Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 28 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Once we were brought safely through, we learned that the island was called Malta. Mgbe a pụtara nʼọnụ mmiri ahụ nʼudo, anyị chọpụtara na aha agwa etiti ahụ bụ Malta.
2 Local people showed us unusual kindness: they lit a fire and welcomed us all, since rain had started and it was cold. Ndị obodo ahụ gosiri anyị obiọma nʼụzọ pụrụ iche. Ha kwanyere anyị ọkụ ma nabatakwa anyị nʼihi na mmiri nọ na-ezo, oyi na-atụkwa.
3 When Paul gathered a bundle of sticks and put them on the fire, a viper came out from the heat and fastened onto his hand. Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya.
4 Seeing the creature hanging from his hand, the natives said to each other, "This man must be a murderer—though he escaped the sea, Justice won't let him live." Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.”
5 But he shook the creature off into the fire and suffered no harm. Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya.
6 They expected him to swell up or suddenly fall dead. But after watching a long time and seeing nothing wrong happen to him, they changed their minds, calling him a god. Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi.
7 Near that place were estates belonging to the island's chief official, named Publius, who welcomed us and hosted us kindly for three days. Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pobilios otu nwoke onyeisi na-achị agwa etiti ahụ. Ọ nabatara anyị nke ọma, lee anyị ọbịa ụbọchị atọ.
8 Publius's father lay sick with fever and dysentery. Paul went in, prayed, laid hands on him, and healed him. Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma.
9 After this, the rest of the sick on the island came and were healed. Mgbe nke a mechara, ndị niile nwere nrịa nrịa nʼagwa etiti ahụ bịakwara, a gwọkwara ha.
10 They paid us many honors, and when we sailed, loaded us with everything we needed. Ha wetaara anyị ọtụtụ ihe onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nʼije ahụ.
11 After three months we sailed in an Alexandrian ship that had wintered at the island, marked with the Twin Brothers. Anyị nọrọ ihe dịka ọnwa atọ nʼoge oyi, nʼagwa etiti ahụ tutu anyị anyalie ụgbọ. Ọ bụ ụgbọ ndị Alegzandria nke bu ihe a tụrụ atụ a na-akpọ ejima, bụ chi Kastọ na Polụkus.
12 We put in at Syracuse and stayed there three days. Anyị bịaruru obodo Sirakọs ebe anyị nọrọ ụbọchị atọ.
13 From there we sailed around and arrived at Rhegium. A day later a south wind rose, and on the second day we reached Puteoli. Site nʼebe ahụ, anyị gara gburugburu tutu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere, ikuku bidoro ife site na ndịda. Nʼụbọchị nke abụọ ya, anyị rutere Pọteọlị.
14 There we found brothers and sisters and were urged to stay with them seven days; so we came to Rome. Nʼebe a anyị chọpụtara ndị kwere ekwe ndị rịọrọ ka anyị nọnyere ha ụbọchị asaa. Site nʼebe a, anyị rutere Rom.
15 The brothers and sisters there heard about us and came to meet us as far as the Forum of Appius and Three Taverns. Seeing them, Paul thanked our Father and took courage. Mgbe ụmụnna anyị nọ nʼebe ahụ nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara zute anyị nʼụzọ Apiọs na nʼụlọ ndị Ije atọ. Mgbe Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke ma bụrụ onye a gbara ume.
16 When we entered Rome, Paul was allowed to stay by himself, with the soldier who guarded him. Mgbe anyị bịaruru Rom, e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dịka o si chọọ nʼebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche.
17 Three days later he gathered the Jewish leaders. When they assembled, he said to them, "Brothers, though I'd done nothing against our people or our ancestors' customs, I was handed over as a prisoner from Jerusalem into Roman hands. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom.
18 After examining me, they wanted to release me, since I had no charge deserving death. Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ.
19 When the Jews objected, I was forced to appeal to Caesar—though I had no charge to bring against my nation. Ma mgbe ndị Juu jụrụ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nʼuche megide ndị obodo m.
20 That's why I asked to see and speak with you—I wear this chain because of Israel's hope." Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.”
21 They said to him: "We received no letters from Judea about you, nor has any brother who came reported or said anything bad about you. Ha sịrị, “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị. Ọ dịghịkwa ụmụnna anyị ọbụla nke si ebe ahụ bịa nke kọrọ maọbụ kwuo okwu ọjọọ ọbụla banyere gị.
22 We'd like to hear what you think, since we know this sect is spoken against everywhere." Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịnụta ihe i chere, nʼihi na anyị maara na a na-ekwujọ otu a nʼebe niile.”
23 They set a day and came to his lodging in greater numbers. From morning to evening he explained, testifying about the kingdom of our Father and trying to persuade them about Jesus from the Law of Moses and the Prophets. Ha yiri agba mgbe ha na ya ga-ezukọta nʼụbọchị ọzọ. Ọtụtụ mmadụ karịrị bịara nʼụlọ ebe ọ na-anọ. Ọ gbara ama banyere alaeze Chineke site nʼakwụkwọ iwu Mosis na nke ndị amụma, ọ gbalịrị ime ka ha kwenye nʼihe banyere Jisọs. O bidoro izi ha ihe site nʼụtụtụ ruo anyasị.
24 Some were convinced by what he said, but others would not believe. Ụfọdụ ka e mere ka ha kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha.
25 Disagreeing among themselves, they left after Paul added one final word: "The Holy Spirit spoke rightly to your ancestors through Isaiah the prophet, saying, Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha,
26 "'Go to this people and say: You will indeed hear but never understand, and you will indeed see but never perceive. “ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu, “Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla, unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.”
27 For this people's heart has grown dull, and their ears are hard of hearing, and they have closed their eyes—otherwise they might see with their eyes, and hear with their ears, and understand with their heart, and turn, and I would heal them.' Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ; ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
28 So know: our Father's salvation was sent to the nations—they will listen." “Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.”
29 Not in this edition Mgbe o kwusiri nke a, ndị Juu ahụ lara na-arụrịta ụka nke ukwu nʼetiti onwe ha.
30 He stayed two whole years in his own rented place and welcomed all who came to him, O biri obi nke onwe ya afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ileta ya,
31 proclaiming our Father's kingdom and teaching about the Lord Jesus Christ, boldly and unhindered. o ji mkwuwa okwu na-ekwusa ihe banyere alaeze Chineke na-akụzikwa ihe banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọbụla gbalịrị igbochi ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]