Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Romans 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So you have no excuse, whoever you are, when you judge another—in judging them you condemn yourself, since you do the same things. Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ.
2 Now we know that our Father's judgment rightly falls on those who do such things. Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nʼụzọ ziri ezi.
3 Do you think, whoever judges others for such things while doing them yourself, that you'll escape our Father's judgment? Gị bụ mmadụ, gịnị mere i ji na-ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ. I chere na ị ga-agbanarị ikpe Chineke?
4 Or do you despise the riches of his kindness and restraint and patience, not realizing that our Father's kindness is meant to lead you to repentance? Ka ị na-eleda obiọma Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachiobi ya anya? Ị maghị na obiọma Chineke nwere nʼebe ị nọ kwesiri ime ka i site na mmehie gị chegharịa?
5 But because of your hard, unrepentant heart, you are storing up wrath for yourself, for the day of wrath when our Father's righteous judgment will be revealed. Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi.
6 He will repay each person according to what they have done. Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị.
7 To those who through persistent good work seek glory, honor, and immortality, he will give eternal life. Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi.
8 But those who are self-seeking, reject the truth, and follow wickedness face wrath and rage. Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma.
9 Trouble and distress for everyone who does evil—the Jew first, then the Greek, Nsogbu na iru ụjụ ga-abịakwasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ, mbụ, ọ ga-adịrị ndị Juu, emechaa, ọ ga-adịkwara ndị mba ọzọ.
10 but glory, honor, and peace for all who do good—Jew first, then Greek too. Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ.
11 For our Father shows no favoritism. Nʼihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nʼihu.
12 Sinners without the law also perish without it; sinners under the law will be judged by it. Ndị niile mehiere nʼọnọdụ enweghị iwu ga-ala nʼiyi nʼọnọdụ enweghị iwu. Ma ndị niile mehiere megide iwu ahụ ha mara ihe banyere ya ka a ga-ama ikpe dịka iwu siri kwuo.
13 For not those who hear the law are righteous before our Father, but those who obey it will be justified. Nʼihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dịka ndị ezi omume nʼihu Chineke, kama ọ bụ ndị ahụ niile na-eme ihe iwu kwuru ka a ga-agụ ka ndị ezi omume.
14 Indeed, when Gentiles, who do not have the law, do by nature what the law requires, the law is at work within them, even though they do not have the law. Nʼezie, mgbe ndị mba ọzọ bụ ndị na-enweghị iwu sitere nʼobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ iwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede.
15 They show the law's work written on their hearts, their conscience bearing witness, and their conflicting thoughts accusing or defending them. Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ.
16 This happens on the day our Father judges everyone's secrets through Jesus Christ—so my gospel says. Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs.
17 But if you call yourself a Jew, rely on the law, and boast in our Father, Ma ugbu a, gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nʼiwu ahụ, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke,
18 if you know our Father's will and approve what is excellent because you are instructed by the law, ọ bụrụ na ị mara uche ya ma kwenyekwa nʼihe nke ka mma nʼihi na e ziri gị ihe site nʼiwu;
19 if you're convinced you are a guide for the blind, a light for those in darkness, ọ bụrụ na o doro gị anya na ị bụ onyendu nye ndị ìsì, bụrụkwa ìhè nye ndị nọ nʼọchịchịrị,
20 a corrector of the foolish, teacher of the immature, holding in the law the shape of knowledge and truth. ị na-agụkwa onwe gị dịka onye nkuzi nke ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nʼihi na ị maara iwu nke ọma, jupụtakwa nʼamamihe na eziokwu.
21 You teach others—do you not teach yourself? You preach against stealing—do you steal? Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi?
22 You who tell others not to commit adultery—do you commit it? You who detest idols—do you rob temples? Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi?
23 You who boast in the law, do you dishonor our Father by breaking the law? Gị onye na-anya isi na ị maara iwu, ị na-emenye Chineke ihere site nʼimebi iwu ahụ?
24 As it is written: "Our Father's name is blasphemed among the nations because of you." Dịka esi dee ya, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nʼihi unu.”
25 Circumcision helps if you keep the law; break it, and your circumcision becomes being uncircumcised. Obibi ugwu bara uru nʼezie ma ọ bụrụ na ị na-edebe iwu, ma ọ bụrụ na ị na-emebi iwu, obibi ugwu gị dịka mgbe i bighị ugwu.
26 So if the uncircumcised keep the law's requirements, won't their uncircumcision be counted as circumcision? Ọ bụrụ na ndị e bighị ugwu na-edebe ihe iwu kwuru, ọ bụ na a gaghị agụ ebighị ugwu ha dịka obibi ugwu?
27 The physically uncircumcised who keep the law will judge you who, with the letter and circumcision, break the law. Ya bụ, ndị ahụ a na-ebighị ugwu nʼanụ ahụ ma na-edebe iwu ga-ama unu ikpe, bụ ndị nwere iwu ahụ e dere nʼakwụkwọ na ndị e bikwara ugwu ma na-emebi iwu.
28 For being a Jew isn't merely about the outside, nor circumcision merely about the body. Ị bụ ezigbo onye Juu abụghị nke elu ahụ. Ezigbo ibi ugwu abụkwaghị ihe a na-ahụ nʼanụ ahụ.
29 Rather, one is a Jew inwardly, circumcision being of the heart, by the Spirit, not the written code; that one's praise is not from people but from our Father. Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]