Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Romans 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Paul, a servant of Christ Jesus, called to be an apostle, set apart for the gospel of our Father, Pọl, odibo Kraịst Jisọs, onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi ya na onye o kewapụtara ka o zisaa oziọma ya.
2 the gospel he promised beforehand through his prophets in the holy Scriptures, Oziọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nʼoge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya nke e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ.
3 concerning his Son, who in his earthly life was descended from David, Oziọma a metụtara Ọkpara ya, onye bụ nwa Devid site nʼọmụmụ nke anụ ahụ.
4 and was declared to be the Son of our Father in power according to the Spirit of holiness by his resurrection from the dead—Jesus Christ our Lord. Onye esitere na Mmụọ nke ịdị nsọ họpụta ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼike nke mbilite nʼọnwụ, bụ Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị.
5 Through him we received grace and apostleship for the obedience of faith among all the nations, for his name's sake, Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara na ọrụ ị bụ onyeozi, ime ka ndị mba ọzọ nwee nrube isi nke okwukwe nʼetiti ha nʼihi aha ya.
6 and you also are among those called to belong to Jesus Christ. Tinyere unu onwe unu ndị ahụ a kpọrọ ka ha bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst.
7 To all in Rome, loved by our Father and called his holy people: Grace to you and peace from our Father and the Lord Jesus Christ. Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
8 First, I thank my Father through Jesus Christ for all of you, since your faith is reported worldwide. Na mbụ, ana m ekele Chineke ekele nʼihi unu niile, site nʼaha Jisọs Kraịst. Nʼihi na a na-ekwusa ihe banyere okwukwe unu nʼụwa niile.
9 For our Father is my witness, whom I serve with my spirit in the gospel of his Son, that I constantly remember you in my prayers, Chineke, onye m na-ejere ozi, nʼime mmụọ site na ikwusa oziọma nke Ọkpara ya, bụ onye akaebe na m na-echeta unu mgbe niile nʼekpere m.
10 asking that somehow by our Father's will I may now at last succeed in coming to you. Nʼekpere m oge niile, a na m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nʼike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu.
11 For I long to see you, to share a spiritual gift that strengthens you, Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe.
12 that is, that we may be mutually encouraged by each other's faith, both yours and mine. Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị.
13 I want you to know, brothers and sisters: I often planned to visit you, but was kept from it until now—to reap some harvest among you too, as among the rest of the nations. Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata na atụọla m atụmatụ ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe (ma tutu ruo ugbu a e gbochiri m ịbịa), ka m nwee ike nweta mkpụrụ nʼetiti unu, dịka m nwere nʼetiti ndị mba ọzọ.
14 I'm obligated to Greeks and non-Greeks, to wise and foolish. Nʼihi na abụ m onye ji ụgwọ nye ndị Griik na ndị mba ọzọ, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu.
15 So I am eager to preach the gospel to you also who are in Rome. Ya mere m ji dị njikere ikwusa oziọma nyekwa unu bụ ndị bi na Rom.
16 I'm not ashamed of the gospel—it is our Father's power for salvation to everyone who believes, to the Jew first, and also the Greek. Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik.
17 For in it our Father's righteousness is revealed, from faith to faith, as it is written: "The righteous will live by faith." Nʼihi na ọ bụ nʼoziọma ka e kpughere ezi omume Chineke, ezi omume nke na-esite nʼokwukwe ruo okwukwe. Dịka e siri dee ya, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”
18 For our Father's wrath is revealed from heaven against all human godlessness and injustice, people who suppress the truth by injustice. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe kpughe ọnụma Chineke megide mmehie na ajọ omume niile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nʼajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ.
19 What can be known about our Father is evident to them, for he has made it evident to them. Nʼihi na ndị a maara ihe ha kwesiri ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nʼihi na Chineke nʼonwe ya emeela ka o doo ha anya.
20 Since the world's creation, his invisible qualities—eternal power and divine nature—are clearly seen, understood from what he made. So they have no excuse. Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ.
21 Though they knew our Father, they didn't honor him as God or thank him—instead their thinking became empty, and their senseless hearts grew dark. Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.
22 Claiming to be wise, they became fools, Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu.
23 and exchanged our immortal Father's glory for images shaped like mortal man and birds and animals and reptiles. Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesiri inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ. Ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na nnụnụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nʼala.
24 So our Father gave them over to their hearts' desires, to impurity, dishonoring their bodies among themselves, Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha.
25 because they traded the truth about our Father for a lie, worshiping and serving the creation instead of the Creator, who is blessed forever. Amen. Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
26 Because of this, our Father gave them over to shameful desires. Their women exchanged natural relations for unnatural ones. Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi.
27 Likewise, men too abandoned natural relations with women, burning with lust for each other—men committing indecency with men, and receiving in themselves the penalty their error deserved. Ọzọkwa, kama ha na ndị inyom inwe mmekọrịta; ndị ikom ha họọrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta nke ha na ndị inyom kwesiri inwe. Nwoke na-edinakwuru nwoke ibe ya. Nʼụzọ dị otu a, ha natakwara ntaramahụhụ kwesiri ha nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.
28 Since they refused to keep our Father in their knowledge, he handed them over to an unfit mind, to do improper things. Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.
29 They were filled with all injustice, evil, greed, and malice; full of envy, murder, conflict, deceit, and spite; they are gossips, Ha jupụtara nʼajọ omume na mmehie niile, anya ukwu na aghụghọ. Ha jupụtakwara nʼekworo, na igbu mmadụ, na esemokwu, na uche gbagọrọ agbagọ na ịkpọ asị. Ha bụ ndị na-ekwu okwu azụ,
30 slanderers, haters of our Father, insolent, arrogant, boastful, inventors of evil, disobedient to their parents, na ndị nkwutọ na ndị kpọrọ Chineke asị, na ndị na-akparị mmadụ na ndị mpako na ndị na-anya isi. Ha na-atụpụta ụzọ ọhụrụ ime ihe ọjọọ, ha adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha.
31 foolish, faithless, heartless, ruthless. Ha bụkwa ndị na-enweghị nghọta, ndị na-enweghị okwukwe, ndị obi ọjọọ na ndị na-enweghị obi ebere.
32 Though they know our Father's righteous decree that those who do such things deserve death, they not only do them but applaud those who do them. Ha maa na Chineke nyere iwu dị ike na ndị na-ebi ndụ dị otu a kwesiri ọnwụ, ma ha gara nʼihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalịkwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]