absolutely not! Rather, sin—to be exposed as sin—produced death in me through the good, so that through the commandment sin might become extremely sinful. Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.
14 For we know the law is spiritual, but I am fleshly, sold under sin. Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie.
15 I don't understand what I do; for I don't do what I want, but what I hate I do. O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile.
16 If I do what I don't want, I agree the law is good. Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma.
17 So now, it's no longer I who do it, but sin living in me. Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m.
18 For I know nothing good lives in me—that is, in my flesh. For I want to do good but can't carry it out. O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m.
19 For I don't do the good I want, but the evil I don't want—that I keep doing. Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme.
20 Now if I do what I don't want, it's no longer I doing it, but sin living in me doing it. Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha.
21 So I find this law: when I want to do good, evil lies close at hand. Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime.
22 For in my inner being I delight in the law of our Father. Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru.
23 But I see another law in my body, warring against the law of my mind and taking me captive to the law of sin at work in my body. Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m.
24 What a wretched man I am! Who will rescue me from this body of death? Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ?
25 Thanks to our Father through Jesus Christ our Lord! So then, I myself serve the law of our Father with my mind, but with my flesh, the law of sin. Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]