Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Romans 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So, since we are made right by faith, we have peace with our Father through our Lord Jesus Christ. Ya mere, ebe e sitere nʼokwukwe mee ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume, udo dị ugbu a nʼetiti anyị na Chineke site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2 Through whom we've gained access by faith into this grace we stand in, and we rejoice in hope of our Father's glory. Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara nke anyị na-eguzo nʼime ya ugbu a. Anyị nọ nʼọṅụ nweekwa olileanya na a ga-eme ka anyị keta oke nʼebube Chineke.
3 Not only that, but we also boast in our suffering, since suffering produces endurance, Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi.
4 and endurance produces character, and character produces hope. Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya.
5 Hope doesn't put us to shame, because our Father's love has been poured into our hearts through the Holy Spirit given to us. Olileanya na-eme ka anyị guzo chịm, nʼihi na Chineke awụnyela ịhụnanya ya nʼime obi anyị site nʼonyinye Mmụọ Nsọ.
6 While we were still weak, at the right time Christ died for the wicked. Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọbụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Kraịst bịara nwụọ ọnwụ nʼihi anyị bụ ndị mmehie.
7 Rarely would anyone die for a righteous person, though for a good person someone might even dare to die. A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nʼihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nʼihi ezi mmadụ.
8 But our Father shows his own love for us: while we were still sinners, Christ died for us. Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
9 Much more then, now made right by his blood, we will be saved through him from the wrath. Ebe a gụrụ anyị dịka ndị ezi omume site nʼọbara ya, nke karịrị nke a, a ga-esitekwa na ya zọpụta anyị site nʼọnụma Chineke.
10 If, as enemies, we were reconciled to our Father through the death of his Son, how much more, now reconciled, will his life save us? Nʼihi na, ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro Chineke, e mere ka anyị na ya dị nʼudo site nʼọnwụ Ọkpara ya, nke karịrị nke a bụ, ebe ọ bụ na anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya.
11 Not only that—we also rejoice in our Father through our Lord Jesus Christ, through whom we have now received reconciliation. Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime Chineke site na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye anyị sitere na ya nata ịdị na mma a ugbu a.
12 So, as sin entered the world through one man, and death through sin, death spread to everyone, since all sinned. Dịka o siri dị, ọ bụ site nʼaka otu nwoke ka mmehie siri bata nʼụwa. Ọ bụkwa mmehie a wetara ọnwụ. Ugbu a, ọnwụ erutela onye ọbụla aka nʼihi na mmadụ niile emehiela.
13 Before the law, sin was already in the world; but sin isn't counted where there's no law. Ma tupu e nye iwu, mmehie dị nʼụwa. Ma a dịghị agụkọta mmehie mgbe iwu na-adịghị.
14 Still, death ruled from Adam to Moses, even over those whose sin didn't match Adam's wrongdoing—Adam foreshadows the one to come. Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọbụla site nʼoge Adam ruo nʼoge Mosis. O metụtara ọ bụladị ndị mmehie ha na-adịghị ka nke Adam, onye bụ ihe atụ nke onye ahụ gaje ịbịa.
15 But the gift is not like the sin: if many died through one man's sin, much more has our Father's grace and the gift by the grace of the one man Jesus Christ overflowed to many. Ma onyinye a adịghị ka njehie ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ọtụtụ nwụrụ site na mmehie nke otu mmadụ, lee ka o siri bụrụ ihe dị ukwu karịa na amara Chineke na onyinye amara sitere nʼotu onye bụ Jisọs Kraịst ga-ababiga ụba oke rute ọtụtụ mmadụ.
16 And the gift is not like the result of that one man's sin: judgment from one sin brought condemnation, but the gift from many sins brought justification. Ọzọ, onyinye a adịghị ka ihe mmehie mmadụ mụpụtara. Nʼihi na ikpe ahụ sooro mmehie otu onye weta ọmụma ikpe, ma onyinye ahụ sooro ọtụtụ njehie weta ịgụ mmadụ nʼonye ikpe na-amaghị.
17 For if death reigned through that one man because of one trespass, how much more will those receiving grace's overflow and the gift of righteousness reign in life through the one man, Jesus Christ. Ya mere, ọ bụrụ na ọnwụ chịrị ọchịchị site na njehie nke otu onye, ọ bụghị ihe dị ukwu karịa na ndị nabatara onyinye amara Chineke bara ụba, ya na onyinye ezi omume, ga-achị achị na ndụ site nʼotu onye ahụ bụ Jisọs Kraịst.
18 So then, as one trespass condemned everyone, one righteous act brings everyone justification and life. Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume.
19 As one man's disobedience made the many sinners, so one man's obedience will make the many righteous. Nʼihi na dịka ọtụtụ mmadụ si bụrụ ndị mmehie nʼihi nnupu isi nke otu nwoke, otu a kwa ka ọtụtụ mmadụ ga-abụkwa ndị ezi omume nʼihi nrube isi nke otu nwoke.
20 Now the law came in so that the trespass might increase, but where sin increased, grace abounded all the more, Iwu bịara mee ka mmehie na-aba ụba, ma dịka mmehie na-aba ụba, amara na-abakwa ụba karịa.
21 so that as sin reigned in death, grace might reign through righteousness to eternal life, through Jesus Christ our Lord. Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]