Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Romans 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 What then should we say that Abraham, our physical forefather, has found? Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ?
2 For if Abraham was justified by works, he has something to boast about—but not before our Father. A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke.
3 For what does Scripture say? Abraham believed our Father, and it was counted to him as righteousness. Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.”
4 To the one who works, wages aren't credited as a gift but as what's owed. Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ ọ rụrụ.
5 But to one who does not work, but trusts him who justifies the wicked, his faith is counted as righteousness. Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume.
6 As David also speaks of the blessing of the person our Father credits righteousness to, apart from works: Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya.
7 "Blessed are those whose lawless deeds are forgiven, and whose sins are covered; “Ngọzị na-adịrị ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile, ndị ekpuchikwara mmehie ha niile.
8 blessed is the one whose sin our Father will never count against him." Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.”
9 Is this blessing only for the circumcised, or also the uncircumcised? We say Abraham's faith was credited as righteousness. Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya.
10 How then was it credited? While he was circumcised, or uncircumcised? Not while circumcised, but while uncircumcised. Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu.
11 He received circumcision as a sign, a seal of the righteousness he had by faith while still uncircumcised, so he would be father of all who believe though uncircumcised, with righteousness credited to them too, Ọ natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe ọ nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ ọ gụrụ dịka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu.
12 and father of the circumcised who are not only circumcised but also walk in the footsteps of the faith our father Abraham had while uncircumcised. Nʼụzọ dị otu a kwa, ọ bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu.
13 For the promise to Abraham and his offspring that he would inherit the world did not come through the law, but through faith's righteousness. Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe.
14 For if those who live by the law are heirs, faith is emptied and the promise nullified. Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla.
15 Law brings wrath; where there is no law, there is no violation. Nʼihi na iwu nʼonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Ma ebe iwu na-adịghị, mmehie adịghịkwa.
16 So it comes by faith, to be by grace, guaranteeing the promise to all the offspring—not only those tied to the law but also those who share Abraham's faith, father of us all, Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile.
17 as it is written, "I have made you father of many nations"—before our Father, in whom he believed, who gives life to the dead and calls things that do not exist into being. Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị.
18 Against hope, he believed in hope, becoming father of many nations, as he'd been told: "So will your offspring be." Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.”
19 Not weak in faith, he considered his own body already as good as dead—he was about one hundred—and Sarah's womb lifeless. Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ.
20 He did not doubt our Father's promise in lack of faith, but was strengthened in faith, giving glory to our Father, Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto.
21 fully convinced that what our Father had promised he was also able to do. O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa.
22 That is why "it was credited to him as righteousness." Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume.
23 But the words "it was credited to him" were written not for his sake alone, Okwu ndị a, “A gụrụ ya nye ya dịka onye ezi omume,” edeghị ya naanị maka ya.
24 and also for us who will be credited with it—those trusting the one who raised our Lord Jesus from the dead, Kama e dere ya nʼihi anyị bụ ndị kwere nʼonye ahụ mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie.
25 who was delivered over for our sins and raised to make us right with our Father. Onye a rara nye ka ọ nwụọ nʼihi mmehie anyị niile, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]