Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Romans 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 What advantage, then, does the Jew have? Or what is the value of circumcision? Ọ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nʼihi na ọ bụ onye Juu? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke dị na-ebiri mmadụ ugwu?
2 Much in every way. First of all, they were entrusted with the very words of our Father. Ọ bara uru nʼụzọ niile. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nʼaka.
3 What then? If some were unfaithful, will their unfaithfulness nullify the faithfulness of our Father? Gịnị ga-emezi ma ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime ha ekwesighị ntụkwasị obi? Chineke, ọ ga-eji nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha ghara ikwesi ntụkwasị obi?
4 No! Let our Father be true, though every person is a liar. As it is written: "You are proven right in your words, and win when judged." Ọ pụghị ịdị otu a! Kama ka ọ bụrụ ihe pụtara ihe na Chineke bụ onye eziokwu, ma mmadụ niile bụ ndị okwu ụgha, dịka e dere ya, “Ka e nwe ike gosipụta na ị na-ekwu eziokwu mgbe ọbụla i kwuru okwu, na ekpegbukwa mgbe i na-ekpe ikpe.”
5 But if our wrongdoing highlights our Father's righteousness, what do we say? Is our Father unjust to bring wrath on us? (I speak in human terms.). Ma ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume Chineke pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na Chineke adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nʼihi ajọ omume anyị? (Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ.)
6 Certainly not! For then how could our Father judge the world? Nʼezie, ọ bụghị otu a, ọ bụrụ na ọ bụ otu a, oleekwanụ otu Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe?
7 But if my lie makes our Father's truth overflow to his glory, why am I still judged as a sinner? Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?”
8 Why not say, as some slander us as saying, "Let's do evil so good may come"? Their judgment is deserved. Ọ pụtara na anyị ga-asị, “ka anyị na-eme ihe ọjọọ ka ezi ihe si na ya pụta”? Ụfọdụ ndị mmadụ ji nkwutọ na-ebo m ebubo na m na-akụzi ihe dị otu a, ikpe a mara ha kwesiri ekwesi.
9 What then? Are we better off? Not at all—we've already charged that Jews and Greeks alike are all under sin's grip, Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ.
10 as it is written: "There is no one righteous, not even one; Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
11 no one understands; no one seeks our Father. Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ Chineke.
12 All have turned away; together they have become worthless; no one does good, not even one. Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye.
13 Their throat is an open grave; they use their tongues to deceive." "The venom of snakes is under their lips. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ. Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.
14 Their mouth is full of cursing and bitterness. Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ.
15 Their feet are swift to shed blood; Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara.
16 ruin and misery mark their ways, Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile.
17 and the way of peace they have not known. Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo.
18 There is no fear of our Father before their eyes." Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.”
19 We know whatever the law says applies to those under it, so every mouth is silenced and the whole world stands accountable to our Father. Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ.
20 No one is made right before him by works of the law; the law brings awareness of sin. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie.
21 But now, apart from the law, our Father's righteousness has been revealed, testified to by the Law and the Prophets. Ma ugbu a, emeela ka ezi omume Chineke pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya.
22 This righteousness of our Father comes through faith in Jesus Christ, to all who believe, for there's no distinction, Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya.
23 since all have sinned and fall short of the glory of our Father, Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke.
24 and are justified freely by his grace through the redemption that is in Christ Jesus. Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs.
25 Our Father presented him as the atoning sacrifice, through faith in his blood, to show his righteousness, since in his patience he had passed over sins committed before, Onye Chineke họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja ikpuchi mmehie, site nʼiwufu ọbara ya maka mgbaghara mmehie, nke a ga-anata site nʼokwukwe. Nʼụzọ dị otu a, ọ na-egosipụta ezi omume ya, maka oge gara aga, nʼihi nnagide ya, o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya.
26 to show his righteousness now, so he is both just and the justifier of whoever trusts in Jesus. Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na Jisọs.
27 Where then is boasting? Excluded. By what law? Of works? No—by the law of faith. Mgbe o si otu a dịrị, olee ebe ịnya isi anyị dịkwa? Ajụla ịnabata ya. Ọ bụ site iwu dị aṅa? Ọ bụ nke ọrụ? Mba, kama ọ bụ site nʼokwukwe anyị nwere nʼime Kraịst.
28 For we maintain that a person is justified by faith apart from works of the law. Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru.
29 Or is our Father the Father of Jews only? Not the Father of Gentiles too? Yes, of Gentiles too, Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.
30 since our Father is one, he will justify the circumcised by faith and the uncircumcised through faith. Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume.
31 Do we cancel the law through this faith? Never—we confirm the law. Ọ bụrụ na ọ dị otu a, anyị na-esite nʼokwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị ire? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesiri ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]